Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 116

Ụzọ Anyị Pụrụ Isi Dị Ndụ Ebighị Ebi

Ụzọ Anyị Pụrụ Isi Dị Ndụ Ebighị Ebi

Ị̀ PỤRỤ ikwu ihe nwatakịrị nwaanyị a na ndị enyi ya na-agụ? Ọ bụ akwụkwọ nke a ị na-agụ—Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible. Ha na-agụ otu akụkọ a ị na-agụ—“Ụzọ Anyị Pụrụ Isi Dị Ndụ Ebighị Ebi.”

Ị̀ ma ihe ha na-amụta? Nke mbụ, na anyị aghaghị ịmara Jehova na Ọkpara ya bụ́ Jizọs ma ọ bụrụ na anyị ga-adị ndụ ebighị ebi. Bible na-asị: ‘Nke a bụ ụzọ isi dị ndụ ebighị ebi. Mụta ihe banyere onye naanị ya bụ ezi Chineke ahụ, na Ọkpara ya o zitere n’ụwa, bụ́ Jizọs Kraịst.’

Olee otú anyị pụrụ isi mụta ihe banyere Jehova Chineke na Ọkpara ya Jizọs? Otu ụzọ bụ site n’ịgụ Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible site n’isi ruo ná ngwụsị. Ọ na-akọ ọtụtụ ihe banyere Jehova na Jizọs, ọ́ bụghị ya? Ọ na-akọkwa ọtụtụ ihe ha mere na ihe ha ka ga-eme. Ma anyị ga-eme ihe karịrị naanị ịgụ akwụkwọ a.

Ị̀ na-ahụ akwụkwọ ọzọ ahụ nke dị n’ala? Ọ bụ Bible. Rịọ mmadụ ka ọ na-agụpụtara gị akụkụ Bible ebe ndị e si nweta akụkọ ndị dị n’akwụkwọ a. Bible na-enye anyị ihe ọmụma niile dị anyị niile mkpa iji nwee ike ife Jehova n’ụzọ ziri ezi, wee nwee ndụ ebighị ebi. Ya mere, anyị kwesịrị ịhụ na anyị na-amụ Bible mgbe niile.

Ma ịmụta ihe banyere Jehova Chineke na Jizọs Kraịst ezughị. Anyị pụrụ inwe ọtụtụ ihe ọmụma banyere ha na ozizi ha ma ghara inweta ndụ ebighị ebi. Ị̀ ma ihe ọzọ dị mkpa?

Ọ dịkwa mkpa ka anyị na-ebi ndụ kwekọrọ n’ihe anyị na-amụ. Ì chetara Judas Iskarịọt? Ọ bụ otu n’ime mmadụ iri na abụọ ahụ Jizọs họọrọ ka ha bụrụ ndịozi ya. Judas nwere ihe ọmụma dị ukwuu banyere Jehova na Jizọs. Ma gịnị mere ya? Mgbe nwa oge gasịrị, ọ malitere ịchọ naanị ọdịmma nke aka ya, o wee rara Jizọs nye n’aka ndị iro ya n’ọnụ ego ọlaọcha iri atọ. N’ihi ya, Judas agaghị enweta ndụ ebighị ebi?

Ì chetara Gehezaị, onye anyị mụrụ ihe banyere ya n’Akụkọ nke 69? Ọ chọrọ inwe uwe na ego na-abụghị nke ya. O wee ghaa ụgha iji nweta ha. Ma Jehova nyere ya ahụhụ. Ọ ga-enyekwa anyị ahụhụ ma ọ bụrụ na anyị egeghị ntị n’iwu ya.

Ma e nwere ọtụtụ ndị ezi mmadụ jiri ikwesị ntụkwasị obi fee Jehova ofufe. Anyị chọrọ ịdị ka ha, ọ̀ bụ na anyị achọghị? Nwata nwoke ahụ bụ́ Samuel bụ ezi ihe nlereanya anyị kwesịrị ịgbaso. Cheta, dị ka anyị hụrụ n’Akụkọ nke 55, ọ dị naanị afọ anọ ma ọ bụ ise mgbe ọ malitere ife Jehova n’ụlọikwuu ya. N’ihi ya, n’agbanyeghị otú ị bụruru nwata, ị dịkarịghị nta ife Jehova ofufe.

N’ezie, onye anyị niile chọrọ iso bụ Jizọs Kraịst. Ọbụna mgbe ọ bụ nwata, dị ka e gosiri n’Akụkọ nke 87, ọ nọ n’ụlọ nsọ na-agwa ndị ọzọ banyere Nna ya nke eluigwe. Ka anyị gbasoo ihe nlereanya ya. Ka anyị na-agwa ọtụtụ ndị okwu ruo ókè anyị nwere ike banyere Jehova Chineke anyị nke dị ebube, na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị a, anyị ga-enwe ike ịdị ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs ọhụrụ nke Chineke n’elu ala.