Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 8

Ihe Baịbụl Kwuru Ga-emezu

Ihe Baịbụl Kwuru Ga-emezu

Ọ bụghị naanị ihe ndị mere n’oge gara aga ka Bible kọrọ, kamakwa, ọ kọrọ ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ụmụ mmadụ apụghị ịkọ ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ọ bụ ya mere anyị ji mara na Bible sitere n’aka Chineke. Gịnị ka Bible na-ekwu banyere ọdịnihu?

Ọ na-akọ banyere otu oké agha nke Chineke. N’agha a, Chineke ga-ekpochapụ ajọ omume na ndị ajọ mmadụ niile n’ụwa, ma ọ ga-echebe ndị na-efe ya. Jizọs Kraịst, bụ́ eze nke Chineke, ga-ahụ na ndị ohu Chineke nwetara udo na obi ụtọ, nakwa na ha agaghị arịa ọrịa ọzọ ma ọ bụ nwụọ anwụọ.

Anyị kwesịrị inwe obi ụtọ na Chineke ga-eweta paradaịs ọhụrụ n’ụwa, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị? Ma ọ dị ihe anyị ga-emerịrị ma ọ bụrụ na anyị ga-ebi na paradaịs ahụ. N’akụkọ ikpeazụ nke akwụkwọ a, anyị ga-amụta ihe anyị ga-emerịrị iji soro nweta ihe ọma niile nke Chineke kwadebeere ndị na-efe ya ofufe. Ya mere, gụọ NKEBI NKE 8 ka ị hụ ihe Bible na-ebu n’amụma banyere ọdịnihu.

 

NÁ NKEBI A

AKỤKỌ NKE 114

Ngwụsị Nke Ihe Ọjọọ Niile

Gịnị mere Chineke ji zipụ ndị agha ya si n’eluigwe ka Jizọs duru ha lụọ agha Amagedọn?

AKỤKỌ NKE 115

Paradaịs Ọhụrụ n’Elu Ụwa

O nwere mgbe ndị mmadụ bi na paradaịs n’ụwa a, ha ga-ebikwa na paradaịs n’ụwa a ọzọ.

AKỤKỌ NKE 116

Ụzọ Anyị Pụrụ Isi Dị Ndụ Ebighị Ebi

Naanị ịmara onye Jehova na Jizọs bụ, ò zuola? Ọ bụrụ na ò zughị, gịnị ọzọ dị mkpa?