Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 69

Otu Nwa Agbọghọ Nta Enyere Otu Dike Aka

Otu Nwa Agbọghọ Nta Enyere Otu Dike Aka

Ị̀ MA ihe nwa agbọghọ nta a na-ekwu? Ọ na-akọrọ nwaanyị a banyere Ilaịsha onye amụma Jehova, na ihe ndị dị ebube Jehova na-enyere ya aka ime. Nwaanyị a amaghị ihe ọ bụla banyere Jehova n’ihi na ọ bụghị onye Izrel. Ngwa, ka anyị hụ ihe mere nwata a ji nọrọ n’ụlọ nwaanyị a.

Nwaanyị a bụ onye Siria. Aha di ya bụ Neeman, onyeisi ụsụụ ndị agha Siria. Ndị Siria jidere nwata nwaanyị Izrel a wee dutere ya nwunye Neeman ka ọ bụrụ odibo ya.

Neeman na-arịa otu ajọ ọrịa a na-akpọ ekpenta. Ọrịa a pụrụ ọbụna ime ka anụ ahụ́ mmadụ na-adakapụsị. Lee ihe nwa agbọghọ nta a na-agwa nwunye Neeman: ‘Ọ na-agụ m ka onyenwe m jekwuru onye amụma Jehova n’Izrel. Ọ ga-agwọ ya ekpenta ya.’ Mgbe e mesịrị, a gwara di nwaanyị a ihe nwa agbọghọ nta a kwuru.

Neeman chọrọ nnọọ ka a gwọọ ya, n’ihi ya, o kpebiri ịga Izrel. Mgbe o ruru ebe ahụ, ọ gara n‘ụlọ Ilaịsha. Ilaịsha zigara ohu ya ka ọ gwa Neeman ka ọ gaa saa ahụ́ ugboro asaa n’ime Osimiri Jọdan. Nke a kpasuru Neeman iwe nke ukwuu, o wee sị: ‘Osimiri ala m dị mma karịa osimiri ọ bụla dị n’Izrel!’ Mgbe Neeman kwusịrị nke a, ya alawa.

Ma ndị ohu ya gwara ya, sị: ‘Onyenwe anyị, ọ bụrụ na Ilaịsha sịrị gị mee ihe dị ike, ị ga-eme ya. Oleekwanụ ihe mere na ị gaghị asa ahụ́ nkịtị, dị ka o kwuru?’ Neeman gere ndị ohu ya ntị wee danye ugboro asaa n’ime Osimiri Jọdan. Mgbe o mesịrị nke a, anụ ahụ́ ya wee dị mma, ahụ́ agbasiekwa ya ike!

Obi tọrọ Neeman ezigbo ụtọ. O wee jekwuru Ilaịsha, sị ya: ‘Ugbu a ka m maara na Chineke nke Izrel bụ naanị ezi Chineke dị n’ụwa niile. Biko nara m onyinye nke a.’ Ma Ilaịsha zara ya, sị: ‘Mba, agaghị m anara ya.’ Ilaịsha maara na ọ gaghị ezi ezi ma ọ bụrụ na ya anara onyinye ahụ n’ihi na ọ bụ Jehova gwọrọ Neeman. Ma Gehezaị, bụ́ ohu Ilaịsha, chọrọ onyinye ahụ.

N’ihi ya, leenụ ihe Gehezaị mere. Mgbe Neeman lawara, Gehezaị chụkwuuru ya wee sị ya: ‘Ilaịsha sịrị m gwa gị na ya chọrọ ka i nye ya ụfọdụ n’ime onyinye gị ahụ ka o were lee ndị enyi ya bịara ileta ya ọbịa.’ N’ezie, nke a bụ ụgha. Ma Neeman amaghị na ọ bụ ụgha; o wee nye Gehezaị ihe ụfọdụ.

Mgbe Gehezaị laruru ụlọ, Ilaịsha amaralarị ihe o mere. Jehova agwawo ya. Ya mere, Ilaịsha gwara ya, sị: ‘N’ihi ihe ọjọọ nke a i mere, ekpenta Neeman ga-abịakwasị gị.’ Nke ahụ mere, n’egbughị oge!

Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’ihe a niile? Nke mbụ, anyị ga-adị ka nwata nwaanyị ahụ ma na-ekwu banyere Jehova. Ọ pụrụ ịrụpụta ihe ọma dị ukwuu. Nke abụọ, anyị ekwesịghị ịdị mpako otú Neeman dị na mbụ, kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịdị na-erubere ndị ohu Chineke isi. Nke atọ kwa, anyị ekwesịghị ịdị na-agha ụgha dị ka Gehezaị ghara. Ọ̀ bụ anyị apụghị ịmụta ọtụtụ ihe site n’ịgụ Bible?