Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 75

Ụmụ Okorobịa Anọ Ndị Nọ na Babilọn

Ụmụ Okorobịa Anọ Ndị Nọ na Babilọn

EZE Nebukadneza dọọrọ ndị Izrel niile kasị mara akwụkwọ n’agha wee laa Babilọn. E mesịa, eze si n’etiti ha họpụta ụmụ okorobịa ndị kasị maa mma na ndị kasị mara ihe. Ụmụ okorobịa anọ ndị ị na-ahụ n’ebe a so n’ime ha. Otu bụ Daniel, atọ ndị ọzọ ka ndị Babilọn gụrụ aha bụ́ Shedrak, Mishak, na Abednego.

Nebukadneza chọrọ ịzụ ụmụ okorobịa ahụ ka ha wee na-eje ozi n’obí ya. Ọ bụrụ na e nyesịa ha ọzụzụ ruo afọ atọ, ọ ga-ahọrọ naanị ndị kasị mara ihe ka ha na-enyere ya aka n’ịhụ maka nsogbu dị iche iche. Eze chọrọ ka ụmụ okorobịa ndị ahụ gbasie ike ma nwee ahụ́ ike mgbe a na-enye ha ọzụzụ. N’ihi ya, o nyere iwu ka ndị ohu ya na-enye ha niile ụdị nri ọma na mmanya ọma ahụ a na-enye ya na ezinụlọ ya.

Lee nwa okorobịa ahụ bụ́ Daniel. Ị̀ ma ihe ọ na-agwa Ashpenaz, bụ́ onyeisi nke ndị ohu Nebukadneza? Daniel na-agwa ya na ya achọghị iri nri ọma si na tebụl eze. Ma nke a mere ka Ashpenaz na-echegbu onwe ya. O wee sị: ‘Eze ekwuwo ihe unu ga na-eri na ihe unu ga na-aṅụ. Ọ bụrụkwa na unu enweghị ahụ́ ike dị ka ụmụ okorobịa ndị ọzọ, ọ pụrụ igbu m.’

Ya mere, Daniel jekwuuru onye Ashpenaz nyere ọrụ ilekọta ya na ndị enyi ya atọ. O wee sị ya: ‘Biko, lee anyị ule ụbọchị iri. Na-enye anyị akwụkwọ nri na mmiri ọṅụṅụ. E mesịa, nyochaa anyị na ụmụ okorobịa ndị ọzọ ndị na-eri nri eze, ka ị hụ ndị ga-enwe ahụ́ ọma karị.’

Onye ahụ na-elekọta ha kwetara ime nke a. Mgbe ụbọchị iri ahụ zuru, Daniel na ndị enyi ya atọ nwere ahụ́ ọma karịa ụmụ okorobịa ndị ọzọ. N’ihi ya, onye nlekọta ahụ kwere ka ha na-eri akwụkwọ nri kama iri ihe ahụ eze sịrị ka e nyewe ha.

Mgbe afọ atọ gasịrị, a kpọgaara Nebukadneza ụmụ okorobịa niile ahụ. Mgbe eze gwasịrị ha niile okwu, ọ chọpụtara na Daniel na ndị enyi ya atọ kasị ndị ọzọ mara ihe. Ya mere, ọ kpọọrọ ha ka ha na-enyere ya aka n’obí ya. Mgbe ọ bụla eze jụkwara Daniel, Shedrak, Mishak, na Abednego ajụjụ ma ọ bụ nye ha ọrụ siri ike, ha maara ihe okpukpu iri karịa ndị dibia anwansị ya ma ọ bụ ndị ya maara ihe.