Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 51

Rut na Neomi

Rut na Neomi

N’IME Bible, ị ga-ahụ akwụkwọ a na-akpọ Rut. Ọ bụ akụkọ banyere otu ezinụlọ nke biri n’oge ụmụ Izrel nwere ndị ikpe. Rut bụ nwa agbọghọ si n’ala Moab; o sighị ná mba Izrel nke Chineke. Ma mgbe Rut mụtara banyere ezi Chineke ahụ bụ́ Jehova, ọ bịara hụ Chineke n’anya nke ukwuu. Neomi bụ agadi nwaanyị nke nyeere Rut aka ịmụta banyere Jehova.

Neomi bụ onye Izrel. Ya na di ya na ụmụ ha ndị ikom abụọ kwagara n’ala Moab n’oge ihe oriri kọrọ n’Izrel. Ma otu ụbọchị, di Neomi nwụrụ. E mesịa, ụmụ Neomi lụrụ ụmụ agbọghọ abụọ bụ́ ndị Moab aha ha bụ Rut na Ọpa. Ma mgbe ihe dị ka afọ iri gasịrị, ụmụ ndị ikom abụọ Neomi nwụrụ. Nke a wutere Neomi na ụmụ agbọghọ abụọ ahụ nke ukwuu! Gịnị ka Neomi ga-eme ugbu a?

Otu ụbọchị, Neomi kpebiri ime njem dị anya iji lakwuru ndị ya. Rut na Ọpa chọrọ ibinyere ya, ha wee sorokwa ya na-eje. Mgbe ha jeworo ije nke nta n’ụzọ, Neomi tụgharịrị wee sị ụmụ agbọghọ ahụ: ‘Lakwurunụ nne unu.’

Neomi wee sutu ha ọnụ ma sị ha laa nke ọma. Mgbe o mere otú a, ha malitere ịkwa ákwá, n’ihi na ha hụrụ Neomi n’anya nke ukwuu. Ha sịrị ya: ‘Ee e! Anyị ga-eso gị lakwuru ndị gị.’ Ma Neomi sịrị ha: ‘Laghachinụ, ụmụ m. Ụlọ unu ga-adịrị unu mma karị.’ Ọpa wee malite ịla. Ma Rut ekweghị ala.

Neomi wee lee ya anya, sị: ‘Ọpa alawala. Soro ya lawa!’ Rut wee zaa ya, sị: ‘Anwala ime ka m hapụ gị! Ka m soro gị jee. Ebe ị na-eje ka m ga-eje, ebe ị ga-ebi ka m ga-ebi. Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m. Ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ, ebe ahụkwa ka a ga-eli m.’ Mgbe Rut kwuru nke a, Neomi anwaghị ọzọ ime ka ọ laa.

N’ikpeazụ, ndị inyom abụọ ahụ ruru Izrel. N’ebe ahụ ka ha biiri. Rut malitere ozugbo ịrụ ọrụ n’ubi, n’ihi na ọ bụ oge iwe ọka bali. Otu nwoke a na-akpọ Boaz kwere ka ọ na-achịkọtara ya ọka n’ubi. Ị̀ ma onye bụ nne Boaz? Ọ bụ Rehab onye obodo Jeriko ahụ.

Otu ụbọchị, Boaz sịrị Rut: ‘Anụwo m banyere gị, na otú i si nwee obiọma n’ebe Neomi nọ. Amatara m ụzọ i si hapụ nne na nna gị na ala gị, na otú i si bịa biri n’etiti ndị ị na-amaghị mbụ. Ka Jehova meere gị ihe ọma!’

Rut wee sị ya: ‘I nwere obiọma n’ahụ́ m, onyenwe m. I mewo ka afọ ju m site n’okwu ọma ndị a ị na-agwa m.’ Boaz hụrụ Rut n’anya nke ukwuu, oge na-adịghịkwa anya, o wee lụrụ ya ịbụ nwunye ya. Nke a mere ka Neomi nwee nnọọ obi ụtọ! Ma obi tọrọ Neomi ụtọ karị mgbe Rut na Boaz mụtara nwa mbụ ha bụ́ Obed. E mesịa, Obed ghọrọ nna nna Devid, onye anyị ga-amụ ọtụtụ ihe banyere ya ma e mesịa.

Akwụkwọ Bible bụ́ Rut.