Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 110

Timoti​—⁠Onye Inyeaka Ọhụrụ nke Pọl

Timoti​—⁠Onye Inyeaka Ọhụrụ nke Pọl

NWA okorobịa ị na-ahụ n’ebe a nke ya na Pọl nọ bụ Timoti. Timoti na ndị ezinụlọ ya bi na Listra. Aha nne ya bụ Yunis, aha nne nne ya abụrụ Lọịs.

Nke a bụ nke ugboro atọ Pọl na-abịa Listra. Ihe dị ka otu afọ gara aga, Pọl na Banabas jere ebe ahụ na nke mbụ ya n’oge ha mere njem ozi ọma ha. Ma ugbu a, Pọl na enyi ya bụ́ Saịlas abịaghachila.

Ị̀ ma ihe Pọl na-agwa Timoti? Ọ na-ajụ ya, sị: ‘Ọ̀ ga-amasị gị isonyere mụ na Saịlas? Ị pụrụ inyere anyị aka n’izi ndị nọ ebe ndị dịpụrụ adịpụ ozi ọma.’

Timoti zara ya, sị: ‘Ee, ọ ga-amasị m ije.’ Ọ dịghị anya, Timoti wee hapụ ezinụlọ ya soro Pọl na Saịlas. Ma tupu anyị amụọ ihe banyere njem ha, ka anyị chọpụta ihe ndị nọworo na-eme Pọl. O ruwo ihe dị ka afọ iri na asaa kemgbe Jizọs mere ka Pọl hụ ya mgbe ọ na-eje Damaskọs.

Cheta na Pọl jere Damaskọs ịkpagbu ndị na-eso ụzọ Jizọs, ma ugbu a, ya onwe ya bụ onye na-eso ụzọ Jizọs! Mgbe e mesịrị, ụfọdụ ndị iro gbara izu igbu Pọl n’ihi na ha enweghị mmasị n’ihe ọ na-ezi banyere Jizọs. Ma ndị na-eso ụzọ Jizọs nyeere Pọl aka ịgbapụ. Ha tinyere ya n’ime nkata, buda ya n’azụ mgbidi obodo ahụ.

Ka e mesịrị, Pọl jere Antiọk izi ozi ọma. Ọ bụ n’ebe ahụ ka e buru ụzọ kpọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, Ndị Kraịst. Ma e si n’Antiọk zipụ Pọl na Banabas maka njem nke ikwusa ozi ọma ná mba ndị dị anya. Otu n’ime obodo ndị ha jere bụ Listra, bụ́ obodo Timoti.

Mgbe otu afọ gasịrị, Pọl jeghachiri Listra nke ugboro abụọ ya. Mgbe Timoti so Pọl na Saịlas pụọ, ị̀ ma ebe ha jere? Lee anya na map a ka anyị mata ụfọdụ n’ime ebe ndị ahụ.

Nke mbụ, ha jere Aịkoniọm nke dị nso, jeekwa obodo nke abụọ a na-akpọ Antiọk. Mgbe e mesịrị, ha jere Troas, si ya gaa Filipaị, Tesalonaịka, na Biria. Ị̀ na-ahụ Atens na map ahụ? Pọl ziri ozi ọma n’ebe ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ha nọrọ otu afọ na ọkara na-eme nkwusa na Kọrint. Ka e mesịrị, ha kwụsịtụrụ n’Efesọs. Ha si ebe ahụ baa ụgbọ mmiri laghachi Sesaria, wee jeruo Antiọk, bụ́ ebe Pọl nọrọ.

Timoti jere ọtụtụ narị kilomita, na-enyere Pọl aka ikwusa “ozi ọma” na iguzobe ọtụtụ ọgbakọ Ndị Kraịst. Mgbe i tolitere, ị̀ ga-abụ ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi dị ka Timoti?