Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 74

Nwoke nke Na-atụghị Egwu

Nwoke nke Na-atụghị Egwu

LEE ka ndị a ji nwa okorobịa a na-eme ihe ọchị. Ị̀ ma onye ọ bụ? Ọ bụ Jeremaya. Ọ bụ onye amụma dị mkpa nke Chineke.

Ngwa ngwa Eze Josaya malitesịrị imebi arụsị ndị dị n’ala Juda, Jehova gwara Jeremaya ka ọ bụrụ onye amụma Ya. Ma Jeremaya chere na ya etorubeghị ịbụ onye amụma. Ma Jehova sịrị na ya ga-enyere ya aka.

Jeremaya gwara ụmụ Izrel ka ha kwụsị ime ihe ọjọọ. ‘Chi niile nke ndị mba ọzọ na-efe ofufe bụ chi ụgha,’ ka ọ sịrị. Ma ọtụtụ ndị Izrel họọrọ ife arụsị kama ife ezi Chineke bụ́ Jehova. Mgbe Jeremaya gwara ha na Chineke ga-ata ha ahụhụ n’ihi ajọ omume ha, ha chịrị ya ọchị.

Ọtụtụ afọ agaa. Josaya wee nwụọ, mgbe afọ atọ gasịkwara, Jehoyakim nwa ya wee bụrụ eze. Jeremaya nọgidere na-agwa ụmụ Izrel, sị: ‘A ga-ebibi Jeruselem ma ọ bụrụ na unu agbanweghị omume ọjọọ unu.’ Ndị nchụàjà jidere Jeremaya wee tie mkpu na-asị: ‘I kwesịrị ogbugbu n’ihi ihe ndị a i kwuru.’ Ha wee gwa ndị isi Izrel, sị: ‘E kwesịrị igbu Jeremaya, n’ihi na o kwujọọla obodo anyị.’

Gịnị ka Jeremaya ga-eme ugbu a? Ọ tụghị egwu! Ọ gwara ha niile, sị: ‘Jehova zitere m ịgwa unu ihe ndị a. Ọ bụrụ na unu agbanweghị ndụ ọjọọ unu na-adị, Jehova ga-ebibi Jeruselem. Ma maranụ nke a: Ọ bụrụ na unu egbuo m, unu na-egbu onye na-emeghị ihe ọjọọ ọ bụla.’

Ndị isi ahụ kwere ka Jeremaya dị ndụ, ma ndị Izrel agbanweghị ụzọ ọjọọ ha. E mesịa, Nebukadneza, bụ́ eze Babilọn, bịara busoo Jeruselem agha. N’ikpeazụ, Nebukadneza mere ụmụ Izrel ndị ohu ya. Ọ dọọrọ ọtụtụ puku n’ime ha n’agha laa Babilọn. Chegodị ihe ọ ga-adị ka ya ma ọ bụrụ na ndị ị na-amaghị esi n’ala gị dọrọ gị n’agha laa n’ala ị na-amaghị!