Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 102

Jizọs Dị Ndụ

Jizọs Dị Ndụ

Ị̀ MA onye nwaanyị a na ndị ikom abụọ ahụ bụ? Nwaanyị a bụ Meri Magdalin, enyi Jizọs. Ndị ikom ahụ yi uwe ọcha bụ ndị mmụọ ozi. Ime ụlọ nta a Meri na-eleba anya bụ ebe e debere ozu Jizọs mgbe ọ nwụrụ. A na-akpọ ya ili. Ma ozu ahụ adịghịzi n’ime ya ugbu a! Ònye buuru ya? Ka anyị hụ.

Mgbe Jizọs nwụrụ, ndị nchụàjà sịrị Paịlet: ‘Mgbe Jizọs nọ ndụ, ọ sịrị na a ga-akpọlite ya ma ụbọchị atọ gasịa. Ya mere, nye iwu ka e chewa ili ahụ nche. Ka ndị na-eso ụzọ ya wee ghara ịbịa zuru ozu ya, wee kwuo na a kpọlitewo ya n’ọnwụ!’ Paịlet wee gwa ndị nchụàjà ka ha ziga ndị agha ka ha na-eche ili ahụ nche.

N’isi ụtụtụ ụbọchị nke atọ mgbe Jizọs nwụsịrị, mmụọ ozi Jehova bịara na mberede. O nupụrụ nkume e ji dochie ọnụ ili ahụ. Ụjọ tụrụ nnọọ ndị agha ahụ nke na ha apụghị imegharị ahụ́. N’ikpeazụ, mgbe ha lebara anya n’ili ahụ, ozu ahụ adịghịzi n’ime ya! Ụfọdụ ndị agha ahụ bara n’ime obodo wee gwa ndị nchụàjà. Ị̀ ma ihe ndị nchụàjà ọjọọ ahụ mere? Ha nyere ndị agha ahụ ego ka ha ghaa ụgha. Ha gwara ndị agha ahụ: ‘Sịnụ na ndị na-eso ụzọ ya bịara n’abalị mgbe anyị na-ehi ụra zuru ozu ya.’

Ụfọdụ ndị inyom bụ́ ndị enyi Jizọs gara n’ili ahụ. O juru ha nnọọ anya na ili ahụ tọgbọ nkịtị! Meri Magdalin gbapụrụ ije kọọrọ Pita na Jọn. Na mberede, ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha pụtara n’ihu ndị inyom ndị ọzọ ahụ. Ha jụrụ ha, sị: ‘Gịnị mere unu na-achọ Jizọs n’ebe a? A kpọlitewo ya. Jeenụ ọsọ ọsọ gwa ndị na-eso ụzọ ya.’ Ndị inyom ahụ gbasiri ọsọ ike! Ma otu nwoke kwụsịrị ha n’ụzọ. Ị̀ ma onye ọ bụ? Ọ bụ Jizọs! Ọ sị ha: ‘Jeenụ gwa ndị na-eso ụzọ m.’

Mgbe ndị inyom ahụ gwara ndị na-eso ụzọ Jizọs na Jizọs dị ndụ, na ha ahụwo ya, o siiri ha ike ikwere. Pita na Jọn gbagara n’ili ahụ iji anya ha hụ, ma ili ahụ tọgbọ nkịtị! Mgbe Pita na Jọn lara, Meri Magdalin, bụ́ onye lọghachiteworonụ n’ili ahụ, nọgidere n’ebe ahụ. Mgbe ahụ ka o lebara anya n’ime ili ahụ wee hụ ndị mmụọ ozi abụọ ahụ.’

Ị̀ ma ihe mere ahụ́ Jizọs? Chineke mere ka ọ pụọ n’anya. Chineke emeghị ka Jizọs dịghachi ndụ n’anụ ahụ́ ahụ o ji nwụọ. O nyere Jizọs ahụ́ ọhụrụ nke mmụọ, dị ka ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe nwere. Ma iji gosi ndị na-eso ụzọ ya na ya dị ndụ, Jizọs pụrụ iyikwasị ahụ́ nke ndị mmadụ pụrụ ịhụ anya, dị ka anyị gaje ịhụ.