Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 68

Ụmụntakịrị Nwoke Abụọ Ndị Dịghachiri Ndụ

Ụmụntakịrị Nwoke Abụọ Ndị Dịghachiri Ndụ

A SỊ na ị nwụọ, olee otú obi ga-adị nne gị ma ọ bụrụ na e mee ka ị dịghachi ndụ? Obi ga-atọ ya ụtọ nke ukwuu! Ma onye nwụrụ anwụ ọ̀ pụrụ ịdị ndụ ọzọ? Nke a ò metụwo mbụ?

Lee nwoke na nwaanyị na nwata nwoke nọ n’ebe a. Nwoke ahụ bụ Ilaịja onye amụma. Nwaanyị ahụ bụ onye Zerefat nke di ya nwụrụ anwụ, nwata nwoke ahụ bụkwa nwa ya. Otu ụbọchị, nwata ahụ malitere ịrịa ọrịa. Ọrịa ahụ nọgidere na-aka njọ ruo mgbe ọ nwụrụ. Ilaịja wee sị nwaanyị ahụ: ‘Kunye m nwatakịrị ahụ.’

Ilaịja kuuru nwata ahụ nwụrụ anwụ rịgoro n’ụlọ elu wee nyiwe ya n’ihe ndina. O kpekuziri Jehova ekpere, sị: ‘Biko, Jehova, mee ka nwata a dịghachi ndụ.’ Nwata ahụ wee malite iku ume! Ilaịja wee kuru ya laghachi n’ụlọ ala ma gwa nwaanyị ahụ, sị: ‘Lee, nwa gị dị ndụ!’ Ọ bụ ya mere obi ji dị nne ya ụtọ nke ukwuu.

Ilaịsha bụ onye amụma Jehova ọzọ nke dị mkpa. Ọ na-enyere Ilaịja aka. Ma ka oge na-aga, Jehova jikwa Ilaịsha rụọ ọrụ ebube. Otu ụbọchị, Ilaịsha jere n’obodo Shunem, bụ́ ebe otu nwaanyị gosiri ya nnọọ obiọma. E mesịa, nwaanyị ahụ mụrụ otu nwa nwoke.

Mgbe nwata ahụ tolitere, o jere inyere nna ya aka n’ebe ọ na-arụ ọrụ n’ubi otu ụtụtụ. Na mberede, nwata nwoke ahụ tiri mkpu, sị: ‘Isi na-awa m!’ Mgbe e dulara ya ụlọ, nwata nwoke ahụ nwụrụ. Nke ahụ wutere nne ya nke ukwuu! Ngwa ngwa, o jere kpọọ Ilaịsha.

Mgbe Ilaịsha rutere, o kuuru nwata ahụ nwụrụ anwụ banye n’ime ụlọ. O kpekuru Jehova ekpere, dinara n’elu ozu nwata ahụ. Ọ dịghị anya, ahụ́ nwata nwoke ahụ kpooro ọkụ, o wee maa uzere ugboro asaa. Obi tọgburu nne ya atọgbu mgbe ọ batara ma hụ na nwa ya dị ndụ!

Ọtụtụ mmadụ anwụwo. Nke ahụ emewo ka ezinụlọ ha na ndị enyi ha ruo újú nke ukwuu. Anyị enweghị ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ma Jehova nwere ike ya. E mesịa, anyị ga-amụ banyere ụzọ ọ ga-esi mee ka ọtụtụ nde mmadụ dịghachi ndụ.