Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 54

Nwoke Nke Kachasị Ike

Nwoke Nke Kachasị Ike

Ị̀ MA aha nwoke kachasị ike nke dịtụworo ndụ? Ọ bụ onyeikpe a na-akpọ Samsịn. Ọ bụ Jehova nyere Samsịn ike ya. Ọbụna tupu a mụọ Samsịn, Jehova gwara nne ya, sị: ‘N’oge na-adịghị anya, ị ga-amụ nwa nwoke. Ọ ga-ebute ụzọ n’ịzọpụta Izrel n’aka ndị Filistia.’

Ndị Filistia bụ ndị ọjọọ bi n’ala Kenan. Ha nwere ọtụtụ ndị ikom na-ebu agha, ha na-emekpakwa ụmụ Izrel ahụ́. Otu oge, mgbe Samsịn na-eje ebe ndị Filistia bi, otu nnukwu ọdụm gbọọrọ ụja na-abịa izute ya. Samsịn jiri aka nkịtị dọgbuo ya. O gbukwara ọtụtụ puku ndị Filistia ọjọọ.

N’ikpeazụ, Samsịn bịara hụ otu nwaanyị a na-akpọ Delaịla n’anya. Ndị ndú ndị Filistia kwere nkwa na onye ọ bụla n’ime ha ga-enye Delaịla otu puku na otu narị ego ọlaọcha ma ọ bụrụ na ọ gwa ha ihe mere Samsịn ji dị ike. Delaịla chọrọ inweta ego ahụ niile. Ọ bụghị ezigbo enyi Samsịn ma ọ bụ nke ndị Chineke. O wee na-ajụ Samsịn ihe mere o ji dị ike.

N’ikpeazụ, Delaịla nwetara Samsin, o wee gwa ya ebe ike ya dị. ‘A kpụtụbeghị ntutu isi m akpụ,’ ka ọ gwara ya. ‘Site n’oge a mụrụ m, Chineke họpụtara m ịbụ ohu ya pụrụ iche nke a na-akpọ Naziraịt. Ọ bụrụ na a kpụọ ntutu isi m, ike m ga-agwụ.’

Oge Delaịla matara nke a, o mere ka Samsịn rahụ ụra n’apata ụkwụ ya. O wee kpọọ otu nwoke ịbịa kpụọ ya isi. Oge Samsịn tetara n’ụra, o nwekwaghị ike. Ndị Filistia bịaziri jide ya. Ha ghụpụrụ anya ya abụọ, mee ya ohu ha.

Otu ụbọchị, ndị Filistia nwere nnọkọ ukwu iji fee chi ha bụ́ Degọn, ha wee kpọpụta Samsịn n’ụlọ mkpọrọ iji ya mee ihe ọchị. Ugbu a, agịrị isi ya etolitetụwo. Samsịn wee sị nwata nwoke nke na-edu ya: ‘Mee ka m metụ ogidi ndị ji ụlọ a aka.’ Samsịn wee rịọ Jehova ka o nye ya ike, o wee jide ogidi abụọ ahụ aka. O tie mkpu, sị: ‘Ka m soro ndị Filistia nke a nwụọ.’ Ndị bịara nnọkọ ahụ dị puku ndị Filistia atọ, ma mgbe Samsịn hulatara onwe ya n’ogidi abụọ ahụ, ụlọ ahụ dara wee kụgbuo ndị ọjọọ niile ahụ.