Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 87

Mgbe Nwata Bụ́ Jizọs Nọ n’Ụlọ Nsọ

Mgbe Nwata Bụ́ Jizọs Nọ n’Ụlọ Nsọ

LEE nwata nwoke a ka ọ na-agwa ndị okenye a okwu. Ha bụ ndị nkụzi n’ụlọ nsọ Chineke nke dị na Jeruselem. Nwata nwoke a bụ Jizọs. O tolitetụwo. Ọ dị afọ iri na abụọ ugbu a.

Ọ na-eju ndị nkụzi a anya na Jizọs maara ihe dị ukwuu banyere Chineke na ihe ndị e dere n’ime Bible. Ma gịnị mere Josef na Meri anọghị n’ebe a? Olee ebe ha nọ? Ka anyị chọpụta.

Kwa afọ, Josef na-eduru ezinụlọ ya eje Jeruselem maka ememe pụrụ iche a na-akpọ Ememe Ngabiga. O tere ezigbo aka isi Nazaret gaa Jeruselem. Ọ dịghị onye nwere ụgbọala, ụgbọ okporo igwe adịghịkwa. E nweghị ha n’oge ahụ. Ọtụtụ mmadụ na-eji ụkwụ aga, ọ na-ewekwa ha ihe dị ka ụbọchị atọ iru Jeruselem.

Ezinụlọ Josef buru ibu ugbu a. N’ihi ya, e nwere ụmụnne Jizọs ndị ikom na ndị inyom a ga-elekọta anya. N’afọ ahụ, Josef na Meri na ụmụ ha mere ogologo njem na-alaghachi Nazaret. Ha chere na Jizọs so ndị ọzọ na-ala. Ma, mgbe ha kwụsịtụrụ n’oge chi jiri, ha ahụghị Jizọs. Ha chọrọ ya n’etiti ndị ikwu ha na ndị enyi ha, ma o soghị ha! Ha wee laghachi Jeruselem ịchọ ya ebe ahụ.

N’ikpeazụ, ha chọtara Jizọs n’ebe a n’etiti ndị nkụzi. Ọ na-ege ha ntị, na-ajụkwa ha ajụjụ. Amamihe Jizọs tụkwara ha niile n’anya. Meri wee sị ya: ‘Nwa m, gịnị mere i ji mee anyị otú a? Mụ na nna gị anọwo na-echegbu onwe anyị, na-achọgharị gị.’

Jizọs zara ha, sị: ‘Gịnị mere unu ji na-achọ m? Ùnu amaghị na m ghaghị ịnọ n’ụlọ nna m?’

Ee, Jizọs nwere mmasị ịnọ ebe ọ ga-amụta ihe banyere Chineke. Nke a ọ́ bụghị otú o kwesịrị ịdị anyị? N’obodo ha bụ́ Nazaret, Jizọs na-eje nzukọ kwa izu iji fee Chineke ofufe. Ọ mụtara ọtụtụ ihe n’ime Bible n’ihi na ọ na-ege ntị mgbe niile. Ka anyị dị ka Jizọs ma na-agbaso ihe nlereanya ya.