Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 79

Daniel Nọ n’Olulu Ọdụm

Daniel Nọ n’Olulu Ọdụm

EWOO! O yiri ka Daniel ọ̀ nọ ná nnukwu nsogbu. Ma ọdụm ndị a anaghị emerụ ya ahụ́! Ị̀ ma ihe kpatara ya? Ònye tụbara Daniel n’ebe a ọdụm jupụtara? Ka anyị chọpụta.

Eze Babilọn n’oge ahụ bụ nwoke aha ya bụ Darayọs. O nwere mmasị dị ukwuu n’ebe Daniel nọ n’ihi na Daniel nwere obiọma nke ukwuu, marakwa ihe. Darayọs mere Daniel onyeisi ọchịchị n’alaeze ya. Nke a mere ka ndị ikom ndị ọzọ na-emere Daniel anyaụfụ, n’ihi ya, leenụ ihe ha mere.

Ha jere sị Darayọs: ‘Anyị ekwerewo, eze, ka i mee iwu ka mmadụ ọ bụla ghara ikpere chi ọzọ ma ọ bụ mmadụ ọzọ ma ọ bụghị naanị gị ruo ụbọchị iri atọ. Onye ọ bụla nke na-erubeghị isi n’iwu a, a ga-atụba ya n’ime olulu ọdụm.’ Darayọs amaghị ihe mere ha ji chọọ ka e mee iwu a. Ma, o chere na ọ bụ ezi ihe, o wee dee iwu ahụ n’akwụkwọ. Ugbu a o derela iwu ahụ n’akwụkwọ, a pụghị ịgbanwe ya.

Mgbe Daniel nụrụ banyere iwu ahụ, ọ lara n’ụlọ ya ma kpee ekpere dị ka ọ na-eme mgbe niile. Ajọ ndị ikom ahụ maara na Daniel agaghị akwụsị ikpegara Jehova ekpere. Obi dị ha ụtọ n’ihi na o yiri ka ìzù ha na-agba igbu Daniel ọ na-aga nke ọma.

Mgbe Eze Darayọs matara ihe mere ndị ikom a ji chọọ ka e mee iwu a, o wutere ya nke ukwuu. Ma, ọ pụghị ịgbanwe iwu ahụ, nke a mere o ji nye iwu ka a tụba Daniel n’olulu ọdụm. Ma eze gwara Daniel, sị: ‘Enwere m olileanya na Chineke gị, onye ị na-efe ofufe, ga-azọpụta gị.’

Obi adịtụghị Darayọs mma n’abalị ahụ nke na o hilighị ụra. N’ụtụtụ echi ya, o weere ọsọ gbaga n’olulu ọdụm ahụ. Ị pụrụ ịhụ ya n’ebe ahụ. O wee kpọọ òkù: ‘Daniel, ohu Chineke dị ndụ! Chineke onye ị na-efe, ò nwewo ike ịzọpụta gị n’ọnụ ọdụm ndị ahụ?’

Daniel wee zaa ya, sị: ‘Chineke zitere mmụọ ozi ya ka o mechie ọnụ ọdụm ndị a ka ha ghara ịdọgbu m.’

Obi tọrọ eze ụtọ. O wee nye iwu ka a dọpụta Daniel n’olulu ọdụm ahụ. O wee mee ka a tụba ajọ ndị ikom ahụ chọrọ igbu Daniel n’olulu ọdụm ahụ. Ọbụna tupu ha adaruo ala, ọdụm ndị ahụ jidere ha ma nyajisie ọkpụkpụ ha niile.

Eze Darayọs wee degara ndị niile nọ n’alaeze ya akwụkwọ, sị: ‘M na-enye iwu ka onye ọ bụla na-asọpụrụ Chineke nke Daniel. Ọ na-arụ oké ọrụ ebube. Ọ zọpụtara Daniel ka ọdụm ghara iripia ya.’