Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 71

Chineke Ekwe Nkwa Iweta Paradaịs

Chineke Ekwe Nkwa Iweta Paradaịs

NKE A bụ foto paradaịs, nke ọ pụrụ ịbụ na Chineke gosiri Aịzaya onye amụma ya. Aịzaya dịrị ndụ mgbe na-adịghị anya Jona nwụsịrị.

Paradaịs pụtara “ubi” ma ọ bụ “ogige.” Ọ̀ na-echetara gị ihe anyị hụrụla n’ime akwụkwọ a? O yiri nnọọ ogige ahụ mara mma nke Jehova Chineke kere maka Adam na Iv, ó yighị ya? Ma, ọ̀ dị mgbe ụwa niile ga-abụ paradaịs?

Jehova gwara Aịzaya onye amụma ya ka o dee ihe banyere paradaịs ọhụrụ ahụ na-abịanụ bụ́ nke e mere maka ndị Chineke. Ọ sịrị: ‘Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-ebikọ n’udo. Ụmụ ehi na ụmụ ọdụm ga-atakọ nri, ụmụntakịrị ga na-elekọta ha. Ọbụna agwọ na-ata ata agaghị emerụ nwa ọhụrụ ahụ́ ma ọ bụrụ na ọ na-egwuri egwu n’akụkụ ya.’

Ọtụtụ ndị ga-asị: ‘Nke a apụghị ime eme. Nsogbu adịwo mgbe niile n’ụwa, ọ ga na-adịkwa.’ Ma chegodị echiche banyere nke a: Olee ụdị ebe obibi Chineke nyere Adam na Iv?

Chineke debere Adam na Iv n’ime paradaịs. Ọ bụ naanị n’ihi na ha nupụụrụ Chineke isi mere e ji chụpụ ha n’ebe obibi ha ahụ mara mma, ha akaa nká, ma nwụọ. Chineke na-ekwe nkwa inye ndị niile hụrụ ya n’anya ihe ahụ Adam na Iv tụfuru.

N’ime paradaịs ọhụrụ nke na-abịanụ, ihe mgbu agaghị adị, ihe agaghịkwa na-emebi. Udo ga-adị n’ụzọ zuru ezu. Mmadụ niile ga-enwe ahụ́ ike na obi ụtọ. Ọ ga-adị nnọọ dị ka Chineke chọrọ ka ọ dị na mbụ. E mesịa, anyị ga-amụ banyere ụzọ Chineke ga-esi mee nke a.