Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akụkọ nke 66

Jezibel​—⁠Ajọ Eze Nwaanyị

Jezibel​—⁠Ajọ Eze Nwaanyị

MGBE Eze Jeroboam nwụrụ, eze ọ bụla nke chịrị alaeze ebe ugwu nke ebo iri Izrel dị njọ. Eze Ehab kasị ha niile njọ. Ị̀ ma ihe kpatara ya? Isi ihe kpatara ya bụ nwunye ya, ajọ Eze Nwaanyị bụ́ Jezibel.

Jezibel abụghị nwaanyị Izrel. Ọ bụ ada eze Saịdọn. O fere chi ụgha bụ́ Bel ofufe, o mekwara ka Ehab na ọtụtụ ndị Izrel fee Bel. Jezibel kpọrọ Jehova asị ma gbuo ọtụtụ n’ime ndị amụma Ya. Ndị ọzọ zoro n’ọgba nkume ka a ghara igbu ha. Ihe ọ bụla Jezibel chọrọ, ọ ga-egbu ọbụna mmadụ iji nweta ya.

Otu ụbọchị, Ehab nọ ná mwute. Jezibel wee jụọ ya, sị: ‘Gịnị mere obi adịghị gị mma taa?’

Ehab wee zaa ya, sị: ‘Ọ bụ n’ihi ihe Nebọt gwara m. Achọrọ m ịzụrụ ubi ya. Ma ọ gwara m na ya agaghị enye m ya.’

‘Echegbula onwe gị,’ ka Jezibel sịrị. ‘M ga-enwetara gị ya.’

Jezibel wee degara ndị isi nọ n’obodo ahụ nwoke a bụ́ Nebọt bi akwụkwọ. Ọ gwara ha, sị: ‘Chọtanụ ụfọdụ ndị ikom na-abaghị n’ihe ka ha kwuo na Nebọt kọchara Chineke na eze anyị. Mgbe ahụ, dupụnụ Nebọt n’azụ obodo, werekwanụ nkume tụgbuo ya.’

Ozugbo Jezibel nụrụ na Nebọt anwụwo, ọ sị Ehab: ‘Jee ugbu a were ubi vaịn ya.’ Í kweghị na e kwesịrị inye Jezibel ahụhụ n’ihi ime ihe dị otú a nke jọgburu onwe ya?

Ya mere, ka oge na-aga, Jehova zigara otu nwoke bụ́ Jihu inye ya ahụhụ. Mgbe Jezibel nụrụ na Jihu na-abịa, o techara ihu ya, ma gbalịa idozi onwe ya iji maa mma ile anya. Mgbe Jihu bịara hụ Jezibel na windo, ọ kpọrọ ndị ikom nọ n’obí eze ahụ, sị: ‘Kwatuonụ ya!’ Ha wee mee otú ahụ, dị ka ị na-ahụ na foto a. Ha kwaturu ya, o wee nwụọ. Nke a bụ njedebe nke ajọ Eze Nwaanyị bụ́ Jezibel.