Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 5

Site ná Ndọrọ n’Agha Laa Babilọn Ruo ná Mwughachi nke Mgbidi Jeruselem

Site ná Ndọrọ n’Agha Laa Babilọn Ruo ná Mwughachi nke Mgbidi Jeruselem

Mgbe ụmụ Izrel nọ na Babilọn, bụ́ ebe a dọọrọ ha n’agha laa, ha nwetara ọtụtụ ule nke okwukwe. A tụbara Shedrak, Mishak, na Abednego n’ime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu, ma Chineke napụtara ha. E mesịa, mgbe ndị Midia na ndị Peshia meriri Babilọn, a tụbara Daniel n’olulu ọdụm ma Chineke chebere ya site n’imechi ọnụ ọdụm ndị ahụ.

N’ikpeazụ, eze Saịrọs nke Peshia tọhapụrụ ụmụ Izrel. Ha laghachiri n’ala ha mgbe naanị afọ iri asaa a dọọrọ ha n’agha laa Babilọn gasịrị. Otu n’ime ihe mbụ ha mere mgbe ha laruru Jeruselem bụ ịmalite iwu ụlọ nsọ Jehova. Ma, n’oge na-adịghị anya, ndị iro kwụsịrị ọrụ ahụ. Ya mere, ọ bụ ihe dị ka afọ iri abụọ na abụọ mgbe ha laghachisịrị Jeruselem ka ha wusịrị ụlọ nsọ ahụ.

Ọzọkwa, anyị ga-amụ banyere nlaghachi Ezra laghachiri Jeruselem iji chọọ ụlọ nsọ ahụ mma. Nke a bụ ihe dị ka afọ iri anọ na asaa e wusịrị ụlọ nsọ ahụ. Mgbe afọ iri na atọ gafesịrị kemgbe Ezra lọtasịrị, Nehemaya nyere aka n’iwughachi mgbidi Jeruselem ahụ e tikpọrọ etikpọ. NKEBI NKE 5 na-akọ akụkọ ihe ndị mere n’ime otu narị afọ na afọ iri ise na abụọ nke batara n’oge anyị a.

 

NÁ NKEBI A

AKỤKỌ NKE 77

Ha Ekweghị Akpọ Isi Ala

Chineke ọ̀ ga-esi n’ime ọkụ zọpụta ụmụ okorobịa atọ ahụ rubeere ya isi?

AKỤKỌ NKE 78

Ihe Aka Dere ná Mgbidi

Daniel onye amụma akọwaa ihe mkpụrụ okwu anọ ahụ dị mgbagwoju anya pụtara.

AKỤKỌ NKE 79

Daniel Nọ n’Olulu Ọdụm

E kwuola na a ga-egbu Daniel, ò nwere ihe ọ gaara eme ka a ghara igbu ya?

AKỤKỌ NKE 80

Ndị Chineke Ahapụ Babilọn

Saịrọs, eze Peshia mezuru otu amụma e buru na Baịbụl mgbe o meriri obodo Babilọn, ugbu a o mezuwakwala amụma ọzọ.

AKỤKỌ NKE 81

Ha Tụkwasịrị Chineke Obi na Ọ Ga-enyere Ha Aka

Ndị Izrel nupụrụ isi n’iwu mmadụ ka ha nwee ike irubere Chineke isi. Chineke ọ̀ ga-agọzi ha?

AKỤKỌ NKE 82

Mọdekaị na Esta

Vashtaị, nwunye Eze Ahazuirọs, mara ezigbo mma ma gịnị mere eze ji chọọ nwaanyị ọzọ ga-anọchi ya?

AKỤKỌ NKE 83

Mgbidi Jeruselem

Mgbe ha na-arụghachi mgbidi ahụ, ndị ahụ na-arụ ya na-edowe mma agha ha na ube ha nso ma n’ehihie ma n’abalị.