Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 48

Ndị Gibiọn Bụ́ Ndị Maara Ihe

Ndị Gibiọn Bụ́ Ndị Maara Ihe

ỌTỤTỤ obodo ndị dị na Kenan na-ejikere ugbu a ibuso ụmụ Izrel agha. Ha chere na ha pụrụ imeri ha. Ma ndị bi n’obodo Gibiọn nke dị nso echeghị otú ahụ. Ha kweere na Chineke na-enyere ụmụ Izrel aka, ha achọghịkwa ịlụso Chineke ọgụ. N’ihi ya, ị̀ ma ihe ndị Gibiọn mere?

Ha kpebiri ime dị ka à ga-asị na ha bi n’ebe dị anya. Ụfọdụ ndị ikom ha wee yiri nkịrịka uwe na akpụkpọ ụkwụ dọkara adọka. Ha bokwasịrị ịnyịnya ibu ha akpa kara nká, werekwa achịcha ochie kpọrọ nkụ. Ha wee jekwuru Jọshụa, sị ya: ‘Anyị si n’ala dị ezigbo anya bịa, n’ihi na anyị nụrụ ihe banyere Chineke ukwu unu, bụ́ Jehova. Anyị nụrụ ihe niile o meere unu n’Ijipt. N’ihi ya, ndị isi anyị gwara anyị ka anyị were ihe oriri ụfọdụ maka ije anyị, ka anyị bịa sị unu: “Anyị bụ ndị ohu unu. Kwenụ anyị nkwa na unu agaghị ebuso anyị agha.” Unu ga-ahụ na uwe anyị akawo n’ihi njem tere aka anyị mere, nakwa na achịcha anyị emewo ochie, kpọọkwa nkụ.’

Jọshụa na ndị isi ndị ọzọ kweere ihe ndị Gibiọn kwuru. Ha wee kwe ha nkwa na ha agaghị ebuso ha agha. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ha matara na ndị Gibiọn bi ha nso n’ezie.

‘Gịnị mere unu ji gwa anyị na unu si n’ala dị anya bịa?’ ka Jọshụa jụrụ ha.

Ndị Gibiọn wee zaa, sị: ‘Anyị mere otú a n’ihi na a gwara anyị na Jehova Chineke unu ekwewo nkwa inye unu ala Kenan nke a niile. N’ihi ya, anyị tụrụ egwu na unu ga-egbu anyị.’ Ma ndị Izrel mere ihe ha kwere ná nkwa, ha egbughịkwa ndị Gibiọn. Kama nke ahụ, ha mere ka ha bụrụ ndị ohu ha.

Iwe were eze Jeruselem n’ihi na ndị Gibiọn na Izrel emewo udo. O wee sị ndị eze anọ ọzọ: ‘Bịanụ nyere m aka ka anyị busoo Gibiọn agha.’ Ndị eze ise ahụ mekwara otú ahụ. Amamihe ọ̀ dị n’udo a ndị Gibiọn so ndị Izrel mee, bụ́ nke mere ka ndị eze ndị a bịa ibuso ha agha? Anyị ga-ahụ.