Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 6

Site n’Ọmụmụ Jizọs Ruo n’Ọnwụ Ya

Site n’Ọmụmụ Jizọs Ruo n’Ọnwụ Ya

E zigara mmụọ ozi Gebriel ijekwuru otu nwa agbọghọ ọma aha ya bụ Meri. Ọ gwara ya na ọ ga-amụ nwa nke gaje ịbụ eze ruo mgbe ebighị ebi. A mụrụ nwa ahụ, bụ́ Jizọs, n’ụlọ anụ, bụ́ ebe ndị ọzụzụ atụrụ bịara leta ya. E mesịa, otu kpakpando duuru ndị ikom si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ bịa n’ebe nwata ahụ nọ. Anyị ga-amata onye mere ka ha hụ kpakpando ahụ na ụzọ e si zọpụta Jizọs mgbe a nwara igbu ya.

Ọzọkwa, anyị ga-ahụ Jizọs, mgbe ọ gbara afọ iri na abụọ, ka ọ na-agwa ndị ozizi okwu n’ụlọ nsọ. Afọ iri na asatọ mgbe e mesịrị, e mere Jizọs baptizim, o wee malite ọrụ nke ikwusa na ịkụzi banyere Alaeze ahụ, bụ́ ihe Chineke zitere ya n’ụwa ime. Iji nyere ya aka n’ọrụ a, Jizọs họpụtara ndị ikom iri na abụọ ma mee ha ndịozi ya.

Jizọs rụkwara ọtụtụ ọrụ ebube. O ji azụ̀ nta ole na ole na ógbè achịcha ole na ole nyejuo ọtụtụ puku mmadụ afọ. Ọ gwọrọ ndị ọrịa, ọbụna mee ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie. N’ikpeazụ, anyị ga-amụ banyere ọtụtụ ihe ndị mere Jizọs n’ụbọchị ikpeazụ nke ndụ ya, na ụzọ e si gbuo ya. Jizọs kwusara ozi ọma ihe dị ka afọ atọ na ọkara, ya mere, NKEBI NKE 6 na-akọ ihe mere n’ime oge ji obere ihe karịa afọ iri atọ na anọ.

 

NÁ NKEBI A

AKỤKỌ NKE 84

Otu Mmụọ Ozi Eleta Meri

O wetaara ya ozi si n’aka Chineke: Meri ga-amụ nwa nwoke ga-achị ruo mgbe ebighị ebi.

AKỤKỌ NKE 85

A Mụọ Jizọs n’Ụlọ Anụ

Gịnị mere e ji mụọ onye ga-abụ eze n’ọdịnihu n’ụlọ anụ?

AKỤKỌ NKE 86

Ndị Ikom Otu Kpakpando Duziri

Ònye dugara ndị ahụ na-agụ kpakpando n’ebe Jizọs nọ? Azịza ya nwere ike iju gị anya.

AKỤKỌ NKE 87

Mgbe Nwata Bụ́ Jizọs Nọ n’Ụlọ Nsọ

Otú o si mara ihe tụrụ ndị okenye na-akụzi ihe n’ụlọ nsọ n’anya.

AKỤKỌ NKE 88

Jọn Emee Jizọs Baptizim

Jọn nọ na-eme ndị mmehie baptizim, ma Jizọs emetụbeghị mmehie. Gịnịzi mere Jọn ji mee ya baptizim?

AKỤKỌ NKE 89

Jizọs Emee Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha

Jizọs egosi ụdị ịhụnanya mere ka iwe wee ya.

AKỤKỌ NKE 90

Mgbe Jizọs na Otu Nwaanyị Nọ n’Akụkụ Olulu Mmiri

Olee otú mmiri Jizọs na-enye ga-esi mee ka akpịrị ghara ịkpọ nwaanyị ahụ nkụ ọzọ?

AKỤKỌ NKE 91

Mgbe Jizọs Na-ezi Ihe n’Elu Ugwu

Mụta ọtụtụ ihe ndị ga-abara gị uru ná ndụ n’Ozizi Elu Ugwu Jizọs.

AKỤKỌ NKE 92

Jizọs Akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ

Jizọs ji ike Chineke kwuo mkpụrụ okwu abụọ ma kpọlite ada Jaịrọs n’ọnwụ.

AKỤKỌ NKE 93

Jizọs Enye Ọtụtụ Mmadụ Nri

Olee otu ihe dị mkpa Jizọs ji inye ọtụtụ puku mmadụ nri kụziere anyị?

AKỤKỌ NKE 94

Jizọs Hụrụ Ụmụntakịrị n’Anya

Jizọs kụziiri ndịozi ya na e nwere ọtụtụ ihe ha ga-amụ banyere ụmụaka, nweekwa ihe ndị ha ga-esi n’aka ụmụaka mụta.

AKỤKỌ NKE 95

Ụzọ Jizọs Si Akụzi Ihe

Ihe atụ ezigbo onye agbata obi ahụ Jizọs mere bụ otu ihe gosiri na Jizọs na-ejikarị ihe atụ akụzi ihe.

AKỤKỌ NKE 96

Jizọs Agwọọ Ndị Ọrịa

Olee ihe Jizọs ji ọrụ ebube niile ọ rụrụ rụzuo?

AKỤKỌ NKE 97

Jizọs Abịa Dị Ka Eze

Ìgwè mmadụ bịara ịnabata ya, ma ọ bụghị mmadụ niile ka obi dị mma.

AKỤKỌ NKE 98

N’elu Ugwu Oliv

Jizọs gwara mmadụ anọ ná ndịozi ya ihe ndị ga-eme n’oge anyị a.

AKỤKỌ NKE 99

N’ime Ụlọ Dị n’Ụlọ Elu

Gịnị mere Jizọs ji gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-eri nri a pụrụ iche n’afọ ọ bụla?

AKỤKỌ NKE 100

Mgbe Jizọs Nọ n’Ime Ubi A Gbara Ogige

Gịnị mere Judas ji sutu Jizọs ọnụ wee rara ya nye?

AKỤKỌ NKE 101

E Gbuo Jizọs

Mgbe a kpọgidere ya n’elu osisi, o kwere mmadụ nkwa paradaịs.