Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 94

Jizọs Hụrụ Ụmụntakịrị n’Anya

Jizọs Hụrụ Ụmụntakịrị n’Anya

LEE Jizọs ka ọ makụrụ nwata ahụ. Nke ahụ na-egosi na ọ hụrụ ụmụntakịrị n’anya n’ezie. Ndị ikom ahụ na-ele ya bụ ndịozi ya. Gịnị ka Jizọs na-agwa ha? Ka anyị chọpụta.

Jizọs na ndịozi ya ka si njem dị anya lọta. Ndịozi ya rụrịtara ụka n’ụzọ. Mgbe ha lọtara, Jizọs jụrụ ha, sị: ‘Gịnị ka unu nọ na-arụrịta banyere ya n’ụzọ?’ N’ezie, Jizọs maara ihe ha na-arụrịta banyere ya. Ma, ọ jụrụ ajụjụ ahụ iji mara ma ndịozi ya hà ga-agwa ya.

Ha azaghị ya, n’ihi na ha nọ na-arụrịta ụka onye kasị ukwuu n’ime ha. Ụfọdụ ndịozi ya chọrọ ịdị ukwuu karị ibe ha. Olee ụzọ Jizọs ga-esi gwa ha na o zighị ezi mmadụ ịchọ ịbụ onye kasị ukwuu?

Ọ kpọtara nwata ahụ wee mee ka o guzoro n’ihu ha niile. O wee sị ha: ‘M chọrọ ka unu mara nke a n’ezie, Ọ gwụla ma ùnu gbanwere wee dị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba n’alaeze Chineke. Onye ga-akasị ukwu n’alaeze ahụ bụ onye ga-adị ka nwata nke a.’ Ị̀ ma ihe mere Jizọs ji kwuo nke a?

Ụmụntakịrị adịghị echegbu onwe ha banyere ịdị ukwuu ma ọ bụ ịdị mkpa karịa ibe ha. N’ihi ya, ndịozi ahụ kwesịrị ịmụta ịdị ka ụmụntakịrị n’ụzọ dị otú a, ọ bụghị ịdị na-ese okwu banyere onye ka ibe ya ukwuu ma ọ bụ onye dị mkpa karịa ibe ya.

E nwekwara oge ndị ọzọ Jizọs gosipụtara ókè ọ hụruru ụmụntakịrị n’anya. Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, ụfọdụ ndị kutere ụmụ ha ka ha hụ Jizọs. Ndịozi ya nwara igbochi ha. Ma Jizọs sịrị ndịozi ya: ‘Kwenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochila ha, n’ihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị ka ha.’ O wee kuru ụmụntakịrị ahụ n’aka ya, wee gọzie ha. Ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe dị mma ịmara na Jizọs hụrụ ụmụntakịrị n’anya?