Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 107

A Tụọ Stivin Nkume

A Tụọ Stivin Nkume

NWOKE nke gburu ikpere n’ala ebe a bụ Stivin. Ọ bụ ezigbo onye na-eso ụzọ Jizọs. Ma lee ihe na-eme ya ugbu a! Ndị ikom a na-atụ ya nkume. Gịnị mere ha ji kpọọ Stivin asị nke ukwuu ruo n’ókè nke ime ya ihe a jọgburu onwe ya? Ka anyị hụ.

Chineke anọwo na-enyere Stivin aka ịrụ ọrụ ebube dị iche iche. Nke a adịghị ndị ikom a mma, ha na ya wee malite ịrụrịta ụka banyere nkụzi ọ na-akụziri ndị mmadụ eziokwu. Ma Chineke nyere Stivin amamihe dị ukwuu, o wee gosi na ndị ikom ahụ anọwo na-ezi ozizi ụgha. Nke a were ha iwe karị. N’ihi ya, ha jidere ya wee kpọọ ndị mmadụ ka ha boo ya ebubo ụgha dị iche iche.

Onyeisi nchụàjà wee jụọ Stivin, sị: ‘Ihe ndị a hà bụ eziokwu?’ Stivin zara site n’ikwu okwu ọma sitere na Bible. Mgbe ọ na-emechi okwu ya, ọ kọrọ otú ndị ajọ mmadụ si kpọọ ndị amụma Jehova asị n’oge gara aga. O wee sị ha: ‘Unu yiri ajọ ndị ahụ. Unu gburu ohu Chineke bụ́ Jizọs, unu adịghịkwa erube isi n’iwu Chineke.’

Nke a mere ka ezigbo iwe wee ndị ndú okpukpe ahụ! Ha tara ikikere ezé n’oké iwe. Ma Stivin weliri isi ya elu, sị: ‘Lee! Ana m ahụ Jizọs ka ọ na-eguzo n’aka nri Chineke n’eluigwe.’ Mgbe o kwuru nke a, ha kpuchiri aka ná ntị ha ma wakwuru Stivin. Ha jidere ya, kpụpụ ya n’azụ obodo.

N’ebe a, ha yipụrụ uwe elu ha, were ha nye nwa okorobịa bụ́ Sọl ka o jide. Ị̀ na-ahụ Sọl? Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị ikom ahụ malitere ịtụ Stivin nkume. Stivin wee gbuo ikpere n’ala dị ka ị pụrụ ịhụ, wee kpegara Chineke ekpere, na-asị: ‘Jehova, enyela ha ahụhụ n’ihi ihe ọjọọ nke a.’ Ọ maara na ndị ndú okpukpe eduhiewo ụfọdụ n’ime ha ime nke a. Mgbe nke a gasịrị, Stivin nwụrụ.

Mgbe mmadụ mere gị ihe ọjọọ, ị̀ na-anwa imegwara, ma ọ bụ na-arịọ Chineke ka o megwata ha? Ọ bụghị ihe Stivin ma ọ bụ Jizọs mere. Ha nwere obiọma ọbụna n’ebe ndị kpọrọ ha asị nọ. Ka anyị na-agbalị iṅomi ihe nlereanya ha.