Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 104

Jizọs Alaghachi n’Eluigwe

Jizọs Alaghachi n’Eluigwe

KA ỤBỌCHỊ na-aga, Jizọs gosiri ụmụazụ ya onwe ya ọtụtụ ugboro. N’otu oge, ihe dị ka narị ndị na-eso ụzọ ya ise hụrụ ya. Mgbe ọ pụtara n’ihu ha, ị̀ ma ihe ọ gwara ha okwu ya? Ọ bụ Alaeze Chineke. Jehova zitere Jizọs n’ụwa izi ihe banyere Alaeze ahụ. Ọ nọgidekwara na-eme nke a ọbụna mgbe a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ.

Ì chetara ihe alaeze Chineke bụ? Alaeze ahụ bụ ọchịchị Chineke nke dị n’eluigwe, Jizọs bụkwa Onye Chineke họpụtara ịbụ eze. Dị ka anyị mụworo, Jizọs gosiri ụdị eze ọma nke ọ ga-abụ site n’inye ndị agụụ na-agụ nri, ịgwọ ndị ọrịa, na ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ!

Ya mere, mgbe Jizọs ga-abụ eze n’eluigwe ruo otu puku afọ, gịnị ka ụwa ga-adị ka ya? A ga-eme ka ụwa dum bụrụ paradaịs nke mara mma. Agha ma ọ bụ mmebi iwu ma ọ bụ ọrịa ma ọ bụ ọbụna ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Anyị ma na nke a bụ eziokwu n’ihi na Chineke mere ụwa ịbụ paradaịs nke ndị mmadụ ga-enwe obi ụtọ na ya. Ọ bụ ya mere o ji mee ogige Iden ná mmalite. Jizọs ga-ahụkwa na e mezuru ihe Chineke chọrọ ka e mee.

Oge eruwo ka Jizọs laghachi n’eluigwe. Ruo ụbọchị iri anọ, Jizọs anọwo na-egosi ndị na-eso ụzọ ya onwe ya. Ha wee mara na ọ dị ndụ ọzọ. Ma tupu ọ hapụ ha, ọ gwara ha, sị: ‘Nọdụnụ na Jeruselem ruo mgbe unu ga-anata mmụọ nsọ.’ Mmụọ nsọ bụ ike ọrụ Chineke nke dị ka ifufe, ma ọ ga-enyere ụmụazụ ya aka ime uche Chineke. N’ikpeazụ, Jizọs sịrị ha: ‘Unu ga-ekwusa banyere m ruo n’akụkụ kasị anya nke ụwa.’

Mgbe Jizọs kwusịrị nke a, ihe dị ịtụnanya mere. Ọ malitere ịrịgo n’eluigwe, dị ka ị pụrụ ịhụ n’ebe a. Igwe ojii wee kpuchie ya, mee ka ndị na-eso ụzọ ya gharazie ịhụ ya. Jizọs gara eluigwe, o wee malite ịchị ụmụazụ ya nọ n’ụwa site n’ebe ahụ.