Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 77

Ha Ekweghị Akpọ Isi Ala

Ha Ekweghị Akpọ Isi Ala

Ì CHETARA mgbe ị nụrụ akụkọ banyere ụmụ okorobịa atọ ndị a? Ee, ha bụ ndị enyi Daniel ahụ ndị jụrụ iri ihe ha lere anya dị ka nri na-adịghị mma. Ndị Babilọn kpọrọ ha Shedrak, Mishak, na Abednego. Ma lee ha anya ugbu a. Gịnị mere ha anaghị akpọ isi ala nye onyinyo ukwu nke a dị ka ndị ọzọ na-akpọ? Ka anyị chọpụta.

Ì chetara iwu ahụ Jehova dere n’onwe ya nke a na-akpọ Iwu Iri? Nke mbụ n’ime ha bụ: ‘Efela chi ọzọ ma ọ bụghị naanị m.’ Ụmụ okorobịa ndị a na-erube isi n’iwu a, n’agbanyeghị na ọ bụghị ihe dị mfe ime.

Nebukadneza, bụ́ eze Babilọn, kpọrọ ọtụtụ ndị ukwu ka ha bịa sọpụrụ ihe oyiyi nke a o guzobere. Ọ dịbeghị anya ọ gwara ndị ahụ niile okwu, sị: ‘Mgbe unu nụrụ olu opi, olu ụbọ akwara na ihe iti egwú ndị ọzọ, unu ga-ada n’ala ma kpọọrọ ihe oyiyi ọlaedo a isi ala. Onye ọ bụla nke na-akpọghị isi ala, a ga-atụba ya ozugbo n’ime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu.’

Mgbe Nebukadneza nụrụ na Shedrak, Mishak, na Abednego akpọghị isi ala, oké iwe were ya. O wee sị ka e duta ha n’ihu ya. O nyere ha ohere ọzọ ịkpọ isi ala. Ma ụmụ okorobịa ndị ahụ tụkwasịrị Jehova obi. ‘Chineke anyị, bụ́ onye anyị na-efe, pụrụ ịzọpụta anyị,’ ka ha gwara Nebukadneza. ‘Ma, ọ bụrụgodị na ọ zọpụtaghị anyị, anyị agaghị akpọrọ ọlaedo gị isi ala.’

Mgbe Nebukadneza nụrụ nke a, iwe ya bịara ka njọ. E nwere ọkụ dị nso nke a kwanyere n’ebe ahụ, o wee nye iwu, sị: ‘Meenụ ka ọkụ ahụ nwusie ike okpukpu asaa karịa otú ọ na-enwu na mbụ!’ O meziri ka ndị ikom kasị ike n’ime ndị agha ya kee Shedrak, Mishak, na Abednego agbụ, ma tụba ha n’ime ọkụ ahụ. Ọkụ ahụ na-enwusi nnọọ ike nke na ire ya regburu ndị dike ahụ. Ma gịnị mere ụmụ okorobịa atọ ahụ ha tụbara n’ime ya?

Eze wee lee anya n’ime ọkụ ahụ, ezigbo egwu ejide ya. O wee jụọ, sị: ‘Ọ́ bụghị ndị ikom atọ ka anyị kere agbụ ma tụba n’ime ọkụ a na-enwu ajọ onwunwu?’

Ndị ohu ya azaa ya, sị: ‘Ee, ọ bụ otú anyị mere.’

Ọ sị ha: ‘Ma ana m ahụ ndị ikom anọ ka ha na-ejegharị n’ime ọkụ ahụ. E keghị ha agbụ, ọkụ anaghịkwa ere ha. Onye mere ha anọ yiri mmụọ ozi.’ Eze wee jeruo n’ọnụ ụzọ ebe a kwanyere ọkụ ahụ nso wee na-akpọ òkù: ‘Shedrak! Mishak! Abednego! Pụtanụ, unu ndị ohu nke Chineke nke kachasị ihe niile elu!’

Mgbe ha pụtara, mmadụ niile hụrụ na ọ dịghị ebe ha merụrụ ahụ́. Eze wee sị: ‘Ka otuto dịrị Chineke nke Shedrak, Mishak, na Abednego! O zitewo mmụọ ozi ya wee zọpụta ha n’ihi na ha akpọghị isi ala nye chi ọzọ ma ọ bụghị nke ha.’

Nke a ọ́ bụghị ezi ihe nlereanya nke ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova bụ́ nke anyị kwesịrị ịgbaso?