Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 65

E Kewaa Alaeze Ahụ

E Kewaa Alaeze Ahụ

Ị̀ MA ihe mere nwoke a ji na-adọrisi uwe ya? Jehova gwara ya mee otú ahụ. Nwoke a bụ Ahaịja onye amụma Chineke. Ị̀ ma onye bụ́ onye amụma? Ọ bụ onye Chineke na-agwa ihe ga-eme mgbe ihe ahụ na-emebeghị.

Ahaịja na-agwa Jeroboam okwu n’ebe a. Jeroboam bụ onye Solomọn mere onye nlekọta nke ọrụ ihe owuwu ya. Mgbe Ahaịja zutere Jeroboam n’ụzọ ebe a, o mere ihe dị ịtụnanya. O yipụrụ uwe ọhụrụ o yi, wee dọwaa ya iberibe iri na abụọ. O wee sị Jeroboam: ‘Chịrị iberibe iri.’ Ị̀ ma ihe mere Ahaịja ji nye Jeroboam iberibe iri?

Ahaịja kwuru na Jehova ga-anapụ Solomọn alaeze. Ọ sịrị na Jehova ga-enye Jeroboam ebo iri. Nke a pụtara na ọ bụ naanị ebo abụọ ga-afọdụrụ Rehoboam nwa Solomọn ịchị.

Mgbe Solomọn nụrụ ihe Ahaịja gwara Jeroboam, o were iwe. Ọ nwara igbu Jeroboam. Ma Jeroboam gbagara Ijipt. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, Solomọn wee nwụọ. Solomọn chịrị afọ iri anọ, ma ugbu a, e chiri Rehoboam nwa ya eze. Jeroboam nọ n’Ijipt nụ na Solomọn anwụwo, o wee laghachi Izrel.

Rehoboam abụghị ezigbo eze. O ji obi ọjọọ mesoo ụmụ Izrel ihe karịa nna ya Solomọn. Jeroboam na ndị okenye ụfọdụ jekwuuru Eze Rehoboam ma rịọ ya ka ọ na-emeso ha nke ọma. Ma Rehoboam egeghị ntị. N’ezie, o mesoro ha n’ụzọ obi ọjọọ karịa ka o mesoro ha na mbụ. Ụmụ Izrel wee mee Jeroboam eze ebo iri, ma ebo abụọ nke Benjamin na Juda weere Rehoboam dị ka eze ha.

Jeroboam achọghị ka ndị ya jee Jeruselem ife Jehova n’ụlọ nsọ ahụ. O wee mee ụmụ ehi ọlaedo abụọ ma gwa ndị alaeze ebo iri ahụ ka ha na-efe ha. Ọ dịghị anya, mmebi iwu na ime ihe ike ejupụta n’ala ahụ.

Nsogbu dapụtakwara n’alaeze ebo abụọ ahụ. Ihe na-erughị afọ ise ka Rehoboam ghọsịrị eze, eze Ijipt jere busoo Jeruselem agha. O wepụrụ ọtụtụ akụ̀ n’ụlọ nsọ Jehova. N’ihi ya, ọ bụ naanị nwa oge ka ụlọ nsọ ahụ dị otú ọ dị mgbe e wusịrị ya.