Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 96

Jizọs Agwọọ Ndị Ọrịa

Jizọs Agwọọ Ndị Ọrịa

MGBE Jizọs na-ejegharị n’ala Izrel, ọ gwọrọ ndị ọrịa. A kọrọ akụkọ ọrụ ebube ndị a n’obodo niile dị gburugburu. Ndị mmadụ na-akpọtakwara ya ndị ngwụrọ, ndị ìsì na ndị ntị chiri na ọtụtụ ndị ọzọ na-arịa ọrịa. Jizọs na-agwọkwa ha niile.

Afọ atọ agafewo kemgbe Jọn mere Jizọs baptizim. Jizọs gwara ndịozi ya na n’isi nso, na ya ga-eje Jeruselem ebe a ga-egbu ya nakwa na ya ga-esi n’ọnwụ bilie. Ma Jizọs nọgidere na-agwọ ndị ọrịa.

Otu ụbọchị, Jizọs nọ na-ezi ihe n’ụbọchị Sabat. Sabat bụ ụbọchị izu ike nke ndị Juu. Nwaanyị a ị na-ahụ ebe a anọwo na-arịasi ọrịa ike. Ọ nọ na-ehuru ehuru ruo afọ iri na asatọ, ọ pụghị iguzozi eguzozi. Jizọs wee bikwasị ya aka, ọ malite iguzozi. A gwọọla ya!

Nke a were ndị ndú okpukpe iwe. Otu n’ime ha wee were olu ike gwa ìgwè mmadụ ahụ okwu, sị: ‘E nwere ụbọchị isii bụ́ ndị e kwesịrị ịrụ ọrụ n’ime ha, ha bụ ụbọchị ndị unu pụrụ ịbịa ka a gwọọ unu ọrịa, ọ bụghị n’ụbọchị Sabat!’

Ma Jizọs zara ha, sị: ‘Unu ndị ọjọọ. Unu niile na-atọpụ ịnyịnya ibu unu ma kpọrọ ha gaa ka ha ṅụọ mmiri n’ụbọchị Sabat. Nwaanyị a, bụ́ ogbenye, onye nọ n’ọrịa kemgbe afọ iri na asatọ, ó kwesịghị ka a gwọọ ya n’ụbọchị Sabat?’ Azịza Jizọs mere ka ihere mee ndị ọjọọ ahụ.

Mgbe nke ahụ gasịrị, Jizọs na ndịozi ya gawara Jeruselem ha na-aga. Mgbe ha ka ruru nnọọ n’azụ obodo Jeriko, ndị arịrịọ abụọ kpuru ìsì nụrụ na Jizọs na-agafe. Ha wee tie mkpu, sị: ‘Jizọs, nyere anyị aka!’

Jizọs kpọrọ ndị ìsì ahụ, jụọ ha, sị: ‘Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?’ Ha sị ya: ‘Onyenwe anyị, meghee anya anyị.’ Jizọs wee bitụ aka n’anya ha, ha wee hụ ụzọ ozugbo! Ị̀ ma ihe mere Jizọs ji rụọ ọrụ ebube ndị a? Ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, chọọkwa ka ha nwee okwukwe n’ebe ọ nọ. N’ihi ya, anyị pụkwara ijide n’aka na mgbe ọ ga na-achị dị ka Eze, ọ dịghị onye ga-arịa ọrịa ọzọ n’ụwa.