Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 101

E Gbuo Jizọs

E Gbuo Jizọs

LEE ihe ọjọọ nke na-emenụ! A na-egbu Jizọs. Ha akpọgidewo ya n’osisi. E ji ntu kpọgide aka na ụkwụ ya. Gịnị mere e ji mee Jizọs ihe a?

Ọ bụ n’ihi na ụfọdụ ndị kpọrọ ya asị. Ị̀ ma ndị ha bụ? Otu n’ime ha bụ ajọ mmụọ ozi ahụ bụ́ Setan Ekwensu. Ọ bụ ya mere ka Adam na Iv nupụrụ Jehova isi. Ọ bụkwa Setan kpaliri ndị iro Jizọs ime oké ihe ọjọọ a.

Ọbụna tupu a kpọgide Jizọs n’osisi ebe a, ndị iro ya rụsara ya arụrụala. Ì chetara otú ha si bịa n’ogige Getsemeni duru ya pụọ? Ole ndị bụ ndị iro ahụ? Ha bụ ndị ndú okpukpe. Ka anyị hụ ihe ọzọ merenụ.

Mgbe ndị ndú okpukpe duuru Jizọs, ndịozi ya gbara ọsọ. Ha hapụrụ Jizọs n’aka ndị iro ya n’ihi ụjọ. Ma ndịozi bụ́ Pita na Jọn agbateghị aka. Ha sooro ha n’azụ iji hụ ihe ga-eme Jizọs.

Ndị nchụàjà ahụ duuru Jizọs jekwuru otu agadi nwoke aha ya bụ Anas, onye bụbu nnukwu onye nchụàjà. Ìgwè mmadụ ahụ anọghị ọdụ n’ebe ahụ. Ha duuru Jizọs gazie n’ụlọ Keifas, onye bụ́ nnukwu onye nchụàjà ugbu a. Ọtụtụ ndị ndú okpukpe zukọrọ n’ụlọ ya.

Ha kpere ya ikpe ebe ahụ n’ụlọ Keifas. A kpọtara ndị mmadụ ikwu okwu ụgha megide Jizọs. Ndị ndú okpukpe ahụ niile sịrị: ‘Jizọs kwesịrị ogbugbu.’ Ha bụrụ ya asọ mmiri n’ihu, tiekwa ya ọkpọ.

Mgbe ihe a niile na-eme, Pita nọ n’èzí ogige ụlọ ahụ. Ọ bụ abalị oyi na-atụ, ndị mmadụ wee kwanye ọkụ. Mgbe ha nọ gburugburu na-anya ọkụ, otu nwa agbọghọ bụ́ odibo lere Pita anya wee sị: ‘Nwoke a na Jizọs nọrọ.’

‘Ee e, mụ na ya anọghị!’ ka Pita zara.

Ugboro atọ ka ndị mmadụ gwara Pita na ya na Jizọs nọrọ. Ma Pita gọrọ agụgọ n’oge nke ọ bụla. Na nke ugboro atọ o kwuru nke a, Jizọs wee tụgharịa lee ya anya. O wutere Pita n’ihi ụgha ndị a ọ ghara, o wee pụọ kwaa ákwá.

Mgbe anyanwụ malitere ịwapụta n’ụtụtụ Friday, ndị nchụàjà duuru Jizọs gaa n’ebe buru ibu ha na-enwe nzukọ ha, bụ́ ụlọ nzukọ Sanhedrin. N’ebe ahụ ka ha nọ kwurịtaa ihe ha ga-eme ya. Ha wee duru ya jekwuru Pọntiọs Paịlet, bụ́ onye na-achị ógbè Judia.

Ndị nchụàjà sịrị Paịlet: ‘Onye a bụ ajọ mmadụ. O kwesịrị ogbugbu.’ Mgbe ọ jụsịrị Jizọs ajụjụ, Paịlet sịrị ha: ‘Ahụghị m ihe ọjọọ ọ bụla o mere.’ Paịlet wee ziga Jizọs na nke Herọd Antipas. Herọd bụ onye na-achị Galili, ma ọ nọ na Jeruselem. Herọd ahụghịkwa ihe ọjọọ Jizọs mere, o wee zighachiri ya Paịlet.

Paịlet chọrọ ịhapụ Jizọs. Ma ndị iro Jizọs chọrọ ka a hapụ onye mkpọrọ ọzọ kama ịhapụ Jizọs. Onye ha chọrọ ka a hapụ bụ Barabas, onye ohi. O ruwo ihe dị ka n’etiti ehihie ugbu a mgbe Paịlet kpọpụtara Jizọs n’èzí. O wee sị ha: ‘Leenụ! Eze unu!’ Ma ndị isi nchụàjà ahụ tiri mkpu, sị: ‘Kpọrọnụ ya! Gbuonụ ya! Gbuonụ ya.’ Ya mere, Paịlet hapụrụ Barabas ka ọ laa, ha duru Jizọs jee igbu ya.

N’ehihie Friday, a kpọgidere Jizọs n’osisi. A kpọgidekwara ndị omekome abụọ n’osisi n’ebe ahụ, ma ị pụghị ịhụ ha na foto a. Otu nọ n’aka nri Jizọs, nke ọzọ nọ n’aka ekpe ya. A hapụkwara ha n’ebe ahụ ka ha nwụọ. N’oge na-adịghị anya tupu Jizọs anwụọ, otu n’ime ndị omekome ahụ sịrị ya: ‘Cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.’ Jizọs wee sị ya: ‘M na-ekwe gị nkwa na mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.’

Nke ahụ ọ́ bụghị nkwa dị ebube? Ị̀ ma paradaịs Jizọs na-ekwu okwu ya? Olee ebe paradaịs ahụ nke Chineke mere na mbụ dịbu? Ọ bụ n’elu ala. Mgbe Jizọs ga na-achịkwa dị ka eze n’eluigwe, ọ ga-eme ka nwoke ahụ dịghachi ndụ iji biri na Paradaịs ọhụrụ n’elu ala. Nke ahụ ọ́ dịghị eme anyị obi ụtọ?