Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 80

Ndị Chineke Ahapụ Babilọn

Ndị Chineke Ahapụ Babilọn

IHE dị ka afọ abụọ agafewo kemgbe ndị Midia na ndị Peshia weghaara Babilọn. Ma lee ihe na-eme ugbu a! Ndị Izrel na-ahapụ Babilọn. Olee ụzọ ha si nwere onwe ha? Ònye hapụrụ ha ka ha laa?

Ọ bụ Saịrọs, eze Peshia. Mgbe dị anya tupu a mụọ Saịrọs, Jehova gwara onye amụma ya bụ́ Aịzaya ka o dee banyere ya, sị: ‘Ị ga-eme nnọọ ihe m chọrọ ka i mee. A ga-emeghere gị ọnụ ụzọ ámá niile ka i wee weghara obodo ahụ.’ Saịrọs mesịkwara bute ụzọ n’iweghara Babilọn. Ndị Midia na ndị Peshia si n’ọnụ ụzọ ámá ndị e ghewere oghe bata n’obodo ahụ n’ime abalị.

Ma Aịzaya onye amụma Jehova kwukwara na Saịrọs ga-enye iwu ka e wughachi Jeruselem na ụlọ nsọ ya. Saịrọs ò nyere iwu ka e mee nke a? Ee, o mere otú ahụ. Nke a bụ ihe Saịrọs gwara ndị Izrel: ‘Laanụ Jeruselem ka unu wuo ụlọ nsọ Jehova, bụ́ Chineke unu.’ Ọ bụkwa ihe ụmụ Izrel ndị a na-ala ime.

Ma, ọ bụghị ụmụ Izrel niile nọ na Babilọn nwere ike ime ogologo njem ahụ laghachi Jeruselem. Ọ bụ ogologo njem nke dị ihe dị ka narị kilomita asatọ, ọtụtụ ha emewo agadi ma ọ bụ na-arịasi ọrịa ike nke na ha apụghị ime njem tere aka. E nwekwara ihe ndị ọzọ mere na ụfọdụ ndị alaghị. Ma Saịrọs gwara ndị na-alaghị, sị: ‘Werenụ ọlaọcha na ọlaedo na ihe ndị ọzọ nye ndị na-alaghachi iwu Jeruselem na ụlọ nsọ ya.’

N’ihi nke a, e nyere ndị Izrel na-ala Jeruselem ọtụtụ onyinye. Saịrọs nyekwara ha ọkwá na iko niile ndị ahụ Eze Nebukadneza chịkọọrọ n’ụlọ nsọ Jehova mgbe o bibiri Jeruselem. Ndị ahụ nwere ọtụtụ ihe ndị ha ga-ebu laa.

Mgbe ha mere njem ihe dị ka ọnwa anọ, ndị Izrel ahụ ruru Jeruselem n’ezi oge. Ọ bụ naanị afọ iri asaa gaferela kemgbe e bibiri obodo ahụ, ala ahụ tọgbọkwara n’efu n’enweghị mmadụ ọ bụla nọ na ya. N’agbanyeghịkwa na ndị Izrel alọtawo n’ala ha ugbu a, ha ga-enwe ihe isi ike ụfọdụ, dị ka anyị ga-amụ banyere ya n’akụkọ nke na-esonụ.