Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 44

Rehab Ezobe Ndị Nledo

Rehab Ezobe Ndị Nledo

NDỊ ikom ndị a nọ ná nsogbu. Ha aghaghị ịgbapụ, ma ọ bụghị ya, a ga-egbu ha. Ha bụ ndị Izrel bịara nledo. Nwaanyị a nke na-enyere ha aka bụ Rehab. Rehab bi n’ebe a n’ụlọ dị ná mgbidi obodo Jeriko. Ka anyị chọpụta ihe mere ndị ikom ndị a ji nọrọ ná nsogbu.

Ụmụ Izrel ejikerewo ịgabiga Osimiri Jọdan iji baa n’ala Kenan. Tupu ha abaa, Jọshụa zipụrụ ndị nledo abụọ ahụ. Ọ sịrị ha: ‘Gaanụ lee ala ahụ na obodo Jeriko.’

Mgbe ndị nledo ahụ ruru Jeriko, ha jere n’ụlọ Rehab. Ma otu onye gwara eze Jeriko, sị: ‘Ndị ikom abụọ bụ́ ndị Izrel batara ebe a n’abalị a iledo ala anyị.’ Mgbe ọ nụrụ nke a, eze zigara ndị ikom ijekwuru Rehab, ha ji olu ike gwa ya, sị: ‘Kpọpụta ndị ikom ahụ nọ n’ụlọ gị!’ Ma Rehab zoro ha n’uko ụlọ ya. O wee sị ha: ‘E nwere ndị ikom bịara n’ụlọ m, ma amaghị m ebe ha si bịa. Ha lara mgbe chi na-eji, tupu e mechie ọnụ ụzọ ámá. Ọ bụrụ na unu emee ọsọ ọsọ, unu pụrụ ịnwụde ha!’ Ha wee malite ịchụ ha.

Mgbe ha pụwara, Rehab wee were ọsọ gbaga n’uko ụlọ ahụ. O wee sị ndị nledo ahụ: ‘Ama m na Jehova ga-enye unu ala nke a. Anyị nụrụ otú o si mee ka Osimiri Uhie takọọ mgbe unu na-ahapụ Ijipt, na otú unu si gbuo eze Saịhọn na eze Ọg. Egosiri m unu obiọma, n’ihi ya, kwenụ m nkwa na unu ga-emere m ebere. Zọpụtanụ nne m na nna m na ụmụnne m ndị ikom na ndị inyom.’

Ndị nledo ahụ kwere nkwa na ha ga-eme otú ahụ, ma Rehab aghaghị ime otu ihe. Ha sịrị ya: ‘Were eriri uhie nke a, kee ya na windo gị, gị na ndị gị niile nọkọtakwa n’ime ụlọ gị. Mgbe anyị dum bịaghachiri iweghara Jeriko, anyị ga-ahụ eriri a na windo gị, anyị agaghịkwa egbu mmadụ n’ụlọ gị.’ Mgbe ndị nledo ahụ laghachikwuuru Jọshụa, ha kọọrọ ya ihe niile merenụ.