Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akụkọ nke 73

Eze Ọma Ikpeazụ Chịrị Izrel

Eze Ọma Ikpeazụ Chịrị Izrel

JOSAYA dị naanị afọ asatọ mgbe ọ ghọrọ eze nke alaeze ebo abụọ nke Izrel nke dị n’ebe ndịda. Nke a bụ afọ ndụ pere nnọọ mpe mmadụ ịbụ eze. N’ihi ya, ndị okenye ụfọdụ nyeere ya aka na mbụ ịchị mba ahụ.

Mgbe Josaya bụworo eze afọ asaa, ọ malitere ịchọ Jehova. Ọ gbasoro ihe nlereanya nke ezi ndị eze dị ka Devid, Jehoshafat, na Hezekaya. E mesịa, mgbe Josaya ka dị nnọọ afọ iri na ụma, o mere ihe dị ka dike.

Ruo ogologo oge, ihe ka ọtụtụ ná ndị Izrel anọwo na-eme ihe ndị jọgburu onwe ha. Ha na-efe chi ụgha dị iche iche ofufe. Ha na-akpọ isi ala enye arụsị. N’ihi ya, Josaya na ndị ikom ya malitere iwepụsị ofufe ụgha n’ala ahụ. Nke a abụghị obere ọrụ ebe ọ bụ na ọtụtụ mmadụ na-efe chi ụgha dị iche iche. Ị pụrụ ịhụ Josaya na ndị ikom ya n’ebe a ka ha na-etipịasị arụsị niile ahụ.

Ka e mesịrị, Josaya nyere ndị ikom atọ ọrụ iwuzi ụlọ nsọ Jehova. A nakọtara ndị Izrel ego ma were ya nye ndị ikom ahụ ka ha jiri ya na-akwụ ụgwọ ọrụ ahụ a ga-arụ. Mgbe ha na-arụ ọrụ n’ụlọ nsọ ahụ, onyeisi nchụàjà, bụ́ Hilkaya, chọtara otu ihe dị mkpa n’ebe ahụ. Ọ bụ akwụkwọ iwu nke Jehova mere ka Mozis dee ogologo oge gara aga. O furu efu kemgbe ọtụtụ afọ.

E ji akwụkwọ ahụ jekwuru Josaya, o wee rịọ ka a gụpụta ya ka ya nụ. Ka Josaya na-ege ntị, ọ chọpụtara na ndị Izrel anọghị na-edebe iwu Jehova. Nke a wutere ya nke ukwuu, o wee dọwaa uwe ya, dị ka ị pụrụ ịhụ n’ebe a. O wee sị: ‘Jehova na-ewesa anyị iwe n’ihi na nna anyị hà edebeghị iwu ndị e dere n’ime akwụkwọ a.’

Josaya wee nye Hilkaya onyeisi nchụàjà iwu ịchọpụta ihe Jehova ga-eme ha. Hilkaya wee jee jụọ onye amụma nwaanyị, bụ́ Hulda. Hulda ziri ya ozi a si n’aka Jehova ka o zie Josaya: ‘M ga-enye Jeruselem na ndị niile ahụhụ n’ihi na ha efewo chi ụgha ofufe, ha emewokwa ka ala a jupụta n’ihe ọjọọ. Ma, ebe ọ bụ na gị onwe gị, bụ́ Josaya, emewo ihe ziri ezi, ahụhụ nke a agaghị abịa ruo mgbe ị nwụrụ.’