Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 57

Chineke Ahọrọ Devid

Chineke Ahọrọ Devid

Ị̀ HỤRỤ ihe mere ebe a? Nwa okorobịa a napụtara nwa atụrụ a n’ọnụ anụ ọhịa bea. Anụ ọhịa bea nke a bịara buru nwa atụrụ ahụ, na-achọ iri ya. Ma nwa okorobịa a chụwara ya, dọpụtakwa nwa atụrụ ahụ n’ọnụ bea ahụ. Ma mgbe anụ ọhịa bea ahụ biliri, nwa okorobịa ahụ buuru ya tigbuo! N’oge ọzọ, ọ dọpụtara otu atụrụ n’ọnụ ọdụm. Obi kara nwa okorobịa a, ọ̀ bụ na i cheghị otú ahụ? Ị̀ ma onye ọ bụ?

Ọ bụ Devid. O bi n’obodo Betlehem. Nna nna ya bụ Obed, nwa Rut na Boaz. Ì chetara ha? Ma nna Devid bụ Jesi. Devid na-azụ atụrụ nna ya. A mụrụ Devid afọ iri mgbe Jehova họpụtasịrị Sọl ịbụ eze.

Oge ruru mgbe Jehova gwara Samuel, sị: ‘Were mmanụ pụrụ iche jee n’ụlọ Jesi onye bi na Betlehem. Ahọpụtawo m otu n’ime ụmụ ya ndị nwoke ịbụ eze.’ Mgbe Samuel hụrụ Elayab nwa Jesi nke kasị okenye, o kwuru n’obi ya, sị: ‘Onye a ga-abụrịrị onye nke Jehova họọrọ.’ Ma Jehova sịrị ya: ‘Elela ogologo na ịma mma ya anya. A họpụtaghị m ya ịbụ eze.’

Jesi wee kpọtara Samuel nwa ya bụ́ Abinadab. Samuel wee sị: ‘Jehova ahọrọghịkwa onye nke a.’ Jesi kpọtakwaara Samuel nwa ya bụ́ Shama. Samuel wee sị: ‘Ee e, Jehova ahọrọghịkwa ya.’ Jesi wee kpọpụtagidere ya ụmụ ya ndị ikom ruo na nke asaa, ma Jehova ahọrọghị nke ọ bụla n’ime ha. Samuel wee jụọ ya, sị: ‘Ụmụ nwoke gị niile hà agwụla?’

Jesi wee sị ya: ‘Ọ fọdụrụ nke kasị nta. Ma o jere n’ebe ọ na-azụ atụrụ.’ Mgbe a kpọtara Devid, Samuel hụrụ na ọ bụ nwa okorobịa mara mma. Jehova wee sị: ‘Ọ bụ onye nke a. Wụsa ya mmanụ n’isi.’ Otú ahụkwa ka Samuel mere. Oge ga-eru mgbe Devid ga-abụ eze Izrel.