Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 98

N’elu Ugwu Oliv

N’elu Ugwu Oliv

LEE Jizọs ka ọ nọ n’elu Ugwu Oliv. Ndị ikom anọ ha na ya nọ bụ ndịozi ya. Ha bụ Andru na Pita, bụ́ ụmụnne abụọ, nakwa Jems na Jọn ndị bụ́kwa ụmụnne abụọ. Ihe ị na-ahụ n’azụ ha bụ ụlọ nsọ Chineke dị na Jeruselem.

O ruwo ụbọchị abụọ kemgbe Jizọs nọkwasịrị ịnyịnya ibu ma banye Jeruselem. Ụbọchị a bụ ụbọchị Tuesday. N’ụtụtụ ya, Jizọs nọ n’ụlọ nsọ ahụ. Ka ọ nọ n’ebe ahụ, ndị nchụàjà nwara ijide ya ka ha gbuo ya. Ma egwu tụrụ ha ime nke a n’ihi na ndị mmadụ hụrụ Jizọs n’anya.

‘Unu agwọ na ụmụ agwọ!’ ka Jizọs kpọrọ ndị ndú okpukpe ahụ. Ọ gwakwara ha na Chineke ga-enye ha ahụhụ n’ihi ihe ọjọọ niile ha mere. Mgbe nke ahụ gasịrị, Jizọs rịgotara n’Ugwu Oliv, ndịozi anọ ndị a wee malite ịjụ ya ajụjụ. Ị̀ ma ihe ha na-ajụ Jizọs?

Ndịozi a na-ajụ ya ajụjụ banyere ọdịnihu. Ha maara na Jizọs ga-akwụsị ihe ọjọọ niile a na-eme n’ụwa. Ma ha chọrọ ịmata mgbe nke a ga-eme. Olee mgbe Jizọs ga-abịa ọzọ ịchị dị ka Eze?

Jizọs maara na ụmụazụ ya nọ n’ụwa agaghị enwe ike ịhụ ya ma ọ bịa ọzọ. Ọ bụ n’ihi na ọ ga-anọ n’eluigwe, ha agaghịkwa enwe ike ịhụ ya n’ebe ahụ. N’ihi ya, Jizọs gwara ndịozi ya ihe ụfọdụ ga na-eme n’ụwa mgbe ọ ga na-achị dị ka Eze n’eluigwe. Gịnị bụ ụfọdụ n’ihe ndị a?

Jizọs sịrị na a ga-enwe nnukwu agha dị iche iche, ọtụtụ mmadụ ga na-arịa ọrịa, nọrọkwa n’agụụ, mpụ ga-aka njọ, a ga-enwekwa oké ala ọma jijiji. Jizọs kwukwara na a ga-ekwusa ozi ọma alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa. Ànyị ahụwo ka ihe ndị a na-eme n’oge anyị a? Ee! Ọ pụrụ ido anyị anya na Jizọs na-achị n’eluigwe ugbu a. N’isi nso, ọ ga-akwụsị ihe ọjọọ niile dị n’elu ala.