Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 111

Nwata Nwoke Ụra Buuru

Nwata Nwoke Ụra Buuru

EWOO! Gịnị na-eme n’ebe a? Nwata nwoke ahụ nke dina ala, ò merụrụ nnukwu ahụ́? Lee! otu n’ime ndị si n’ụlọ ahụ na-apụta bụ Pọl! Ị̀ na-ahụkwa Timoti n’ebe ahụ? Nwata nwoke ahụ ò si na windo daa?

Ee, nke ahụ bụ nnọọ ihe merenụ. Pọl nọ na-agwa ndị na-eso ụzọ okwu na Troas. Ọ ma na ọ gaghị ahụ ha ọzọ ruo ogologo oge, n’ihi na ọ ga-aba n’ụgbọ mmiri echi wee mee njem. N’ihi ya, ọ nọgidere na-agwa ha okwu ruo n’etiti abalị.

Nwata nwoke a a na-akpọ Yutikọs nọdụrụ ala na windo, ụra wee buru ya. O si na windo ụlọ elu dị okpukpu abụọ daa! Ị hụzielanụ ihe mere ndị a ji nwee mwute. Mgbe ndị ikom ahụ kulitere nwata nwoke ahụ, ihe ha na-atụ ụjọ ya emeela. Ọ nwụwo!

Mgbe Pọl hụrụ na nwatakịrị ahụ anwụwo, o dinaara n’ahụ́ ya, makụọ ya. O wee sị ha: ‘Unu echegbula onwe unu. Ọ dịwo ya mma!’ Nke ahụ bụkwa eziokwu! Ọ bụ ọrụ ebube! Pọl emewo ka ọ dị ndụ ọzọ! Ìgwè mmadụ ahụ wee jupụta n’oké ọṅụ.

Ha niile rigooro n’ụlọ elu ahụ ọzọ, wee rie ihe. Pọl nọgidere na-ekwu okwu ruo mgbe chi bọrọ. Ma Yutikọs arahụghị ụra ọzọ! Mgbe e mesịrị, Pọl na Timoti na ndị so ha eme njem ahụ bara n’ụgbọ mmiri. Ị̀ ma ebe ha na-eje?

Pọl ka mesịrị nnọọ njem ozi ọma nke atọ ya, ọ na-alakwa ala. Na njem a, Pọl anọwo afọ atọ n’obodo Efesọs naanị. N’ihi ya, ọ nọrọ ọdụ na njem nke a karịa njem nke abụọ ya.

Mgbe ha hapụrụ Troas, ụgbọ ha kwụsịrị nwa oge na Militọs. Ebe ọ bụ na Efesọs dị naanị kilomita ole na ole, Pọl ziri ozi ka a kpọọ ndị okenye nke ọgbakọ Efesọs ka ha bịa Militọs ka ọ gwa ha okwu nke ikpeazụ. Ma mgbe oge ruru ka ụgbọ ahụ pụọ, o wutere ndị okenye ahụ nke ukwuu ịhụ ka Pọl na-ala!

N’ikpeazụ, ụgbọ mmiri ahụ bịaruru Sesaria. Mgbe Pọl nọ n’ebe ahụ n’ụlọ Filip onye na-eso ụzọ, Agabọs onye amụma dọrọ Pọl aka ná ntị. O kwuru na a ga-atụ Pọl mkpọrọ ma ọ gaa Jeruselem. N’eziokwu eziokwu, ọ bụ ihe mere. Mgbe ọ nọsịrị afọ abụọ n’ụlọ mkpọrọ na Sesaria, e zigara Pọl na Rom ka e kpee ya ikpe n’ihu Siza, onye ọchịchị Rom. Ka anyị lee ihe mere mgbe ọ na-eje Rom.