Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 70

Jona na Azụ̀ Ukwu Ahụ

Jona na Azụ̀ Ukwu Ahụ

LEGODỊ nwoke a nọ n’ime mmiri. Ọ nọ ná nnukwu nsogbu, ka ọ̀ bụ na ọ nọghị? Azụ̀ ahụ na-achọ ilo ya! Ị̀ ma onye nwoke a bụ? Aha ya bụ Jona. Ka anyị hụ otú o si banye ná nnukwu nsogbu dị otú a.

Jona bụ onye amụma Jehova. N’oge na-adịghị anya ka Ilaịsha nwụsịrị, Jehova gwara Jona, sị: ‘Jee n’obodo ukwu bụ́ Ninive. Ajọ omume nke ndị bi na ya na-eme hiri nne nke ukwuu, achọkwara m ka ị gwa ha okwu banyere ya.’

‘Ma Jona achọghị ije. Ya mere, ọ banyere n’ụgbọ nke na-eje ebe ọzọ na-abụghị Ninive. O wutere Jehova na Jona na-agbara ọrụ o nyere ya ọsọ. N’ihi ya, Jehova mere ka oké ifufe malite ife. O fesiri nnọọ ike nke na ụgbọ ahụ chọwara ikpu. Ụjọ tụrụ ndị na-anya ụgbọ mmiri ahụ nke ukwuu, ha wee kpọkuo chi ha ka o nyere ha aka.

N’ikpeazụ, Jona gwara ha, sị: ‘Ana m efe Jehova Chineke, onye kere eluigwe na ala. Ọ bụ ọrụ Jehova nyere m ka m na-agbara ọsọ.’ Ya mere, ndị ahụ na-anya ụgbọ mmiri ahụ jụrụ ya, sị: ‘Gịnị ka anyị ga-eme gị ka oké ifufe nke a kwụsị?’

Jona sịrị ha: ‘Tụbanụ m n’ime oké osimiri a, osimiri a ga-adajụkwa.’ Ndị na-anya ụgbọ mmiri ahụ achọghị ime nke a, ma mgbe oké ifufe ahụ bịara ka njọ, ha tụbara Jona n’oké osimiri ahụ. Ozugbo ahụ, oké ifufe ahụ kwụsịrị, oké osimiri ahụ wee dajụọ.

Ka Jona na-emikpu n’ime mmiri, azụ̀ ukwu loro ya. Ma ọ nwụghị. Ọ nọrọ n’ime afọ azụ̀ ahụ ụbọchị atọ—ehihie na abalị. O wutere Jona nke ukwuu na ya egeghị Jehova ntị wee jee Ninive. N’ihi ya, ị̀ ma ihe o mere?

Jona kpekuru Jehova ekpere ka o nyere ya aka. Jehova wee mee ka azụ̀ ahụ gbọpụta Jona n’ala akọrọ. E mesịa, Jona jere Ninive. Nke a ọ́ dịghị akụziri anyị na ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-eme ihe ọ bụla Jehova kwuru?

Akwụkwọ Bible bụ́ Jona.