Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 91

Mgbe Jizọs Na-ezi Ihe n’Elu Ugwu

Mgbe Jizọs Na-ezi Ihe n’Elu Ugwu

LEE Jizọs ka ọ nọdụrụ ala ebe a. Ọ na-ezi ndị a niile ihe n’elu ugwu Galili. Ndị ahụ kasị nọrọ ya nso bụ ndị na-eso ụzọ ya. Ọ họpụtara ha iri na abụọ ịbụ ndịozi. Ndịozi bụ ndị pụrụ iche na-eso ụzọ Jizọs. Ị̀ ma aha ha?

E nwere Saịmọn Pita na Andru nwanne ya nwoke. E nwekwara Jems na Jọn, ndị bụ́kwa ụmụnne. A na-akpọ onyeozi ọzọ Jems, na-akpọkwa onye ọzọ Saịmọn. E nwere ndịozi abụọ aha ha bụ Judas. Otu bụ Judas Iskarịọt, a na-akpọkwa Judas nke ọzọ Tadiọs. Ndị ọzọ bụ Filip na Nataniel (onye a na-akpọkwa Batọlọmiu), na Matiu na Tọmọs.

Mgbe Jizọs si Sameria lọta, ọ malitere ikwusa na nke mbụ ya, sị: ‘Alaeze eluigwe dị nso.’ Ị̀ ma ihe alaeze ahụ bụ? Ọ bụ ọchịchị Chineke. Jizọs bụ eze ya. Ọ ga-esi n’eluigwe na-achị, wee weta udo n’ụwa. Alaeze Chineke ga-eme ka ụwa niile ghọọ paradaịs mara mma.

Jizọs na-ezi ndị a ihe banyere alaeze ahụ. ‘Lee otú unu ga-esi na-ekpe ekpere,’ ka ọ na-agwa ha. ‘Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka a sọpụrụ aha gị. Ka alaeze gị bịa. Ka e mee uche gị n’ụwa, dị ka a na-eme ya n’eluigwe.’ Ọtụtụ ndị na-akpọ nke a ‘Ekpere Onyenwe anyị.’ Ndị ọzọ na-akpọ ya ‘Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe.’ Ị̀ ga-ekpeli ekpere ahụ n’isi?

Jizọs na-ezikwa ha ụzọ ha ga-esi na-emeso ibe ha. Ọ na-asị: ‘Na-emerenụ ndị ọzọ ihe unu na-achọ ka ha na-emere unu.’ Ọ́ dịghị amasị gị mgbe ndị ọzọ mesoro gị omume n’obiọma? N’ihi ya, Jizọs na-asị, anyị kwesịrị ịdị na-emeso ndị ọzọ omume n’obiọma. Ọ́ gaghị abụ ihe magburu onwe ya n’ụwa paradaịs, mgbe mmadụ niile ga na-eme nke a?