Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 59

Ihe Mere Devid Ji Gbaa Ọsọ

Ihe Mere Devid Ji Gbaa Ọsọ

MGBE Devid gbusịrị Golayat, Abna onyeisi agha Izrel duuru ya jekwuru Sọl. Sọl nwere mmasị n’ebe Devid nọ. O wee mee ya onyeisi agha ya, wee kpọrọ ya ka o biri n’ụlọ eze.

E mesịa, mgbe ndị agha Sọl na-alọta ka ha busosịrị ndị Filistia agha, ụmụ nwaanyị bụrụ abụ, sị: ‘Sọl egbuwo ọtụtụ puku, ma Devid gburu ọtụtụ iri puku.’ Nke a mere ka Sọl mewere Devid anyaụfụ n’ihi na e nyere Devid otuto karịa ya. Ma Jonatan nwa Sọl adịghị emere Devid anyaụfụ. Ọ hụrụ Devid n’anya nke ukwuu, otú ahụ ka Devid hụkwara Jonatan. Ha abụọ kwerịtara ibe ha nkwa ịbụ ndị enyi mgbe niile.

Devid maara akpọ ụbọ akwara nke ọma, olu ụtọ ọ na-akpọ na-amasịkwa Sọl. Otu ụbọchị, anyaụfụ Sọl kpaliri ya ime ihe dị egwu. Mgbe Devid na-akpọ ụbọ ya, Sọl tụrụ ube ya, na-asị: ‘M ga-atụgide Devid ná mgbidi!’ Devid wee zee ya, ube ahụ atụtaghịkwa ya. Mgbe e mesịrị, Devid zere ube ọzọ Sọl tụrụ ya. Nke ahụ mekwara ka Devid mata na ya aghaghị ịkpachapụ anya.

Ì chetara nkwa ahụ Sọl kwere? O kwuru na ya ga-akpọnye nwoke ga-egbu Golayat ada ya ka ọ lụwa. N’ikpeazụ, Sọl gwara Devid ka o duru ada ya Maịkal, ma tupu ya emee nke ahụ, ọ ghaghị ibu ụzọ gbuo otu narị ndị iro bụ́ ndị Filistia. Chee echiche banyere nke ahụ! Sọl chere n’ezie na ndị Filistia ga-egbu Devid. Ma ha egbughị ya, Sọl wee kpọnye Devid ada ya ka ọ bụrụ nwunye ya.

Otu ụbọchị, Sọl gwara Jonatan nakwa ndị ohu ya niile na ya chọrọ igbu Devid. Ma Jonatan sịrị nna ya: ‘Emerụla Devid ahụ́. Ọ dịbeghị ihe ọjọọ ọ bụla o mere gị. Kama o nyeworo gị aka nke ukwuu. O tinyere ndụ ya n’ihe ize ndụ mgbe o gburu Golayat, obi tọkwara gị ụtọ mgbe ị hụrụ ya.’

Sọl gere nwa ya ntị wee kwe nkwa na ya agaghị emerụ Devid ahụ́. E dulatara Devid, o wee na-ejere Sọl ozi ọzọ n’ụlọ ya dị ka ọ na-eme ná mbụ. Ma otu ụbọchị, mgbe Devid na-akpọ ụbọ, Sọl tụrụ ube ya ọzọ n’ebe Devid nọ. Devid wee zee, ube ahụ wee magide ná mgbidi. Nke a bụ nke ugboro atọ ya! Devid wee mara ugbu a na ya aghaghị ịgba ọsọ!

N’abalị ahụ, Devid lara n’ụlọ ya. Ma Sọl zipụrụ ndị ikom igbu ya. Maịkal matara ihe nna ya chọrọ ime. O wee sị di ya: ‘Ma ị gbapụghị n’abalị a, ị ga-abụ onye nwụrụ anwụ echi.’ Maịkal nyeere Devid aka n’abalị ahụ isi na windo gbapụ. Ruo ihe dị ka afọ asaa, Devid nọ na-ezogharị n’ebe niile, ka Sọl ghara ịchọta ya.