Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 99

N’ime Ụlọ Dị n’Ụlọ Elu

N’ime Ụlọ Dị n’Ụlọ Elu

Ọ BỤ abalị Thursday ugbu a, ka ụbọchị abụọ gasịrịla. Jizọs na ndịozi iri na abụọ ya bara n’ime ụlọ elu ukwu a iri nri Ememe Ngabiga. Nwoke ahụ ị na-ahụ, nke na-apụ apụ, bụ Judas Iskarịọt. Ọ na-eje ịgwa ndị nchụàjà otú ha ga-esi jide Jizọs.

Ọ ka bụ nnọọ ụnyaahụ ya ka Judas jekwuuru ha wee jụọ ha, sị: ‘Gịnị ka unu ga-enye m ma m nyere unu aka jide Jizọs?’ Ha sịrị ya: ‘Mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ.’ N’ihi ya, Judas na-eje ịhụ ha ka o wee duru ha bịakwute Jizọs. Nke ahụ ọ́ bụghị ihe jọgburu onwe ya?

Ha erisịwo nri Ememe Ngabiga ahụ. Jizọs wee malite nri ọzọ pụrụ iche ugbu a. O nyere ndịozi ya ogbe achịcha, wee, sị: ‘Rienụ ya, n’ihi na nke a pụtara ahụ́ m nke a gaje inye n’ihi unu.’ O nyekwa ha iko mmanya, sị ha: ‘Ṅụọnụ ya, n’ihi na nke a pụtara ọbara m, nke a na-awụsị n’ihi unu.’ Bible na-akpọ nke a ‘nri anyasị nke Onyenwe anyị.’

Ụmụ Izrel riri nri Ememe Ngabiga iji chetara ha mgbe mmụọ ozi Chineke ‘gabigara’ ụlọ ha n’Ijipt, ma gbuo ụmụ e buru ụzọ mụọ n’ụlọ ndị Ijipt. Ma ugbu a, Jizọs chọrọ ka ụmụazụ ya na-echeta ya, na-echetakwa otú o si nye ndụ ya n’ihi ha. Ọ bụkwa ya mere o ji gwa ha ka ha na-eri nri a pụrụ iche kwa afọ.

Mgbe ha risịrị Nri Anyasị nke Onyenwe anyị, Jizọs gwara ndịozi ya ka ha nwee obi ike ma dịkwa ike n’okwukwe. N’ikpeazụ, ha bụkuru Chineke abụ, wee pụọ. Chi ejimiela mgbe ahụ. Ka anyị lee ebe ha gara.