Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 95

Ụzọ Jizọs Si Akụzi Ihe

Ụzọ Jizọs Si Akụzi Ihe

OTU ụbọchị, Jizọs gwara otu nwoke na o kwesịrị ịhụ onye agbata obi ya n’anya. Nwoke ahụ jụrụ Jizọs, sị: ‘Ònye bụ onye agbata obi m?’ Jizọs maara ihe nwoke a na-eche. Ọ na-eche na ọ bụ naanị ndị agbụrụ ya na ndị okpukpe ya bụ ndị agbata obi ya. Ka anyị lee ihe Jizọs gwara ya.

Mgbe ụfọdụ, Jizọs na-akụzi ihe site n’ịkọ akụkọ. Nke a bụ ihe o mere n’oge ahụ. Ọ kọrọ akụkọ banyere otu onye Juu na otu onye Sameria. Anyị amụworị na ihe ndị Sameria adịghị amasị ọtụtụ ndị Juu. Nke a bụ akụkọ Jizọs kọrọ:

Otu ụbọchị, otu onye Juu nọ na-aga n’ụzọ ndịda ugwu nke na-aga Jeriko. Ndị ohi wee jide ya. Ha naara ya ego ya, tie ya ọ dị ndụ ọnwụ ka mma.

Mgbe nke ahụ gasịrị, onye nchụàjà bụ́ onye Juu si n’ụzọ ahụ na-agafe. O wee hụ nwoke ahụ e tiri ihe. Gịnị ka i chere o mere? O si n’akụkụ ụzọ nke ọzọ gafere, wee jewe ebe ọ na-eje. Mgbe nke ahụ gasịrị, onye ọzọ na-ekpesi okpukpe ike sikwa n’ụzọ ahụ na-agafe. Ọ bụ onye Livaị. Ọ̀ kwụsịrị? Mba, ọ kwụsịghịkwa iji nyere nwoke ahụ e tiri ihe aka. Ị pụrụ ịhụ onye nchụàjà na onye Livaị ahụ ka ha na-agbada n’ụzọ ebe ahụ.

Ma lee onye na-enyere nwoke ahụ e tiri ihe aka. Ọ bụ onye Sameria. Ọ na-enyere onye Juu ahụ aka. Ọ na-ete ya ọgwụ n’ebe ndị e merụrụ ya ahụ́. E mesịa, ọ kpọgara onye Juu ahụ n’ebe ọ pụrụ izuru ike ma gbakee.

Mgbe ọ kọsịrị akụkọ ya, Jizọs jụrụ nwoke ahụ jụrụ ya ajụjụ, sị: ‘Ònye n’ime mmadụ atọ ndị a ka i chere mere ihe dị ka onye agbata obi nke nwoke ahụ e tiri ihe? Ọ̀ bụ onye nchụàjà ahụ, onye Livaị ahụ, ka ọ̀ bụ onye Sameria ahụ?’

Nwoke ahụ zara, sị: ‘Ọ bụ onye Sameria ahụ. O nwere obiọma n’ahụ́ nwoke ahụ e tiri ihe.’

Jizọs sịrị ya: ‘Ị zatara ya. Ya mere, gaa na-emere ndị ọzọ otú ahụ o mere.’

Ụzọ Jizọs si akụzi ihe, ọ́ dịghị gị mma? Anyị pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe ndị dị mkpa, ma ọ bụrụ na anyị na-ege ntị n’ihe Jizọs kwuru n’ime Bible, ọ̀ bụ anyị apụghị?