Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 100

Mgbe Jizọs Nọ n’Ime Ubi A Gbara Ogige

Mgbe Jizọs Nọ n’Ime Ubi A Gbara Ogige

MGBE ha si n’ime ụlọ ahụ dị n’ụlọ elu ahụ pụta, Jizọs na ndịozi ya jere n’ogige Getsemeni. Ha abịawo ebe a ọtụtụ ugboro n’oge gara aga. Jizọs gwara ha ugbu a ka ha mụrụ anya, na-ekpekwa ekpere. Jizọs wee pụtụ n’ihu nke nta, kpudo ihu ya n’ala iji kpee ekpere.

Mgbe nke ahụ gasịrị, Jizọs bịaghachiri n’ebe ndịozi ya nọ. Gịnị ka i chere ha na-eme? Ha na-arahụ ụra! Ugboro atọ ka Jizọs gwara ha ka ha mụrụ anya, ma n’oge ọ bụla ọ bịara, ọ hụrụ ha ka ha na-arahụ ụra. ‘Olee otú unu ga-esi na-arahụ ụra n’ụdị oge a?’ ka Jizọs jụrụ ha n’oge ikpeazụ ọ bịaghachiri. ‘Oge eruwo ka e nyefee m n’aka ndị iro m.’

N’oge ahụ, a nụrụ mkpọtụ nke oké ìgwè mmadụ. Leenụ! Ndị ahụ ji mma agha na osisi na-abịa! Ha jikwa ọwá ndị a mụnyere ọkụ na ha iji na-enye ha ìhè. Mgbe ha ruru nso, otu onye wee si n’ìgwè mmadụ ahụ pụta jekwuru Jizọs. O wee sutu ya ọnụ, dị ka ị na-ahụ ebe a. Nwoke ahụ bụ Judas Iskarịọt! Gịnị mere o ji sutu Jizọs ọnụ?

Jizọs jụrụ ya, sị: ‘Judas, ì ji isutu ọnụ na-arara m nye?’ Nsutu ọnụ ahụ bụ ihe mgbaàmà. O mere ka ndị so Judas mara na ọ bụ ya bụ Jizọs ahụ ha na-achọ. Ndị iro ya wee pụta ijide ya. Ma Pita agajeghị ịgbachi nnọọ nkịtị ha eduru Jizọs. Ọ mịpụtara mma agha o ji wee gbuo onye nọ ya nso. Mma agha ahụ egbuteghị isi nwoke ahụ, ma o bepụrụ ntị aka nri ya. Ma Jizọs metụrụ ntị nwoke ahụ aka, wee gwọọ ya.

Jizọs ewee gwa Pita, sị: ‘Mịghachi mma agha gị n’ọbọ ya. Í cheghị na m pụrụ ịrịọ Nna m ka o zite ọtụtụ puku ndị mmụọ ozi ka ha bịa zọpụta m?’ Ee, Jizọs pụrụ ime otú ahụ! Ma ọ rịọghị Chineke ka o zite mmụọ ozi ọ bụla, n’ihi na ọ maara na oge eruwo mgbe ndị iro ya ga-ejide ya. N’ihi ya, o kwere ka ha duru ya pụọ. Ka anyị hụ ihe a ga-eme Jizọs ugbu a.