Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 90

Mgbe Jizọs na Otu Nwaanyị Nọ n’Akụkụ Olulu Mmiri

Mgbe Jizọs na Otu Nwaanyị Nọ n’Akụkụ Olulu Mmiri

JIZỌS kwụsịrị izu ike n’akụkụ otu olulu mmiri dị na Sameria. Ndị na-eso ụzọ ya abanyewo n’ime obodo ịzụta ihe oriri. Nwaanyị a Jizọs na-agwa okwu bịara isere mmiri. Jizọs sịrị ya: ‘Nye m mmiri ka m ṅụọ.’

Nke a juru nnọọ nwaanyị ahụ anya. Ị̀ ma ihe kpatara ya? Ọ bụ n’ihi na Jizọs bụ onye Juu, nwaanyị ahụ abụrụ onye Sameria. Ihe ndị Sameria adịghị amasị ọtụtụ ndị Juu. Ha na ha adịghịdị ekwurịta okwu! Ma Jizọs hụrụ ụdị mmadụ niile n’anya. O wee sị ya: ‘A sị na ị ma onye na-arịọ gị mmiri ọṅụṅụ, ị ga-arịọ ya ka o nye gị mmiri nke na-enye ndụ, ọ ga-enyekwa gị.’

Nwaanyị ahụ wee sị ya: ‘Nna anyị ukwu, olulu mmiri a dị omimi, i jighịkwa bọket ọ bụla. Ebee ka ị ga-enweta mmiri ahụ na-enye ndụ?’

‘Ọ bụrụ na ị ṅụọ mmiri si n’olulu a, akpịrị ga-akpọ gị nkụ ọzọ,’ ka Jizọs sịrị ya. ‘Ma mmiri m na-enye pụrụ ime ka mmadụ dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.’

Nwaanyị ahụ wee sị ya: ‘Nna anyị ukwu, nye m mmiri ahụ! Nke ahụ ga-emekwa ka akpịrị ghara ịkpọ m nkụ ọzọ. M gaghịzi na-abịa ebe a isere mmiri.’

Nwaanyị ahụ chere na Jizọs na-ekwu banyere mmiri nkịtị. Ma ọ na-ekwu maka eziokwu banyere Chineke na alaeze ya. Eziokwu a yiri mmiri na-enye ndụ. Ọ pụrụ inye mmadụ ndụ ebighị ebi.

Jizọs wee sị nwaanyị ahụ: ‘Gaa kpọọ di gị, ma bịaghachi.’

‘Enweghị m di,’ ka nwaanyị ahụ zara.

Jizọs asị ya: ‘Ị zara nke ọma. I nwewo di ise, nwoke nke gị na ya bikwa ugbu a abụghị di gị.’

O juru nwaanyị ahụ anya n’ihi na ihe a niile bụ eziokwu. Olee otú Jizọs si mara ihe ndị a? Ọ bụ n’ihi na Jizọs bụ Onye ahụ e kwere ná nkwa nke Chineke zitere, Chineke nyekwara ya ihe ọmụma nke a. Ọ bụ n’oge a ka ndị na-eso ụzọ Jizọs lọtara, o wee ju ha anya na ọ na-agwa nwaanyị Sameria okwu.

Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe a niile? Ọ na-egosi na Jizọs nwere obiọma n’ebe ndị si n’agbụrụ niile nọ. Anyị kwesịkwara ime otú ahụ. Anyị ekwesịghị iche na mmadụ ụfọdụ dị njọ naanị n’ihi na ha sitere n’otu agbụrụ. Jizọs chọrọ ka mmadụ niile mara eziokwu ahụ nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi. Anyị kwesịkwara inwe mmasị inyere ndị mmadụ aka ịmụta eziokwu ahụ.