Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 62

Nsogbu Adị n’Ụlọ Devid

Nsogbu Adị n’Ụlọ Devid

MGBE Devid malitere ịchị n’ime Jeruselem, Jehova mere ka ndị agha ya merie ndị iro ha ọtụtụ ugboro. O kwewo nkwa inye ndị Izrel ala Kenan. Ma ugbu a, site n’enyemaka Jehova, ala niile ahụ o kwere ha ná nkwa emesịala ghọọ nke ha.

Devid bụ ezigbo onye ọchịchị. Ọ hụrụ Jehova n’anya. Otu n’ime ihe ndị o mere mgbe ọ dọọrọ Jeruselem n’agha bụ ibubata igbe ọgbụgba ndụ Jehova n’ebe ahụ. O wee chọọ iwu ụlọ nsọ ebe a ga-edebe ya.

Ka oge na-aga, Devid mere otu mmehie dị oké njọ. Devid maara na o zighị ezi iwere ihe bụ́ nke onye ọzọ. Mgbe ọ nọ n’elu obí ya n’otu uhuruchi, o ledara anya n’ala ma hụ otu nwaanyị mara ezigbo mma. Aha ya bụ Bat-shiba, di ya bụ Yuraya, bụ́ otu n’ime ndị agha Devid.

Devid bịara nwee mmasị gabigara ókè n’ebe Bat-shiba nọ nke na o mere ka e dute ya n’obí ya. Di ya jere agha. Devid wee soro ya nwee mmekọahụ. E mesịa, Bat-shiba chọpụtara na ya atụrụwo ime. Devid nwere oké nchegbu, o wee zie Joab onyeisi agha ya ka o debe Yuraya n’ihu agha ebe a ga-egbu ya. Mgbe Yuraya nwụrụ, Devid wee kpọrọ Bat-shiba lụwa.

Jehova wesara nnọọ Devid iwe. O wee ziga ohu ya bụ́ Netan ka ọ kọọrọ ya banyere mmehie ya. Ị pụrụ ịhụ Netan ebe a ka ọ na-agwa Devid okwu. Ihe Devid mere wutere Devid nke ukwuu, n’ihi ya, Jehova egbughị ya. Kama Jehova gwara ya, sị: ‘N’ihi ihe ọjọọ ndị a i mere, ị ga-enwe ọtụtụ nsogbu n’ezinụlọ gị.’ Devid nwekwara nnukwu nsogbu n’ezie!

Nke mbụ, nwa Bat-shiba nwụrụ. E mesịa, Amnọn diọkpara Devid dinara nwanne ya nwaanyị n’ike, mgbe ha nọ naanị ha. Absalọm nwa Devid were iwe wee tigbuo Amnọn. E mesịa, Absalọm bịara mee ka ọtụtụ ndị nwee mmasị n’ebe ọ nọ, o wee mee onwe ya eze. N’ikpeazụ, Devid meriri Absalọm n’agha, e wee gbuo Absalọm. N’ezie, Devid nwere ọtụtụ nsogbu.

N’oge a niile, Bat-shiba mụrụ nwa a na-akpọ Solomọn. Mgbe Devid kara nká wee rịa ọrịa, Adọnaịja nwa ya nwara ime onwe ya eze. Devid wee mee ka Zedọk onyeisi nchụàjà wụsa mmanụ n’isi Solomọn, igosi na ọ ga-abụ eze. Ọ dịghị anya, Devid wee nwụọ mgbe ọ gbara afọ iri asaa. Ọ chịrị afọ iri anọ, Solomọn wee bụrụzie eze Izrel.