Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 64

Solomọn Ewuo Ụlọ Nsọ

Solomọn Ewuo Ụlọ Nsọ

TUPU Devid anwụọ, o nyere Solomọn ụkpụrụ Chineke tụrụ maka iwu ụlọ nsọ Jehova. N’ime afọ nke anọ nke ọchịchị ya, Solomọn malitere iwu ụlọ nsọ ahụ, o wekwara afọ asaa na ọkara iji wusịa ya. Ọtụtụ puku mmadụ rụrụ ọrụ n’iwu ụlọ nsọ ahụ, e mefukwara ego hiri nne n’iwu ya. Ọ bụ n’ihi na e ji ọtụtụ ọlaedo na ọlaọcha wuo ya.

Ụlọ nsọ ahụ nwere ime ụlọ ukwu abụọ, dị ka ụlọikwuu ahụ nwere. Ma ime ụlọ ndị a karịrị ndị nke ụlọikwuu ahụ okpukpu abụọ. Solomọn mere ka e debe igbe ọgbụgba ndụ ahụ n’otu n’ime ụlọ ndị dị n’ụlọ nsọ ahụ, werekwa ihe ndị ọzọ e debere n’ime ụlọikwuu ahụ debe n’ime ụlọ nke ọzọ.

Mgbe e wusịrị ụlọ ahụ, e mere oké ememe. Solomọn gburu ikpere n’ihu ụlọ nsọ ahụ wee kpee ekpere, dị ka ị na-ahụ na foto a. Ọ gwara Jehova, sị: ‘Eluigwe niile agaghịdị aba gị ka ọ fọdụzie ụlọ nsọ a? Ma biko, Chineke m, na-ege ndị gị ntị mgbe ha chere ihu n’ebe a na-ekpe ekpere.’

Mgbe Solomọn kpesịrị ekpere, ọkụ si n’eluigwe bịa. O repịara anụmanụ niile ahụ e ji chụọ àjà. Ìhè nke sitere n’ebe Jehova nọ wee jupụta n’ụlọ ahụ. Nke a na-egosi na Jehova na-ege ntị, nakwa na ụlọ ahụ na ekpere Solomọn dị ya mma. Ụlọ nsọ ahụ ghọziri ebe ndị Izrel na-abịa efe ofufe kama ịbụ ụlọikwuu ahụ.

Solomọn ji amamihe chịa ruo ogologo oge, obi dịkwa ụmụ Izrel ụtọ. Ma Solomọn lụrụ ọtụtụ ndị inyom ala ọzọ ndị na-adịghị efe Jehova. Ị̀ na-ahụ otu n’ime ha ka ọ na-efe arụsị ahụ? N’ikpeazụ, ndị inyom Solomọn dubara ya n’ife chi ọzọ. Ị̀ ma ihe mere mgbe Solomọn mere nke a? O mesoghịzi ndị Izrel ihe n’obiọma. O mesoro ha ihe n’obi ọjọọ, ha adịghịzikwa enwe obi ụtọ.

Nke a mere ka Jehova wesa Solomọn iwe, o wee sị ya: ‘M ga-anapụ gị alaeze gị nye nwoke ọzọ. M gaghị eme nke a n’oge ndụ gị, kama n’oge ọchịchị nke nwa gị. Ma m gaghị ewepụ ndị niile nọ n’alaeze nwa gị.’ Ka anyị hụ ka nke a si mee.