NKEBI NKE 4
Site n’Eze Mbụ nke Izrel Ruo ná Ndọrọ n’Agha Laa Babịlọn
Sọl ghọrọ eze mbụ nke Izrel. Ma Jehova mesịrị jụ ya wee họrọ Devid ịnọchi ya dị ka eze. Anyị ga-achọpụta ọtụtụ ihe banyere Devid. Mgbe ọ bụ nwa okorobịa, ọ lụsoro Golayat ọgụ. E mesịa, o si n’ụlọ Eze Sọl na-emere ya anyaụfụ gbapụ. Abigel bụ́ nwaanyị mara mma gbochikwara ya ime ihe nzuzu.
Anyị ga-amụkwa ọtụtụ ihe banyere nwa Devid bụ́ Solomọn, bụ́ onye nọchiri Devid dị ka eze Izrel. Ndị eze atọ mbụ nke Izrel chịrị afọ iri anọ n’otu n’otu. Mgbe Solomọn nwụsịrị, e kewara Izrel gaa n’alaeze abụọ, alaeze nke ebe ugwu na nke ebe ndịda.
Alaeze ebo iri nke dị n’ebe ugwu dịgidere ruo narị afọ abụọ na iri afọ ise na asaa, tupu ndị Asiria ebibie ya. Otu narị afọ na iri afọ atọ na atọ ka nke ahụ gasịkwara, e bibiri alaeze ebo abụọ ahụ dị n’ebe ndịda. N’oge ahụ, a dọọrọ ndị Izrel n’agha laa Babilọn. Ya mere, NKEBI NKE 4 kọrọ ihe ndị mere eme nke were narị afọ ise na afọ iri, ọ bụkwa n’oge ahụ ka ọtụtụ ihe ndị na-akpali akpali mere.
NÁ NKEBI A
AKỤKỌ NKE 56
Sọl—Eze Mbụ nke Izrel
Ná mbido Chineke họpụtara Sọl, ma mechaa jụ ya, olee ihe dị mkpa anyị na-amụta n’ihe mere Sọl.
AKỤKỌ NKE 58
Devid na Golayat
Ọ bụghị naanị katapọọtụ ka Devid ji lụso Golayat ọgụ, o nwere ihe ọzọ ka ike o ji bịa.
AKỤKỌ NKE 59
Ihe Mere Devid Ji Gbaa Ọsọ
Sọl nweburu nnọọ mmasị n’ebe Devid nọ, gịnị meziri o ji nwewara Devid anyaụfụ ma chọọ igbu ya?
AKỤKỌ NKE 60
Abigel na Devid
Abigel kwuru na di ya bụ nwoke na-abaghị n’ihe nke na-eme ihe nzuzu, ma ihe a o kwuru mere ka a ghara igbu di ya mgbe ahụ.
AKỤKỌ NKE 61
E Chie Devid Eze
Devid si n’ihe ndị o mere na ihe ndị ọ na-ekweghị eme gosi na ya ruru eru ịbụ eze Izrel.
AKỤKỌ NKE 62
Nsogbu Adị n’Ụlọ Devid
Devid si n’otu mmehie o mere butere ya na ndị ezinụlọ ya nsogbu ruo ọtụtụ afọ.
AKỤKỌ NKE 64
Solomọn Ewuo Ụlọ Nsọ
N’agbanyeghị na Solomọn maara ihe, a rabara ya ime ihe nzuzu na ihe na-adịghị mma.
AKỤKỌ NKE 65
E Kewaa Alaeze Ahụ
Ozugbo Jeroboam bidoro ịchị, ya emee ka ndị Izrel bido inupụ isi n’iwu Chineke.
AKỤKỌ NKE 67
Jehoshafat Atụkwasị Jehova Obi
Gịnị mere ndị agha ga-eji gawa agha ya abụrụ ndị na-abụ abụ na-ejighị ngwá ọgụ ga-ebute ụzọ?
AKỤKỌ NKE 68
Ụmụntakịrị Nwoke Abụọ Ndị Dịghachiri Ndụ
È nwere ike ime ka onye nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ? O nweela mgbe o mere!
AKỤKỌ NKE 69
Otu Nwa Agbọghọ Nta Enyere Otu Dike Aka
Ọ katara obi kwuo okwu, o mekwara ka Chineke rụọ ọrụ ebube.
AKỤKỌ NKE 70
Jona na Azụ̀ Ukwu Ahụ
Jona mụtara na ọ dị ezigbo mkpa ka mmadụ na-eme ihe Jehova gwara ya mee.
AKỤKỌ NKE 71
Chineke Ekwe Nkwa Iweta Paradaịs
Paradaịs mbụ dị naanị n’otu ebe n’ụwa; nke ugbu a ga-ezu ụwa niile.
AKỤKỌ NKE 72
Chineke Enyere Eze Hezekaya Aka
N’otu abalị, otu mmụọ ozi gburu ndị agha Asiria dị otu narị puku na puku iri asatọ na ise.
AKỤKỌ NKE 73
Eze Ọma Ikpeazụ Chịrị Izrel
Josaya bidoro mgbe ọ ka dị obere mewe ihe gosiri na o nwere obi ike.
AKỤKỌ NKE 74
Nwoke nke Na-atụghị Egwu
Jeremaya chere na ya etorubeghị ịbụ onye amụma, ma Chineke ma na ọ ga-emeli ya.
AKỤKỌ NKE 75
Ụmụ Okorobịa Anọ Ndị Nọ na Babilọn
Ha mere ihe dị Chineke mma n’agbanyeghị na ha na ndị ezinụlọ ha anọghị.
AKỤKỌ NKE 76
E Bibie Jeruselem
Gịnị mere Chineke ji kwe ka ndị Babilọn, bụ́ ndị iro ndị Izrel, bibie Jeruselem?