Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 114

Ngwụsị Nke Ihe Ọjọọ Niile

Ngwụsị Nke Ihe Ọjọọ Niile

GỊNỊ ka ị na-ahụ n’ebe a? Ọ bụ ụsụụ ndị agha nọkwasịrị n’ịnyịnya ọcha. Ma lee ebe ha si na-abịa. Ha si n’eluigwe na-agbadata! È nwere ịnyịnya n’ezie n’eluigwe?

Ee e, ha abụghị ịnyịnya nkịtị. Anyị maara nke ahụ n’ihi na ịnyịnya apụghị ịgba ọsọ n’igwe ojii, hà pụrụ? Ma Bible na-ekwu banyere ịnyịnya ndị dị n’eluigwe. Ị̀ ma ihe mere o ji na-ekwu nke a?

Ọ bụ n’ihi na e ji ịnyịnya buo ọtụtụ agha n’oge gara aga. N’ihi ya, Bible na-ekwu banyere ndị si n’eluigwe gbara ịnyịnya na-agbadata iji gosi na Chineke ga-ebuso ndị nọ n’ụwa agha. Ị̀ ma ihe a na-akpọ ebe a ga-anọ lụọ agha ahụ? Ọ bụ Amagedọn. Agha ahụ ga-ekpochapụ ihe ọjọọ niile n’ụwa.

Jizọs ga-abụ Onyeisi n’agha Amagedọn ahụ. Cheta na Jizọs bụ onye Jehova họpụtara ịbụ eze nke ọchịchị Ya. Nke a mere Jizọs ji kpuru okpueze. Mma agha o ji na-egosi na ọ ga-egbu ndị iro niile nke Chineke. Ò kwesịrị iju anyị anya na Chineke ga-ebibi ndị ọjọọ niile?

Leghachi anya n’Akụkọ nke 10. Gịnị ka ị na-ahụ n’ebe ahụ? Ọ bụ oké iju mmiri ahụ bibiri ndị ajọ mmadụ. Ònye wetara Iju Mmiri ahụ? Ọ bụ Jehova Chineke. Ugbu a, lee anya n’Akụkọ nke 15. Gịnị na-eme n’ebe ahụ? Ọkụ nke Jehova zitere na-ebibi Sọdọm na Gọmọra.

Saghee Akụkọ nke 33. Lee ihe na-eme ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya ndị Ijipt. Ònye mere ka mmiri ahụ rikpuo ha? Ọ bụ Jehova. O mere ya iji chebe ndị ya. Lee anya n’Akụkọ nke 36 na nke 76. Ị ga-ahụ n’ebe ahụ na Jehova kwere ka e bibie ọbụna ndị Izrel bụ́ ndị ya, n’ihi ajọ omume ha.

Ya mere, o kwesịghị iju anyị anya na Jehova ga-ezite ndị agha ya nke eluigwe ịkwụsị ihe ọjọọ niile n’ụwa. Cheedị ihe nke ahụ ga-apụta! Sapeta peeji nke na-esonụ ka anyị lee.