Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 105

Ha Nọ Na Jeruselem Na-echere

Ha Nọ Na Jeruselem Na-echere

NDỊ a nọ n’ebe a bụ ụmụazụ Jizọs. Ha erubeworo ya isi ma nọrọ na Jeruselem. Mgbe ha na-echere n’otu ebe, oké ụzụ jupụtara n’ụlọ ahụ ha nọ na ya. Ọ na-ada ka oké ifufe. A malitere ịhụ ire ọkụ n’elu isi onye nke ọ bụla n’ime ndị ahụ na-eso ụzọ. Ị̀ na-ahụ ọkụ ahụ n’elu isi onye nke ọ bụla n’ime ha? Gịnị ka ọ pụtara?

Ọ bụ ọrụ ebube! Jizọs alaghachikwuruwo Nna ya n’eluigwe, ọ na-awụsakwa ndị na-eso ụzọ ya mmụọ nsọ Chineke. Ị̀ ma ihe mmụọ ahụ na-eme ka ha mee? Ha niile malitere ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche.

Ọtụtụ ndị nọ na Jeruselem nụrụ ụzụ ahụ na-ada ka nke oké ifufe, ha wee bịa ịhụ ihe na-emenụ. Ụfọdụ n’ime ha si ná mba ndị ọzọ, ha bịara maka ememe ndị Izrel bụ́ Pentikọst. Lee ihe ijuanya ndị ahụ bịara abịa nwere! Ha nụrụ ka ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ekwu okwu n’asụsụ ha banyere ihe ndị dị ebube Chineke meworo.

Ndị ọbịa ahụ sịrị: ‘Ndị a niile bụ ndị Galili. Olee otú ha sizi nwee ike ikwu okwu n’asụsụ ndị a dị iche iche a na-asụ n’ala niile ebe anyị si bịa?’

Pita wee guzoo ọtọ iji kọwaara ha ihe kpatara ya. O welie olu ya gwa ha ụzọ e si gbuo Jizọs, na otú Jehova si mee ka o si n’ọnwụ bilie. ‘Jizọs nọ n’eluigwe ugbu a n’aka nri Chineke,’ ka Pita gwara ha. ‘Ọ wụsawokwa anyị mmụọ nsọ ahụ o kwere anyị ná nkwa. Ọ bụ ya mere unu ji na-anụ ma na-ahụ ọrụ ebube ndị a.’

Ma mgbe Pita na-ekwu ihe ndị a, ọtụtụ n’ime ndị ọ na-agwa okwu nwere mwute banyere ihe e mere Jizọs. Ha jụrụ, sị: ‘Gịnị ka anyị ga-eme?’ Pita sịrị ha: ‘Ọ dị mkpa ka unu gbanwee omume unu ma mee baptizim.’ N’ihi ya, n’ụbọchị ahụ, ihe dị ka puku mmadụ atọ mere baptizim, ha ewee ghọọ ụmụazụ Jizọs.