Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 103

N’ime Ụlọ A Kpọchiri Akpọchi

N’ime Ụlọ A Kpọchiri Akpọchi

MGBE Pita na Jọn hapụsịrị ebe ahụ ozu Jizọs dịbu, ya afọdụzie naanị Meri. Meri malitere ịkwa ákwá. O wee hulata ala leba anya n’ime ili ahụ, dị ka anyị hụrụ na foto bu nke a ụzọ. Ọ hụrụ ndị mmụọ ozi abụọ n’ime ebe ahụ! Ha wee jụọ ya, sị: ‘Gịnị mere i ji na-akwa ákwá?’

Meri azaa, sị: ‘Ha ebupụwo Onyenwe m, amaghịkwa m ebe ha tọgbọrọ ya.’ Meri wee tụgharịa hụ otu nwoke. Nwoke ahụ wee jụọ ya, sị: ‘Ònye ka ị na-achọ?’

Meri chere na nwoke ahụ bụ onye na-elekọta ebe ahụ, nakwa na ma eleghị anya ọ bụ ya bupụrụ ozu Jizọs. N’ihi ya, ọ sịrị: ‘Ọ bụrụ na i bupụwo ya, gwa m ebe i debere ya.’ Ma n’ezie, nwoke ahụ bụ Jizọs. O yikwasịrị ahụ́ nke Meri na-amataghị. Ma mgbe Jizọs kpọrọ Meri aha, Meri matara na ọ bụ Jizọs. Ọ gbapụrụ ọsọ ịkọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs: ‘Ahụwo m Onyenwe anyị!’

Mgbe e mesịrị n’ụbọchị ahụ, ka ndị na-eso ụzọ abụọ na-aga obodo nta bụ́ Emeọs, otu nwoke sonyeere ha. Ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs nọ ná mwute n’ihi na e gbuwo Jizọs. Ma ka ha na-aga, nwoke ahụ kọwara ọtụtụ ihe dị na Bible bụ́ nke mere ka obi dịtụ ha ụtọ. E mesịa, mgbe ha kwụsịrị iri nri, ha matara na nwoke ahụ bụ Jizọs. Jizọs wee pụọ n’anya ha, ma mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya laghachiri Jeruselem ọsọ ọsọ, ịkọrọ ndịozi banyere ya.

Mgbe nke a na-eme, Jizọs pụtara n’ihu Pita. Ndị ọzọ nwere obi ụtọ mgbe ha nụrụ nke a. Mmadụ abụọ ndị ahụ na-eso ụzọ ya gara Jeruselem iji chọọ ndịozi. Ha gwara ha otú Jizọs si mee ka ha hụ ya n’ụzọ. Mgbe ha nọ na-akọ nke a, ị̀ ma ihe dị ịtụnanya nke merenụ?

Lee anya na foto a. Jizọs batara n’ime ụlọ ebe ahụ kpọmkwem, n’agbanyeghị na a kpọchiri ụzọ akpọchi. Ndị na-eso ụzọ ya nwere nnọọ obi ụtọ! Ụbọchị ahụ ọ́ bụghị ụbọchị aṅụrị? Ị̀ pụrụ ịgụta ugboro ole Jizọs meworo ka ndị na-eso ụzọ ya hụ ya anya ruo ugbu a? Ị̀ gụtara ugboro ise?

Tọmọs onyeozi anọghị ya mgbe Jizọs mere ka ha hụ ya. Ndị na-eso ụzọ Jizọs wee sị ya: ‘Anyị ahụwo Onyenwe anyị!’ Ma Tọmọs sịrị na ya ga-ahụ Jizọs n’onwe ya tupu ya ekwere. Ụbọchị asatọ mgbe nke a gasịrị, ụmụazụ ya nọkọrọ ọzọ n’ime ụlọ a kpọchiri akpọchi, ma n’oge a, Tọmọs nọ ya. Na mberede, Jizọs batara n’ime ụlọ ahụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka Tọmọs kweere.