Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 47

Otu Onye Ohi Nọ n’Izrel

Otu Onye Ohi Nọ n’Izrel

LEE ihe nwoke a na-eli n’ala n’ime ụlọ ntu ya! Uwe mwụda mara mma, na ọkpụrụkpụ ọlaedo na mkpụrụ ọlaọcha ụfọdụ. O wetara ha na Jeriko. Ma gịnị ka e kwesịrị ime ihe ndị dị n’ime Jeriko? Ì chetara?

E kwesịrị ibibi ha ebibi, e kwesịkwara iwega ọlaedo na ọlaọcha ndị ahụ n’ụlọ akụ̀ nke ụlọikwuu Jehova. Ma ndị a enupụworo Chineke isi. Ha ezuruwo ihe bụ́ nke Chineke. Aha nwoke ahụ bụ Ekan, ndị ahụ ha na ya nọkwa bụ ụfọdụ n’ime ndị ezinụlọ ya. Ka anyị hụ ihe mere.

Mgbe Ekan zuuru ihe ndị a, Jọshụa zigara ndị ikom ụfọdụ ibuso obodo E-aị agha. Ma e meriri ha n’agha ahụ. E gburu ụfọdụ ha egbu, ndị fọdụrụ n’ime ha wee gbalaga. O wutere Jọshụa nke ukwuu. O wee kpuo ihu ya n’ala kpekuo Jehova ekpere, sị: ‘Gịnị mere i ji kwe ka ihe a mee anyị?’

Jehova wee zaa ya, sị: ‘Bilie! Izrel emehiewo. Ha ewerewo ụfọdụ ihe ndị e kwesịrị ibibi ebibi ma ọ bụ ndị e kwesịrị iwega n’ụlọikwuu Jehova. Ha zuuru otu uwe mara mma, wee zoo ya. M gaghị agọzi unu ruo mgbe unu bibiri ya, bibiekwa onye weere ihe ndị a.’ Jehova sịrị na ya ga-egosi Jọshụa onye ajọ mmadụ ahụ bụ.

Jọshụa wee kpọkọta ndị Izrel niile, Jehova wee wepụta Ekan ajọ mmadụ ahụ. Ekan wee sị: ‘Emehiewo m. Ahụrụ m uwe mara mma na ọkpụrụkpụ ọlaedo na mkpụrụ ọlaọcha ụfọdụ. Ha gụsiri m agụụ ike, m wee were ha. Unu ga-ahụ ha n’ebe m liri ha n’ime ụlọ ntu m.’

Mgbe a chọtara ihe ndị a ma chịgara ha Jọshụa, ọ sịrị Ekan: ‘Gịnị mere i ji wetara anyị nsogbu? Ugbu a, Jehova ga-ewetara gị nsogbu!’ N’ihi ya, mmadụ niile wee were nkume tụgbuo Ekan na ezinụlọ ya. Nke a ọ́ dịghị egosi na anyị ekwesịghị iwere ihe ndị na-abụghị nke anyị mgbe ọ bụla?

N’ikpeazụ, ndị Izrel jere ibuso E-aị agha ọzọ. N’oge nke a, Jehova nyeere ha aka, ha wee merie n’agha ahụ.