Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 92

Jizọs Akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ

Jizọs Akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ

NWATA nwaanyị a ị na-ahụ ebe a dị afọ iri na abụọ. Jizọs jidere aka ya, nne na nna ya guzo nso ebe ahụ. Ị̀ ma ihe mere obi ji dị ha nnọọ ụtọ? Ka anyị chọpụta.

Nna nwata nwaanyị ahụ bụ onye a ma ama nke aha ya bụ Jaịrọs. Otu ụbọchị, ada ya dara ọrịa, e wee nyiwe ya n’ihe ndina. Ma ahụ́ ekweghị adị ya mma. Ọrịa ya bịara na-aka njọ. Jaịrọs na nwunye ya chịịrị obi n’aka, n’ihi na o yiri ka obere nwa ha nwaanyị ọ̀ gaje ịnwụ. Ọ bụ ya bụ naanị nwa ha nwere. N’ihi ya, Jaịrọs jere ịchọ Jizọs. Ọ nụwo banyere ọrụ ebube ndị Jizọs na-arụ.

Mgbe Jaịrọs hụrụ Jizọs, ìgwè mmadụ gbara ya gburugburu. Ma Jaịrọs gafere ìgwè mmadụ ahụ wee daa n’ala n’ụkwụ Jizọs. Ọ sị ya: ‘Nwa m nwaanyị na-arịasi ọrịa ike. Biko, bịa mee ka ahụ́ dị ya mma.’ Jizọs wee sị na ya ga-abịa.

Mgbe ha na-eje, ìgwè mmadụ ahụ kwooro na-abịaru ya nso. Jizọs wee kwụsị na mberede. Ọ jụọ, sị: ‘Ònye bitụrụ m aka?’ Ka ahụ́ si mee Jizọs gosiri ya na ike esiwo n’ahụ́ ya pụọ, o wee mara na mmadụ bitụrụ ya aka. Ọ̀ bụ onye bitụrụ ya aka? Ọ bụ nwaanyị nọworo na-arịa ọrịa kemgbe afọ iri na abụọ. Ọ bịaruru n’ebe Jizọs nọ, metụ uwe ya aka, ahụ́ wee dị ya mma!

Nke a mere ka obi sie Jaịrọs ike n’ihi na ọ hụla na ọ dịịrị Jizọs mfe ịgwọ mmadụ. Ma mgbe ahụ, otu onye ozi bịara. Ọ sịrị Jaịrọs: ‘Hapụzie inye Jizọs nsogbu. Nwa gị nwaanyị anwụwo.’ Jizọs nụrụ nke a wee sị Jaịrọs: ‘Echegbula onwe gị, ahụ́ ga-adị ya mma.’

Mgbe ha mesịrị ruo n’ụlọ Jaịrọs, ndị mmadụ na-akwa ákwá n’oké iru újú. Ma Jizọs sịrị ha: ‘Unu akwala ákwá. Nwata a anwụghị anwụ. Ọ bụ naanị ụra ka ọ na-arahụ.’ Ha chịrị Jizọs ọchị n’ihi na ha maara na ọ nwụwo.

Jizọs wee kpọrọ nne na nna nwata ahụ nakwa mmadụ atọ n’ime ndịozi ya baa n’ime ụlọ ebe nwata ahụ dina. O jide ya n’aka wee sị ya: ‘Bilie ọtọ!’ O wee dị ndụ ọzọ dị ka ị na-ahụ n’ebe a. O bilie ọtọ wee na-ejegharị! Ọ bụ ya mere nne na nna ya ji nwee nnọọ obi ụtọ.

Nke a abụghị onye mbụ Jizọs kpọlitere n’ọnwụ. Onye mbụ Bible kọrọ banyere ya bụ nwa nke otu nwaanyị di ya nwụrụ, bụ́ onye bi n’obodo Nen. E mesịa, Jizọs kpọlitekwara Lazarọs nwanne Meri na Mata n’ọnwụ. Mgbe Jizọs ga-achị dị ka eze nke Chineke, ọ ga-eme ka ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ. Ọ̀ bụ anyị ekwesịghị inwe obi ụtọ maka nke a?