Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 50

Ndị Inyom Abụọ Ndị Nwere Obi Ike

Ndị Inyom Abụọ Ndị Nwere Obi Ike

MGBE ọ bụla ụmụ Izrel dabara ná nsogbu, ha na-akpọku Jehova. Jehova na-aza ha site n’inye ha ndị ndú nwere obi ike inyere ha aka. Bible na-akpọ ndị ndú ndị a ndị ikpe. Jọshụa bụ onyeikpe mbụ Izrel nwere, ma aha ụfọdụ ndị ikpe ndị sochiri ya bụ Ọtniel, Ihud, na Shamga. Mmadụ abụọ n’ime ndị nyeere Izrel aka bụ ndị inyom a na-akpọ Debọra na Jel.

Debọra bụ onye amụma nwaanyị. Jehova na-agwa ya okwu banyere ọdịnihu, e mesịa ya agwa ndị Izrel ihe Jehova kwuru. Debọra bụkwa onyeikpe. Ọ na-anọdụ ala n’okpuru otu nkwụ nke dị n’otu obodo nta dị n’ugwu, ndị mmadụ na-abịakwutekwa ya ka o nyere ha aka ná nsogbu ha.

N’oge ahụ, Jebin bụ eze ndị Kenan. O nwere narị ụgbọ ịnyịnya itoolu. Ndị agha ya dị nnọọ ike nke na ha manyere ọtụtụ ndị Izrel ịbụ ndị ohu Jebin. Aha onyeisi ndị agha nke Eze Jebin bụ Sisera.

Otu ụbọchị, Debọra ziri ozi ka a kpọọ Onyeikpe bụ́ Berak, ma gwa ya, sị: ‘Jehova sịrị: “Kpọrọ puku ndị ikom iri jee n’Ugwu Tebọ. N’ebe ahụ ka m ga-arara Sisera nye n’aka gị. M ga-emekwa ka i merie ya na ụsụụ ndị agha ya.”’

Berak wee sị Debọra: ‘M ga-eje ma ọ bụrụ na ị ga-eso m jee.’ Debọra wee soro ya jee, ma ọ sịrị Berak: ‘Ị gaghị enwe otuto maka mmeri ahụ, n’ihi na Jehova ga-arara Sisera nye n’aka nwaanyị.’ Nke ahụ bụkwa ihe mere.

Berak wee si n’Ugwu Tebọ rịda izute ndị agha Sisera. Na mberede, Jehova mere ka e nwee idei mmiri nke rikpuru ọtụtụ n’ime ndị agha ahụ bụ́ ndị iro. Ma Sisera rịgooro n’ụgbọ ịnyịnya ya wee gbaa ọsọ.

Mgbe ọ gbatetụrụ aka, Sisera ruru n’ụlọ ntu nke Jel. Jel wee kpọbata ya nye ya mmiri ara ehi. Nke a mere ka ụra tụwa ya, n’oge na-adịghịkwa anya, oké ụra buuru ya. Jel wee were ntu nke ụlọ ntu ahụ kpọnye ajọ nwoke ahụ n’isi. E mesịa, mgbe Berak bịara, o wee gosi ya ozu Sisera! Ị hụzielanụ otú ihe Debọra kwuru si mezuo.

N’ikpeazụ, e gbukwara Eze Jebin, ndị Izrel wee nwee udo ọzọ ruo nwa oge.