Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 115

Paradaịs Ọhụrụ n’Elu Ụwa

Paradaịs Ọhụrụ n’Elu Ụwa

LEE osisi ndị ahụ toro ogologo, okooko osisi ndị mara mma na ugwu ndị dị elu. Ebe a ọ́ maghị mma? Lee ka mgbada na-eri ihe dị n’aka nwatakịrị ahụ. Leekwa ọdụm na ịnyịnya ndị nọ n’ala ahịhịa ebe ahụ. Ị́ gaghị achọ ibi n’ụlọ nke dị n’ebe dị otú a?

Chineke chọrọ ka ị dị ndụ ebighị ebi n’ụwa n’ime paradaịs. Ọ chọghịkwa ka i nwee ihe mgbu na ahụ́ ụfụ ọ bụla nke ndị mmadụ na-enwe taa. Nke a bụ nkwa Bible na-ekwe ndị ga-ebi n’ime paradaịs ọhụrụ ahụ: ‘Chineke ga-anọnyere ha. Ọnwụ ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ́ ụfụ agaghị adị ọzọ. Ihe ochie niile agabigawo.’

Jizọs ga-ahụ na e nwere mgbanwe a dị ebube. Ị̀ ma mgbe ọ ga-abụ? Ọ bụ mgbe o kpochapụsịrị ihe ọjọọ niile na ndị ajọ mmadụ niile n’ụwa. Cheta na mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ gwọrọ ndị nwere ọrịa dị iche iche, ọbụna o mekwara ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie. Jizọs mere nke a iji gosi ihe ọ ga-eme n’ụwa niile mgbe ọ ga-abụ Eze nke alaeze Chineke.

Cheedị nnọọ otú ihe ga-esi magbuo onwe ya n’ime paradaịs ọhụrụ elu ala ahụ! Jizọs na ụfọdụ ndị ọ họpụtara ga na-achị n’eluigwe. Ndị ọchịchị a ga-elekọta ndị ọ bụla nọ n’ụwa, hụkwa na ha nwere obi ụtọ. Ka anyị lee ihe ọ dị mkpa ka anyị mee iji jide n’aka na Chineke ga-enye anyị ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs ọhụrụ ya.