Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 45

Ịgafe Osimiri Jọdan

Ịgafe Osimiri Jọdan

LEE ihe na-eme ebe a! Ụmụ Izrel na-agafe Osimiri Jọdan! Ma ebee ka mmiri ya gara? N’ihi oké mmiri ozuzo a na-enwe n’oge ahụ n’afọ, osimiri ahụ jupụtara na mmiri minit ole na ole gara aga. Ma ugbu a, mmiri niile ahụ atawo! Ụmụ Izrel na-agabiga n’ala akọrọ dị ka ha mere n’Osimiri Uhie! Ebee ka mmiri niile ahụ gara? Ka anyị hụ.

Mgbe oge ruru ka ụmụ Izrel gafee Osimiri Jọdan, Jehova mere ka Jọshụa gwa ụmụ Izrel, sị: ‘Ndị nchụàjà ga-ebu igbe ọgbụgba ndụ gaa n’ihu anyị. Mgbe ha ga-azọnye ụkwụ n’ime Osimiri Jọdan ahụ, mmiri ya niile ga-akwụsị ịsọ asọ.’

Ndị nchụàjà wee buru igbe ọgbụgba ndụ ahụ gaa n’ihu ha. Mgbe ha ruru na Jọdan, ndị nchụàjà bara n’ime mmiri ahụ. Ọ na-asọsi ike, dịkwa omimi. Ma ozugbo ụkwụ ha metụrụ mmiri ahụ, ọ kwụsịwara ịsọ asọ! Ọ bụ ọrụ ebube! Jehova gbochiri ebe mmiri ahụ si asọdata. Ọ dịghị anya, mmiri ya wee taa!

Ndị nchụàjà, bụ́ ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, banyere n’etiti osimiri ahụ nke tara ata. Ị̀ na-ahụ ha na foto a? Ka ha guzo n’ebe ahụ, ndị Izrel niile gafere Osimiri Jọdan n’ala akọrọ!

Mgbe mmadụ niile gafesịrị, Jehova mere ka Jọshụa gwa ndị ikom iri na abụọ ndị dị ike, sị: ‘Baanụ n’ime osimiri ebe ndị nchụàjà ahụ bu igbe ọgbụgba ndụ guzo. Butenụ nkume iri na abụọ, dokọọ ha n’ebe ahụ unu ga-ehi n’abalị. N’ọdịnihu, mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu ihe nkume ndị a bụ, unu ga-agwa ha na mmiri kwụsịrị ịsọ asọ mgbe igbe ọgbụgba ndụ Jehova gafere Osimiri Jọdan. Nkume ndị a ga-echetara unu ọrụ ebube a!’ Jọshụa tụkọtakwara nkume iri na abụọ n’ebe ahụ ndị nchụàjà guzoro n’ala osimiri ahụ.

N’ikpeazụ, Jọshụa gwara ndị nchụàjà ahụ bu igbe ọgbụgba ndụ, sị: ‘Sinụ n’ime Jọdan pụta.’ Ozugbo ha pụtara, osimiri ahụ malitere ịsọ asọ ọzọ.