Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 1

Chineke Amalite Ike Ihe

  1. Ebee ka ezi ihe niile sitere, ị̀ pụrụ ịkpọtụ otu n’ime ha aha?

  2. Gịnị bụ ihe mbụ Chineke kere?

  3. N’ihi gịnị ka mmụọ ozi mbụ ji bụrụ onye pụrụ iche?

  4. Kọwaa otú ụwa dị ná mmalite (Lee foto.)

  5. Olee otú Chineke si malite ịkwadebe ụwa maka anụmanụ na mmadụ?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jeremaịa 10:12.

    Olee àgwà Chineke ndị na-apụta ìhè n’ihe ndị o kere? (Aịsa. 40:26; Rom 11:33)

  2. Gụọ Ndị Kọlọsi 1:15-17.

    Òkè dị aṅaa ka Jizọs keere n’ike ihe, oleekwa otú nke a kwesịrị isi metụta otú anyị si ele Jizọs anya? (Kọl. 1:15-17)

  3. Gụọ Jenesis 1:1-10.

    1. Olee otú ụwa si malite? (Jen. 1:1)

    2. Gịnị mere n’ụbọchị mbụ nke okike? (Jen. 1:3-5)

    3. Kọwaa ihe mere n’ụbọchị nke abụọ nke okike. (Jen. 1:7, 8)

Akụkọ nke 2

Ogige nke Mara Mma

  1. Olee otú Chineke si kwadebe ụwa ka ọ ghọọ ebe obibi anyị?

  2. Kwuo ụdị anụmanụ dị iche iche Chineke kere. (Lee foto.)

  3. Gịnị mere ogige Iden ji bụrụ ebe pụrụ iche?

  4. Gịnị ka Chineke chọrọ ka ụwa dum ghọọ?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 1:11-25.

    1. Gịnị ka Chineke kere n’ụbọchị nke atọ nke okike? (Jen. 1:12)

    2. Gịnị mere n’ụbọchị nke anọ nke okike? (Jen. 1:16)

    3. Olee anụmanụ ndị Chineke kere n’ụbọchị nke ise na n’ụbọchị nke isii? (Jen. 1:20, 21, 25)

  2. Gụọ Jenesis 2:8, 9.

    Olee osisi abụọ pụrụ iche ndị Chineke kụrụ n’ogige ahụ, gịnịkwa ka ha na-anọchi anya ya?

Akụkọ nke 3

Nwoke Mbụ na Nwaanyị Mbụ

  1. Olee ọdịiche e nwere n’etiti foto dị n’Akụkọ nke 2 na nke dị n’Akụkọ nke 3?

  2. Ònye kere nwoke mbụ, gịnịkwa bụ aha nwoke ahụ?

  3. Olee ọrụ Chineke nyere Adam ka ọ rụọ?

  4. Gịnị mere Chineke ji mee ka oké ụra buru Adam?

  5. Ogologo oge hà aṅaa ka Adam na Iv gaara adịru ndụ, oleekwa ọrụ Jehova chọrọ ka ha rụọ?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Abụ Ọma 83:18.

    Gịnị bụ aha Chineke, oleekwa ọnọdụ pụrụ iche o nwere n’ebe ụwa dị? (Jer. 16:21; Dan. 4:17)

  2. Gụọ Jenesis 1:26-31.

    1. Olee ihe ikpeazụ Chineke kere n’ụbọchị nke isii, oleekwa otú ihe a o kere si dị iche n’ebe ụmụ anụmanụ dị? (Jen. 1:26)

    2. Olee ndokwa Jehova mere maka mmadụ na anụmanụ? (Jen. 1:30)

  3. Gụọ Jenesis 2:7-25.

    1. Gịnị ka ọrụ e nyere Adam bụ́ ịgụ ụmụ anụmanụ aha gụnyere? (Jen. 2:19)

    2. Olee otú Jenesis 2:24 si enyere anyị aka ịghọta otú Jehova si ele alụmdi na nwunye, nkewa, na ịgba alụkwaghịm anya? (Mat. 19:4-6, 9)

Akụkọ nke 4

Ihe Mere E Ji Chụpụ Ha n’Ebe Obibi Ha

  1. Na foto a, gịnị na-eme Adam na Iv?

  2. N’ihi gịnị ka Jehova ji nye ha ntaramahụhụ?

  3. Gịnị ka otu agwọ gwara Iv?

  4. Ònye mere ka agwọ ahụ gwa Iv okwu?

  5. Gịnị mere e ji chụpụ Adam na Iv n’ebe obibi ha bụ́ Paradaịs?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 2:16, 17 na 3:1-13, 24.

    1. Olee otú ajụjụ agwọ ahụ jụrụ Iv si nye echiche megidere ihe Jehova bu n’obi? (Jen. 3:1-5; 1 Jọn 5:3)

    2. Olee otú ihe mere Iv si bụrụ ihe ịdọ aka ná ntị nye anyị? (Fil. 4:8; Jems 1:14, 15; 1 Jọn 2:16)

    3. Olee otú Adam na Iv si ghara ikweta na ụta dịịrị ha maka mmehie ha mere? (Jen. 3:12, 13)

    4. Olee otú ndị cherub e mere ka ha nọrọ n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ogige Iden si gosipụta oruru o ruuru Jehova ịbụ eze (Jen. 3:24)

  2. Gụọ Mkpughe 12:9.

    Olee ókè Setan nweruworo ihe ịga nke ọma n’ime ka ihe a kpọrọ mmadụ jụ ịchịisi Chineke? (1 Jọn 5:19)

Akụkọ nke 5

Ndụ Ahụhụ Amalite

  1. Olee otú ndụ dịịrị Adam na Iv mgbe ha hapụrụ ogige Iden?

  2. Gịnị malitere ime Adam na Iv, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

  3. N’ihi gịnị ka ụmụ Adam na Iv ga-eji na-aka nká ma na-anwụ anwụ?

  4. A sị na Adam na Iv rubeere Jehova isi, olee otú ndụ gaara adịrị ha na ụmụ ha?

  5. Olee otú nnupụisi Iv si kpatara ya ihe mgbu?

  6. Gịnị bụ aha ụmụ abụọ mbụ nke Adam na Iv?

  7. Ole ndị ka ụmụaka ndị ọzọ ahụ nọ na foto a bụ?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 3:16-23 na 4:1, 2.

    1. Olee otú ọnụ a bụrụ ala si metụta ndụ Adam? (Jen. 3:17-19; Rom 8:20, 22)

    2. N’ihi gịnị ka aha ahụ bụ́ Iv, nke pụtara “Onye Dị Ndụ,” ji kwesị ekwesị? (Jen. 3:20)

    3. Olee otú Jehova si chebara Adam na Iv echiche ọbụna mgbe ha mehiesịrị? (Jen. 3:7, 21)

  2. Gụọ Mkpughe 21:3, 4.

    Olee “ihe mbụ” ndị ị na-atụ anya ka e wepụ?

Akụkọ nke 6

Ezi Nwa na Ajọ Nwa

  1. Gịnị bụ ọrụ Ken na Ebel?

  2. Onyinye ndị dị aṅaa ka Ken na Ebel wetaara Jehova?

  3. N’ihi gịnị ka onyinye Ebel ji masị Jehova, gịnịkwa mere nke Ken amasịghị ya?

  4. Olee ụdị mmadụ Ken bụ, oleekwa otú Jehova si nwaa ịgbazi ya?

  5. Gịnị ka Ken mere mgbe naanị ya na nwanne ya nwoke nọ n’ọhịa?

  6. Kọwaa ihe mere Ken mgbe ọ gbusịrị nwanne ya.

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 4:2-26.

    1. Olee otú Jehova si kọwaa ọnọdụ dị ize ndụ nke Ken nọ na ya? (Jen. 4:7)

    2. Olee otú Ken si gosipụta ihe dị ya n’obi? (Jen. 4:9)

    3. Olee otú Jehova si ele ịkwafu ọbara onye aka ya dị ọcha anya? (Jen. 4:10; Aịsa. 26:21)

  2. Gụọ 1 Jọn 3:11, 12.

    1. N’ihi gịnị ka Ken ji wee iwe dị ukwuu, oleekwa otú nke a si bụrụ ihe ịdọ aka ná ntị nye anyị taa? (Jen. 4:4, 5; Ilu 14:30; 28:22)

    2. Olee otú Bible si gosi na ọbụna mgbe ndị ezinụlọ anyị niile na-emegide Jehova, anyị ka pụrụ ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe? (Ọma 27:10; Mat. 10:21, 22)

  3. Gụọ Jọn 11:25.

    Nkwa dị aṅaa ka Jehova na-ekwe banyere ndị niile nwụrụ n’ihi ezi omume? (Jọn 5:24)

Akụkọ nke 7

Nwoke nke Nwere Obi Ike

  1. Olee otú Inọk si bụrụ onye dị iche?

  2. N’ihi gịnị ka ndị dịrị ndụ n’oge Inọk ji mee nnọọ ọtụtụ ihe ọjọọ?

  3. Ihe ọjọọ ndị dị aṅaa ka ndị mmadụ na-eme mgbe ahụ? (Lee foto.)

  4. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka Inọk nwee obi ike?

  5. Ogologo oge hà aṅaa ka ndị mmadụ na-adịru ndụ n’oge ahụ, ma afọ ole ka Inọk dịrị ndụ?

  6. Gịnị mere mgbe Inọk nwụsịrị?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 5:21-24, 27.

    1. Ụdị mmekọrịta dị aṅaa ka Inọk na Jehova nwere? (Jen. 5:24)

    2. Dị ka Bible si kwuo, ònye bụ nwoke kasị dị ogologo ndụ n’ụwa, ọ̀ dị afọ ole mgbe ọ nwụrụ? (Jen. 5:27)

  2. Gụọ Jenesis 6:5.

    Olee otú ọnọdụ ụwa jọruru ná njọ mgbe Inọk nwụsịrị, oleekwa otú oge anyị si yie ya? (2 Tim. 3:13)

  3. Gụọ Ndị Hibru 11:5.

    Olee àgwà Inọk nke “dị Chineke ezi mma,” gịnịkwa ka ọ rụpụtaara ya? (Jen. 5:22)

  4. Gụọ Jud 14, 15.

    Olee otú Ndị Kraịst taa pụrụ isi ṅomie obi ike Inọk mgbe ha na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere agha Amagedọn nke na-abịanụ? (2 Tim. 4:2; Hib. 13:6)

Akụkọ nke 8

Ndị Dike Nọ n’Ụwa

  1. Gịnị mere mgbe ụfọdụ n’ime ndị mmụọ ozi Chineke gere Setan ntị?

  2. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị mmụọ ozi ji kwụsị ọrụ ha na-arụ n’eluigwe ma gbadata n’ụwa?

  3. Olee ihe mere ọbịbịa ndị mmụọ ozi bịara n’ụwa ma nwoghara ahụ́ mmadụ ji bụrụ ihe dị njọ?

  4. Olee otú ụmụ ndị mmụọ ozi ahụ mụtara si dị iche?

  5. Dị ka ị pụrụ ịhụ na foto a, gịnị ka ụmụ ndị mmụọ ozi ahụ mụrụ malitere ime mgbe ha ghọrọ ndị dike?

  6. Mgbe Inọk nwụsịrị, olee nwoke ezi omume nke biri n’ụwa, n’ihi gịnịkwa ka Chineke ji nwee mmasị n’ebe ọ nọ?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 6:1-8.

    Gịnị ka Jenesis 6:6 na-ekpughe banyere otú àgwà anyị pụrụ isi metụta Jehova? (Ọma 78:40, 41; Ilu 27:11)

  2. Gụọ Jud 6

    Gịnị ka ihe ndị mmụọ ozi ahụ ‘na-anọgideghị n’ebe obibi e nyere ha’ mere n’ụbọchị Noa na-echetara anyị taa? (1 Kọr. 3:5-9; 2 Pita 2:4, 9, 10)

Akụkọ nke 9

Noa Ewuo Ụgbọ

  1. Ezinụlọ Noa hà dị mmadụ ole, gịnịkwa bụ aha ụmụ ya atọ?

  2. Olee ihe dị ịtụnanya nke Chineke gwara Noa ka o mee, n’ihi gịnịkwa ka o ji gwa ya ka o mee otú ahụ?

  3. Olee ihe ndị agbata obi Noa mere mgbe ọ gwara ha banyere ụgbọ ahụ?

  4. Gịnị ka Chineke gwara Noa ka o mee banyere ụmụ anụmanụ?

  5. Mgbe Chineke mechiri ọnụ ụzọ nke ụg̣bọ ahụ, gịnị ka Noa na ezinụlọ ya na-aghaghị ime?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 6:9-22.

    1. Gịnị mere ka Noa bụrụ onye dị ịrịba ama nke fere ezi Chineke ahụ ofufe? (Jen. 6:9, 22)

    2. Olee otú Jehova si ele ime ihe ike anya, oleekwa otú nke a kwesịrị isi emetụta ụdị ihe ntụrụndụ ndị anyị na-ahọrọ? (Jen. 6:11, 12; Ọma 11:5)

    3. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Noa mgbe e nyere anyị ntụziaka ná nzukọ Jehova? (Jen. 6:22; 1 Jọn 5:3)

  2. Gụọ Jenesis 7:1-9.

    Olee otú eziokwu ahụ bụ́ na Jehova lere nwoke ahụ na-ezughị okè bụ́ Noa anya dị ka onye ezi omume si bụrụ ihe agbamume nye anyị taa? (Jen. 7:1; Ilu 10:16; Aịsa. 26:7)

Akụkọ nke 10

Oké Iju Mmiri Ahụ

  1. Gịnị mere na ọ dịghị onye nwere ike ịbanye n’ụgbọ ahụ ozugbo mmiri malitere izo?

  2. Abalị ole ka Jehova mere ka mmiri zoo, oleekwa ókè mmiri ahụ toruru?

  3. Gịnị mere ụgbọ ahụ mgbe mmiri malitere irikpu ụwa?

  4. Ndị dike ahụ hà lanarịrị Iju Mmiri ahụ, gịnịkwa mere ndị nna nke ndị dike ahụ?

  5. Gịnị mere ụgbọ ahụ mgbe ọnwa ise gasịrị?

  6. Gịnị mere Noa ji zipụ nduru site n’ụgbọ ahụ?

  7. Olee otú Noa si mara na mmiri ahụ rikpuru ụwa ataala?

  8. Gịnị ka Chineke gwara Noa mgbe ya na ezinụlọ ya nọsịrị ihe karịrị otu afọ n’ụgbọ ahụ?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 7:10-24.

    1. Olee ókè e bibiruru ihe ndị dị ndụ n’ụwa? (Jen. 7:23)

    2. Ogologo oge hà aṅaa gafere tupu mmiri nke Iju Mmiri ahụ ataa? (Jen. 7:24)

  2. Gụọ Jenesis 8:1-17.

    Olee otú Jenesis 8:17 si gosi na nzube mbụ nke Jehova banyere ụwa agbanweghị? (Jen. 1:22)

  3. Gụọ 1 Pita 3:19, 20.

    1. Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi laghachiri n’eluigwe, olee ikpe a mara ha? (Jud 6)

    2. Olee otú akụkọ banyere Noa na ezinụlọ ya si eme ka obi sikwuo anyị ike na Jehova nwere ikike nke ịnapụta ndị ya? (2 Pita 2:9)

Akụkọ nke 11

Eke na Egwurugwu Mbụ

  1. Dị ka e gosiri na foto a, gịnị ka Noa buru ụzọ mee mgbe o si n’ụgbọ ahụ pụta?

  2. Olee iwu Chineke nyere Noa na ezinụlọ ya mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị?

  3. Olee nkwa Chineke kwere?

  4. Mgbe anyị hụrụ eke na egwurugwu, gịnị ka o kwesịrị ichetara anyị?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 8:18-22.

    1. Olee otú anyị pụrụ isi na-esurere Jehova ‘ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ’ taa? (Jen. 8:21; Hib. 13:15, 16)

    2. Gịnị ka Jehova kwuru banyere obi mmadụ, gịnịkwanụ ka anyị kwesịrị ịkpachara anya banyere ya? (Jen. 8:21; Mat. 15:18, 19)

  2. Gụọ Jenesis 9:9-17.

    1. Ọgbụgba ndụ dị aṅaa ka Jehova so ihe niile e kere eke nọ n’ụwa nwee? (Jen. 9:10, 11)

    2. Ogologo oge hà aṅaa ka ọgbụgba ndụ eke na egwurugwu ahụ ga-adị irè? (Jen. 9:16)

Akụkọ nke 12

Ụmụ Mmadụ Ewuo Nnukwu Ụlọ Elu

  1. Ònye bụ Nimrọd, oleekwa otú Chineke si lee ya anya?

  2. N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji na-akpụ brik na foto a?

  3. Olee ihe mere na ọrụ ihe owuwu ahụ adịghị Jehova mma n’obi?

  4. Olee otú Chineke si kwụsị owuwu nke nnukwu ụlọ elu ahụ?

  5. Gịnị ka a kpọrọ obodo ahụ, gịnịkwa ka aha ahụ pụtara?

  6. Gịnị mere ndị ahụ mgbe Chineke ghagburu asụsụ ha?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 10:1, 8-10.

    Olee ụdị àgwà Nimrọd nwere, oleekwa otú nke a si bụrụ ihe ịdọ aka ná ntị nye anyị? (Ilu 3:31)

  2. Gụọ Jenesis 11:1-9.

    Gịnị bụ nzube e ji na-ewu nnukwu ụlọ elu ahụ, oleekwa ihe mere owuwu ya ji kụọ afọ n’ala? (Jen. 11:4; Ilu 16:18; Jọn 5:44)

Akụkọ nke 13

EbrehamEnyi Chineke

  1. Olee ụdị ndị biri n’obodo Ọọ?

  2. Ònye nọ na foto a, olee mgbe a mụrụ ya, ebeekwa ka o biri?

  3. Gịnị ka Chineke gwara Ebreham ka o mee?

  4. N’ihi gịnị ka e ji kpọọ Ebreham enyi Chineke?

  5. Olee ndị sooro Ebreham mgbe ọ hapụrụ Ọọ?

  6. Gịnị ka Chineke gwara Ebreham mgbe o rutere n’ala Kenan?

  7. Olee nkwa Chineke kwere Ebreham mgbe ọ dị afọ 99?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 11:27-32.

    1. Olee otú Ebreham na Lọt si bụrụ ụmụnne? (Jen. 11:27)

    2. Ọ bụ ezie na e kwuru na ọ bụ Tira kpọọrọ ezinụlọ ya gaa Kenan, olee otú anyị si mara na ọ bụ Ebreham n’ezie malitere njem ahụ, n’ihi gịnịkwa ka o ji mee otú ahụ? (Jen. 11:31; Ọrụ 7:2-4)

  2. Gụọ Jenesis 12:1-7.

    Mgbe Ebreham ruru n’ala Kenan, olee otú Jehova si mee ka ọgbụgba ndụ ya na Ebreham gụnyekwuo ọtụtụ ndị? (Jen. 12:7)

  3. Gụọ Jenesis 17:1-8, 15-17.

    1. Olee otú e si gbanwee aha Ebram mgbe ọ dị afọ 99, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (Jen. 17:5)

    2. Olee otú Jehova kwere nkwa isi gọzie Sera n’ọdịnihu? (Jen. 17:15, 16)

  4. Gụọ Jenesis 18:9-19.

    1. Na Jenesis 18:19, olee ọrụ e nyere ndị bụ́ nna? (Deut. 6:6, 7; Efe. 6:4)

    2. Olee ihe mere Sera nke na-egosi na anyị apụghị izochiri Jehova ihe ọ bụla? (Jen. 18:12, 15; Ọma 44:21)

Akụkọ nke 14

Chineke Elee Okwukwe Ebreham Ule

  1. Olee nkwa Chineke kwere Ebreham, oleekwa otú Chineke si mezuo nkwa ya?

  2. Dị ka e gosiri na foto a, olee otú Chineke si lee okwukwe Ebreham ule?

  3. Gịnị ka Ebreham mere n’agbanyeghị na ọ ghọtaghị ihe mere Chineke ji nye ya iwu o nyere ya?

  4. Gịnị mere mgbe Ebreham wepụtara mma iji gbuo nwa ya?

  5. Olee otú okwukwe Ebreham nwere n’ebe Chineke nọ siruru n’ike?

  6. Gịnị ka Chineke nyere Ebreham ka o jiri chụọ àjà, oleekwa otú Chineke si mee nke ahụ?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 21:1-7.

    N’ihi gịnị ka Ebreham ji bie nwa ya úgwù n’ụbọchị nke asatọ? (Jen. 17:10-12; 21:4)

  2. Gụọ Jenesis 22:1-18.

    Olee otú Aịzik si gosi na ya na-edo onwe ya n’okpuru nna ya, bụ́ Ebreham, oleekwa otú nke a si see onyinyo ihe ka ukwuu nke na-aga ime n’ọdịnihu? (Jen. 22:7-9; 1 Kọr. 5:7; Fil. 2:8, 9)

Akụkọ nke 15

Nwunye Lọt Lere Anya n’Azụ

  1. N’ihi gịnị ka Ebreham na Lọt ji kewaa?

  2. N’ihi gịnị ka Lọt ji họrọ ibi na Sọdọm?

  3. Ụdị ndị dị aṅaa ka ndị Sọdọm bụ?

  4. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka ndị mmụọ ozi abụọ nyere Lọt?

  5. N’ihi gịnị ka nwunye Lọt ji ghọọ ogidi nnu?

  6. Gịnị ka ihe mere nwunye Lọt na-akụziri anyị?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 13:5-13.

    A bịa n’ihe banyere idozi esemokwu n’etiti mmadụ na ibe ya, gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’aka Ebreham? (Jen. 13:8, 9; Rom 12:10; Fil. 2:3, 4)

  2. Gụọ Jenesis 18:20-33.

    Olee otú ụzọ Jehova si mesoo Ebreham ihe si emesi anyị obi ike na Jehova na Jizọs ga-ekpe ikpe ziri ezi? (Jen. 18:25, 26; Mat. 25:31-33)

  3. Gụọ Jenesis 19:1-29.

    1. Gịnị ka akụkọ a dị na Bible na-egosi banyere otú Chineke si ele mmadụ idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya anya? (Jen. 19:5, 13; Lev. 20:13)

    2. Gịnị bụ ọdịiche dị n’otú Lọt si nakwere ntụziaka Chineke nakwa otú Ebreham si nakwere ya, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a? (Jen. 19:15, 16, 19, 20; 22:3)

  4. Gụọ Luk 17:28-32.

    Àgwà dị aṅaa ka nwunye Lọt nwere n’ebe ihe onwunwe dị, oleekwa otú nke a si bụrụ ihe ịdọ aka ná ntị nye anyị? (Luk 12:15; 17:31, 32; Mat. 6:19-21, 25)

  5. Gụọ 2 Pita 2:6-8.

    N’iṅomi Lọt, gịnị kwesịrị ịbụ àgwà anyị n’ebe ụwa nke na-adịghị asọpụrụ Chineke nke anyị bi n’ime ya dị? (Ezik. 9:4; 1 Jọn 2:15-17)

Akụkọ nke 16

Aịzik Alụta Ezigbo Nwunye

  1. Ole ndị bụ nwoke na nwaanyị a nọ na foto a?

  2. Gịnị ka Ebreham mere iji lụtara nwa ya nwoke nwaanyị, n’ihi gịnịkwa ka o ji mee otú ahụ?

  3. Olee otú e si zaa ekpere ohu Ebreham?

  4. Gịnị ka Ribeka zara mgbe a jụrụ ya ma ọ chọrọ ịlụ Aịzik?

  5. Gịnị mere ka Aịzik nwee obi ụtọ ọzọ?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 24:1-67.

    1. Àgwà ọma ndị dị aṅaa ka Ribeka kpara mgbe o zutere ohu Ebreham n’akụkụ olulu mmiri? (Jen. 24:17-20; Ilu 31:17, 31)

    2. Olee otú ndokwa Ebreham mere ka a lụtara Aịzik nwunye si bụrụ ezi ihe nlereanya nye Ndị Kraịst taa? (Jen. 24:37, 38; 1 Kọr. 7:39; 2 Kọr. 6:14)

    3. ) N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị iwepụta oge iji tụgharịa uche dị nnọọ ka Aịzik mere? (Jen. 24:63; Ọma 77:12; Fil. 4:8)

Akụkọ nke 17

Ụmụ Ejima Ndị Na-eyighị

  1. Ole ndị bụ Ịsọ na Jekọb, oleekwa otú o si bụrụ na ha eyighị?

  2. Afọ ole ka Ịsọ na Jekọb dị mgbe nna nna ha bụ́ Ebreham nwụrụ?

  3. Gịnị ka Ịsọ mere bụ́ nke wutere nne na nna ya nke ukwuu?

  4. N’ihi gịnị ka Ịsọ ji wesoo nwanne ya, bụ́ Jekọb, iwe ọkụ?

  5. Gịnị ka Aịzik gwara nwa ya bụ́ Jekọb ka o mee?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 25:5-11, 20-34.

    1. Gịnị ka Jehova buru n’amụma banyere ụmụ ejima Ribeka? (Jen. 25:23)

    2. Olee ọdịiche dị n’otú Jekọb na Ịsọ si lee ọnọdụ dịọkpara anya? (Jen. 25:31-34)

  2. Gụọ Jenesis 26:34, 35; 27:1-46; na 28:1-5.

    1. Olee otú o si pụta ìhè na Ịsọ ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe? (Jen. 26:34, 35; 27:46)

    2. ) Gịnị ka Aịzik gwara Jekọb ka o mee ma ọ bụrụ na ọ chọrọ inweta ngọzi Chineke?

  3. Gụọ Ndị Hibru 12:16, 17.

    Gịnị ka ihe mere Ịsọ na-egosi banyere ihe ga-eme ndị na-elelị ihe ndị dị nsọ anya?

Akụkọ nke 18

Jekọb Ejee Heran

  1. Ònye bụ nwa agbọghọ nke nọ na foto a, gịnịkwa ka Jekọb meere ya?

  2. Gịnị ka Jekọb dị njikere ime iji lụọ Rechel?

  3. Gịnị ka Leban mere mgbe oge ruru ka Jekọb lụọ Rechel?

  4. Gịnị ka Jekọb kweere ime iji lụọ Rechel?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 29:1-30.

    1. Ọbụna mgbe Leban ghọgbusịrị ya, olee otú Jekọb si gosi na ya nwere ùgwù, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta na nke a? (Jen. 25:27; 29:26-28; Mat. 5:37)

    2. Olee otú akụkọ banyere Jekọb si egosi ọdịiche dị n’ezigbo ịhụnanya na ịhụnanya na-abụghị nke ezigbo ya? (Jen. 29:18, 20, 30; Abụ 8:6)

    3. Olee ndị inyom anọ ghọrọ ndị ezinụlọ Jekọb ma mesịa mụọrọ ya ụmụ ndị ikom? (Jen. 29:23, 24, 28, 29)

Akụkọ nke 19

Jekọb Enwee Ezinụlọ Buru Ibu

  1. Gịnị bụ aha ụmụ nwoke isii nwunye mbụ nke Jekọb, bụ́ Lia, mụụrụ ya?

  2. Olee ụmụ nwoke abụọ ohu nwaanyị Lia, bụ́ Zilpa, mụụrụ Jekọb?

  3. Olee aha ụmụ nwoke abụọ ohu nwaanyị Rechel, bụ́ Bilha, mụụrụ Jekọb?

  4. Olee aha ụmụ nwoke abụọ Rechel mụrụ, ma gịnị mere mgbe ọ mụsịrị nke abụọ?

  5. Dị ka anyị na-ahụ na foto a, ụmụ ole ka Jekọb nwere, gịnịkwa ka e si n’aka ha nweta?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 29:32-35; 30:1-26; na 35:16-19.

    Dị ka aha ụmụ 12 nke Jekọb na-egosi, olee otú e si agụkarị ụmụ nwoke ndị Juu aha n’oge ochie?

  2. Gụọ Jenesis 37:35.

    Ọ bụ ezie na ọ bụ naanị Daịna ka a kpọrọ aha na Bible, olee otú anyị si mara na Jekọb mụrụ ihe karịrị otu nwa nwaanyị? (Jen. 37:34, 35)

Akụkọ nke 20

Daịna Abanye ná Nsogbu

  1. Gịnị mere Ebreham na Aịzik achọghị ka ụmụ ha lụọ nwaanyị n’ala Kenan?

  2. Jekọb ọ̀ kwadoro ka nwa ya nwaanyị mete ụmụ agbọghọ ndị Kenan enyi?

  3. Ònye bụ nwoke a nke na-ele Daịna anya na foto a, oleekwa ihe ọjọọ o mere?

  4. Gịnị ka ụmụnne Daịna bụ́ Simiọn na Livaị mere mgbe ha nụrụ ihe merenụ?

  5. Jekọb ọ̀ nabatara ihe Simiọn na Livaị mere?

  6. Olee otú nsogbu niile nke ezinụlọ a si malite?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 34:1-31.

    1. Mkpakọrịta nke Daịna na ụmụ agbọghọ Kenan ọ̀ bụ ihe mere otu ugbo? Kọwaa. (Jen. 34:1)

    2. Gịnị mere ụta ji dịtụrụ Daịna maka ịghọ nwa agbọghọ maara nwoke? (Gal. 6:7)

    3. Olee otú ndị na-eto eto taa pụrụ isi gosi na ha mụtara ihe site n’ihe mere Daịna? (Ilu 13:20; 1 Kọr. 15:33; 1 Jọn 5:19)

Akụkọ nke 21

Ụmụnne Josef Akpọ Ya Asị

  1. N’ihi gịnị ka ụmụnne Josef ji meere ya anyaụfụ, gịnịkwa ka ha mere?

  2. Gịnị ka ụmụnne Josef chọrọ ime ya, ma gịnị ka Ruben kwuru?

  3. Gịnị mere mgbe ndị ahịa bụ́ ndị Ishmel gafewere?

  4. Gịnị ka ụmụnne Josef mere iji mee ka nna ha chee na Josef anwụọla?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 37:1-35.

    1. Olee otú Ndị Kraịst pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Josef site n’ịkọrọ ndị okenye ihe ọjọọ e mere n’ọgbakọ? (Jen. 37:2; Lev. 5:1; 1 Kọr. 1:11)

    2. Gịnị mere ụmụnne Josef ji mesoo ya omume ọjọọ? (Jen. 37:11, 18; Ilu 27:4; Jems 3:14-16)

    3. Olee ihe Jekọb mere mgbe ọ na-eru újú, nke bụ́ ihe ndị mmadụ na-emekarị? (Jen. 37:35)

Akụkọ nke 22

A Tụọ Josef Mkpọrọ

  1. Afọ ole ka Josef dị mgbe a kpọọrọ ya gaa Ijipt, gịnịkwa mere mgbe o ruru ebe ahụ?

  2. Olee otú Josef si banye n’ụlọ mkpọrọ?

  3. Olee ọrụ e nyere Josef n’ụlọ mkpọrọ?

  4. Gịnị ka Josef meere onye na-eburu Fero ihe ọṅụṅụ na onye na-emere ya bred bụ́ ndị a tụrụ mkpọrọ?

  5. Gịnị mere mgbe e mere ka onye na-eburu Fero ihe ọṅụṅụ si n’ụlọ mkpọrọ pụta?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 39:1-23.

    Ebe ọ bụ na n’ụbọchị Josef, ọ dịghị iwu e dere ede nke sitere n’aka Chineke bụ́ nke na-emegide ịkwa iko, gịnị kpaliri ya ịgbanahụ nwunye Pọtifa? (Jen. 2:24; 20:3; 39:9)

  2. Gụọ Jenesis 40:1-23.

    1. Ná mkpirikpi, kọọ ihe onye ahụ na-eburu Fero ihe ọṅụṅụ rọrọ ná nrọ na nkọwa Jehova nyere Josef. (Jen. 40:9-13)

    2. Gịnị ka onye na-emere Fero bred rọrọ ná nrọ, gịnịkwa ka ọ pụtara? (Jen. 40:16-19)

    3. Olee otú ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi nke nwekwara uche taa siworo ṅomie àgwà Josef? (Jen. 40:8; Ọma 36:9; Jọn 17:17; Ọrụ 17:2, 3)

    4. Olee otú Jenesis 40:20 si egosi ihe mere Ndị Kraịst ji ele ememe ụbọchị ọmụmụ anya dị ka ihe na-ekwesịghị ekwesị? (Ekli. 7:1; Mak 6:21-28)

Akụkọ nke 23

Nrọ Fero

  1. Gịnị mere Fero n’otu abalị?

  2. N’ihi gịnị ka onye na-eburu Fero ihe ọṅụṅụ ji mechaa cheta Josef?

  3. Dị ka e gosiri na foto a, olee nrọ abụọ ndị Fero rọrọ?

  4. Gịnị ka Josef sịrị na nrọ ndị ahụ pụtara?

  5. Olee otú Josef si ghọọ onye kasị mkpa n’Ijipt ma a gụpụ Fero?

  6. N’ihi gịnị ka ụmụnne Josef ji bịa Ijipt, gịnịkwa mere na ha amataghị ya?

  7. Olee nrọ Josef chetara, gịnịkwa ka o nyeere ya aka ịghọta?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 41:1-57.

    1. Olee otú Josef si dọrọ uche gaa n’ebe Jehova nọ, oleekwa otú Ndị Kraịst taa pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya ya? (Jen. 41:16, 25, 28; Mat. 5:16; 1 Pita 2:12)

    2. Olee otú afọ ndị ahụ e nwere nri n’ụba n’Ijipt na afọ ndị sochiri ha e nwere ụnwụ nri, si egosi nnọọ ọdịiche dị n’etiti ọnọdụ ime mmụọ nke ndị Jehova taa na nke Krisendọm? (Jen. 41:29, 30; Emọs 8:11, 12)

  2. Gụọ Jenesis 42:1-8 na 50:20.

    Ọ̀ dị njọ onye na-efe Chineke ihulata isi n’ihu mmadụ iji sọpụrụ ya ma kwanyere ya ùgwù maka ọkwá ya ma ọ bụrụ na ọ bụ omenala nke mba onye ahụ? (Jen. 42:6)

Akụkọ nke 24

Josef Elee Ụmụnne Ya Ule

  1. N’ihi gịnị ka Josef ji boo ụmụnne ya ebubo na ha bụ ndị nledo?

  2. N’ihi gịnị ka Jekọb ji kwere ka nwa ya nke ikpeazụ, bụ́ Benjamin, gaa Ijipt?

  3. Olee otú iko ọlaọcha Josef si banye n’akpa Benjamin?

  4. Gịnị ka Juda kwere nkwa ime ka e wee tọhapụ Benjamin?

  5. Olee otú o si bụrụ na ụmụnne Josef agbanweela?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 42:9-38.

    Olee otú ihe Josef kwuru na Jenesis 42:18 si bụrụ ezi ihe ncheta nye ndị nwere ibu ọrụ ná nzukọ Jehova taa? (Nehe. 5:15; 2 Kọr. 7:1, 2)

  2. Gụọ Jenesis 43:1-34.

    1. Ọ bụ ezie na Ruben bụ nwa mbụ, olee otú o si bụrụ Juda kwuchitere ọnụ ụmụnne ya? (Jen. 43:3, 8, 9; 44:14, 18; 1 Ihe 5:2)

    2. Olee otú Josef si lee nnọọ ụmụnne ya ule, n’ihi gịnịkwa? (Jen. 43:33, 34)

  3. Gụọ Jenesis 44:1-34.

    1. Dị ka otu n’ime ụzọ isi mee ka ụmụnne ya ghara ịmata onye ọ bụ, gịnị ka Josef kwuru banyere onwe ya? (Jen. 44:5, 15; Lev. 19:26)

    2. Olee otú ụmụnne Josef si gosi na ha enweghịzi anyaụfụ ha nweburu n’ebe nwanne ha nwoke nọ? (Jen. 44:13, 33, 34)

Akụkọ nke 25

Ezinụlọ ahụ Akwaga Ijipt

  1. Gịnị mere mgbe Josef gwara ụmụnne ya onye ọ bụ?

  2. Gịnị ka Josef ji obiọma kọwaara ụmụnne ya?

  3. Gịnị ka Fero kwuru mgbe ọ nụrụ banyere ụmụnne Josef?

  4. Olee otú ezinụlọ Jekọb bururu n’ibu mgbe ha kwagara Ijipt?

  5. Olee aha e ji gbanwee aha ezinụlọ Jekọb, n’ihi gịnịkwa?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jenesis 45:1-28.

    Olee otú akụkọ Bible banyere Josef si gosi na Jehova pụrụ ịgbanwe atụmatụ e mere iji merụọ ndị ohu ya ahụ́ ịghọ nke ga-arụpụtazi ezi ihe? (Jen. 45:5-8; Aịsa. 8:10; Fil. 1:12-14)

  2. Gụọ Jenesis 46:1-27.

    Olee otú Jehova si mesie Jekọb obi ike mgbe ọ na-aga Ijipt? (Jen. 46:1-4)

Akụkọ nke 26

Job Kwesịrị Ntụkwasị Obi Nye Chineke

  1. Ònye bụ Job?

  2. Gịnị ka Setan nwara ime, ọ̀ gaara ya nke ọma?

  3. Gịnị ka Jehova kwere ka Setan mee, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

  4. N’ihi gịnị ka nwunye Job ji gwa ya ka ọ “gbakụta Chineke azụ, nwụọ”? (Lee foto.)

  5. Dị ka ị pụrụ ịhụ na foto nke abụọ a, olee otú Jehova si gọzie Job, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

  6. Ọ bụrụ na anyị ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova dị ka Job mere, olee ngọzi ndị anyị ga-enweta?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Job 1:1-22.

    Olee otú Ndị Kraịst taa pụrụ isi ṅomie Job? (Job 1:1; Fil. 2:15; 2 Pita 3:14)

  2. Gụọ Job 2:1-13.

    Olee ụzọ abụọ dịrịtara iche Job na nwunye ya si meghachi omume ná mkpagbu Setan? (Job 2:9, 10; Ilu 19:3; Maị. 7:7; Mal. 3:14)

  3. Gụọ Job 42:10-17.

    1. Olee otú ụgwọ ọrụ Job nwetara si yie ihe Jizọs nwetara maka ikwesị ntụkwasị obi? (Job 42:12; Fil. 2:9-11)

    2. Olee otú ngọzi a gọziri Job maka iguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke si agba anyị ume? (Job 42:10, 12; Hib. 6:10; Jems 1:2-4, 12; 5:11)

Akụkọ nke 27

Eze Ọjọọ Amalite Ịchị Ijipt

  1. Na foto a, ònye bụ nwoke a ji ụtarị, ònyekwa ka ọ na-apịa ya?

  2. Mgbe Josef nwụsịrị, gịnị mere ụmụ Izrel?

  3. N’ihi gịnị ka ndị Ijipt ji malite ịtụ ụmụ Izrel egwu?

  4. Olee iwu Fero nyere ụmụ nwaanyị na-enyere ndị inyom Izrel dị ime aka ịmụ nwa?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọpụpụ 1:6-22.

    1. Olee ụzọ Jehova si malite imezu nkwa o kwere Ebreham? (Ọpụ. 1:7; Jen. 12:2; Ọrụ 7:17)

    2. Olee otú ndị inyom Hibru na-enyere ndị dị ime aka ịmụ nwa si gosi nkwanye ùgwù maka ịdị nsọ nke ndụ? (Ọpụ. 1:17; Jen. 9:6)

    3. Olee otú e si kwụghachi ndị inyom ahụ na-ele ime ụgwọ maka ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ? (Ọpụ. 1:20, 21; Ilu 19:17)

    4. Olee otú Setan si nwaa imebi nzube Jehova banyere Mkpụrụ Ebreham e kwere ná nkwa? (Ọpụ. 1:22; Mat. 2:16)

Akụkọ nke 28

Ụzọ E Si Zọpụta Nwa Ọhụrụ Bụ́ Mozis

  1. Ònye bụ nwa ọhụrụ nke nọ na foto a, ọ̀ bụkwa mkpụrụ aka onye ka ọ na-ejide?

  2. Gịnị ka nne Mozis mere iji chebe nwa ya ka a ghara igbu ya?

  3. Ònye bụ nwa agbọghọ nta ahụ nke nọ na foto a, gịnịkwa ka o mere?

  4. Mgbe ada Fero hụrụ nwa ọhụrụ ahụ, olee aro Miriam tụụrụ ya?

  5. Gịnị ka adaeze ahụ gwara nne Mozis?

Ajụjụ ọzọ:

  1. Gụọ Ọpụpụ 2:1-10.

    Olee ohere nne Mozis nwere iji zụọ Mozis ma kụziere ya ihe mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ, ihe nlereanya dịkwa aṅaa ka nke a bụụrụ ndị nne na nna taa? (Ọpụ. 2:9, 10; Deut. 6:6-9; Ilu 22:6; Efe. 6:4; 2 Tim. 3:15)

Akụkọ nke 29

Ihe Mere Mozis Ji Gbaa Ọsọ

  1. Ebee ka Mozis nọ too, gịnịkwa ka ọ maara banyere ndị mụrụ ya?

  2. Gịnị ka Mozis mere mgbe ọ dị afọ iri anọ?

  3. Gịnị ka Mozis gwara onye Izrel nke na-alụ ọgụ, gịnịkwa ka nwoke ahụ zara ya?

  4. N’ihi gịnị ka Mozis ji si n’Ijipt gbapụ?

  5. Ebee ka Mozis gbagara, ònyekwa ka o zutere n’ebe ahụ?

  6. Gịnị ka Mozis mere n’ime afọ iri anọ sochirinụ ka o sichara n’Ijipt gbapụ?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọpụpụ 2:11-25.

    N’agbanyeghị ọtụtụ afọ o ji gụọ akwụkwọ iji nweta amamihe nke Ijipt, olee otú Mozis si gosipụta na ya na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova na ndị ya? (Ọpụ. 2:11, 12; Hib. 11:24)

  2. Gụọ Ọrụ 7:22-29.

    Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site ná mgbalị Mozis mere iji aka ya napụta ụmụ Izrel site n’agbụ Ijipt? (Ọrụ 7:23-25; 1 Pita 5:6, 10)

Akụkọ nke 30

Osisi nke Na-ere Ọkụ

  1. Olee aha ugwu e sere na foto a?

  2. Kọwaa ihe dị ịtụnanya nke Mozis hụrụ mgbe ọ chị atụrụ ya gbagoo n’ugwu ahụ?

  3. Gịnị ka otu olu nke sitere n’ebe osisi ahụ nke na-ere ọkụ dị kwuru, ònyekwa nwe olu ahụ?

  4. Gịnị ka Mozis zara mgbe Chineke gwara ya na ọ ga-edupụta ndị Chineke n’Ijipt?

  5. Gịnị ka Chineke gwara Mozis ka o kwuo ma ọ bụrụ na ndị Izrel ajụọ ya onye zitere ya?

  6. Olee otú Mozis ga-esi nwee ike igosi na ọ bụ Chineke zitere ya?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọpụpụ 3:1-22.

    Olee otú ahụmahụ Mozis si emesi anyị obi ike na ọ bụrụgodị na anyị echee na anyị erughị eru ịrụ ọrụ e nyere anyị n’ọgbakọ, Jehova ga-akwado anyị? (Ọpụ. 3:11, 13; 2 Kọr. 3:5, 6)

  2. Gụọ Ọpụpụ 4:1-20.

    1. Olee otú àgwà Mozis si gbanwee n’ime afọ iri anọ ahụ ọ nọrọ na Midian, gịnịkwa ka ndị na-agbalị iru eru inweta ihe ùgwù n’ọgbakọ pụrụ ịmụta site na nke a? (Ọpụ. 2:11, 12; 4:10, 13; Maị. 6:8; 1 Tim. 3:1, 6, 10)

    2. Ọ bụrụgodị na Jehova enye anyị ntaramahụhụ site ná nzukọ ya, olee obi ike ihe nlereanya Mozis pụrụ ime ka anyị nwee? (Ọpụ. 4:12-14; Ọma 103:14; Hib. 12:4-11)

Akụkọ nke 31

Mozis na Erọn Ejee Ịhụ Fero

  1. Olee mmetụta ọrụ ebube Mozis na Erọn rụrụ nwere n’ahụ́ ụmụ Izrel?

  2. Gịnị ka Mozis na Erọn gwara Fero, gịnịkwa ka Fero zara ha?

  3. Dị ka e gosiri na foto a, gịnị mere mgbe Erọn tụsara mkpanaka ya n’ala?

  4. Olee otú Jehova si kụziere Fero ihe, gịnịkwa ka Fero mere?

  5. Gịnị mere mgbe ihe otiti nke iri ahụ gasịrị?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọpụpụ 4:27-31 na 5:1-23.

    Gịnị ka Fero bu n’uche mgbe ọ sịrị: “Amaghị m onye Jehova bụ ma ọlị”? (Ọpụ. 5:2; 1 Sam. 2:12; Rom 1:21)

  2. Gụọ Ọpụpụ 6:1-13, 26-30.

    1. Olee otú o si bụrụ na Jehova emeghị ka Ebreham, Aịzik, na Jekọb mara ya? (Ọpụ. 3:13, 14; 6:3; Jen. 12:8)

    2. Olee mmetụta ịmara na Jehova ji Mozis rụọ ọrụ n’agbanyeghị na Mozis chere na ya erughị eru ịrụ ọrụ e nyere ya na-enwe n’ahụ́ anyị? (Ọpụ. 6:12, 30; Luk 21:13-15)

  3. Gụọ Ọpụpụ 7:1-13.

    1. Mgbe Mozis na Erọn ji obi ike gwa Fero ikpe Jehova mara ya, ihe nlereanya dị aṅaa ka ha setịpụụrụ ndị ohu Chineke taa? (Ọpụ. 7:2, 3, 6; Ọrụ 4:29-31)

    2. Olee otú Jehova si gosi na ya karịrị chi niile nke Ijipt? (Ọpụ. 7:12; 1 Ihe 29:12)

Akụkọ nke 32

Ihe Otiti Iri Ahụ

  1. Site n’iji foto ndị dị n’ebe a mee ihe, kọwaa ihe otiti atọ mbụ Jehova tiri Ijipt.

  2. Olee ihe dị iche n’ihe otiti atọ mbụ na ihe otiti ndị ọzọ?

  3. Gịnị bụ ihe otiti nke anọ, nke ise, na nke isii?

  4. Kọwaa ihe otiti nke asaa, nke asatọ na nke itoolu?

  5. Gịnị ka Jehova gwara ụmụ Izrel ka ha mee tupu ihe otiti nke iri amalite?

  6. Gịnị bụ ihe otiti nke iri, gịnịkwa mere mgbe ọ gasịrị?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọpụpụ 7:19– 8:23.

    1. Ọ bụ ezie na ndị na-eme anwansi n’Ijipt meghachiri ihe otiti abụọ mbụ nke Jehova, gịnị ka a manyere ha ikweta mgbe ihe otiti nke atọ gasịrị? (Ọpụ. 8:18, 19; Mat. 12:24-28)

    2. Olee otú ihe otiti nke anọ si gosipụta ikike Jehova nwere ichebe ndị ya, mmetụta dịkwa aṅaa ka ịmara nke a na-enwe n’ahụ́ ndị Chineke ka ha na-eche “mkpagbu ukwu” ahụ e buru n’amụma ihu? (Ọpụ. 8:22, 23; Mkpu. 7:13, 14; 2 Ihe 16:9)

  2. Gụọ Ọpụpụ 8:24; 9:3, 6, 10, 11, 14, 16, 23-25; na 10:13-15, 21-23.

    1. Olee òtù abụọ Fero na ndị na-eme anwansi na-anọchi anya ha, olee ihe òtù abụọ a na-enweghị ike ime taa? (Ọpụ. 8:10, 18, 19; 9:14)

    2. Olee otú Ọpụpụ 9:16 si enyere anyị aka ịghọta ihe mere Jehova ji kwere ka Setan nọgide ruo ugbu a? (Rom 9:21, 22)

  3. Gụọ Ọpụpụ 12:21-32.

    Olee otú Ememe Ngabiga ahụ si mee ka o kwe omume ịzọpụta ọtụtụ mmadụ, gịnịkwa ka Ememe Ngabiga ahụ na-ezo aka na ya? (Ọpụ. 12:21-23; Jọn 1:29; Rom 5:18, 19, 21; 1 Kọr. 5:7)

Akụkọ nke 33

Ịgafe Oké Osimiri Uhie

  1. Ndị ikom Izrel ole, tinyere ndị inyom na ụmụaka, si n’Ijipt pụọ, oleekwa ndị so ha pụọ?

  2. Olee otú ọ dị Fero mgbe ọ hapụsịrị ụmụ Izrel ka ha laa, gịnịkwa ka o mere?

  3. Gịnị ka Jehova mere iji gbochie ndị Ijipt ịwakpo ndị ya?

  4. Gịnị mere mgbe Mozis tiri mkpara ya n’Oké Osimiri Uhie ahụ, gịnịkwa ka ụmụ Izrel mere?

  5. Gịnị mere mgbe ndị Ijipt chụụrụ ụmụ Izrel banye n’oké osimiri ahụ?

  6. Olee otú ụmụ Izrel si gosi na ha nwere obi ụtọ na obi ekele n’ebe Jehova nọ maka nzọpụta a zọpụtara ha?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọpụpụ 12:33-36.

    Olee ihe Jehova mere iji hụ na a kwụghachiri ndị ya ụgwọ maka afọ niile ha ji gbaara ndị Ijipt ohu? (Ọpụ. 3:21, 22; 12:35, 36)

  2. Gụọ Ọpụpụ 14:1-31.

    Olee otú okwu Mozis nke e dekọrọ n’Ọpụpụ 14:13, 14 si emetụta ndị ohu Jehova taa ka ha na-eche agha Amagedọn na-abịanụ ihu? (2 Ihe 20:17; Ọma 91:8)

  3. Gụọ Ọpụpụ 15:1-8, 20, 21.

    1. N’ihi gịnị ka ndị ohu Jehova ji kwesị ịbụ abụ otuto nye ya? (Ọpụ. 15:1, 2; Ọma 105:2, 3; Mkpu. 15:3, 4)

    2. Ka ha nọ n’Oké Osimiri Uhie ahụ, olee ihe nlereanya Miriam na ndị inyom ndị ọzọ setịpụụrụ ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst taa n’ihe banyere inye Jehova otuto? (Ọpụ. 15:20, 21; Ọma 68:11)

Akụkọ nke 34

Ụdị Ihe Oriri Ọhụrụ

  1. Na foto a, gịnị ka ndị a na-atụtụ n’ala, gịnị ka a na-akpọ ya?

  2. Olee ntụziaka Mozis nyere ụmụ Izrel banyere ịtụtụrụ mana?

  3. Gịnị ka Jehova gwara ụmụ Izrel ka ha mee n’ụbọchị nke isii, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

  4. Olee ọrụ ebube Jehova rụrụ mgbe e debere mana ahụ ruo n’ụbọchị nke asaa?

  5. Ogologo oge hà aṅaa ka Jehova ji mana zụọ ụmụ Izrel?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọpụpụ 16:1-36 na Ọnụ Ọgụgụ 11:7-9.

    1. Gịnị ka Ọpụpụ 16:8 na-egosi banyere mkpa ọ dị anyị ịkwanyere ndị a họpụtara n’ọgbakọ ùgwù? (Hib. 13:17)

    2. N’ọzara, olee otú e si na-echetara ụmụ Izrel kwa ụbọchị na ndụ ha dabeere n’ebe Jehova nọ? (Ọpụ. 16:14-16, 35; Deut. 8:2, 3)

    3. Olee ihe Jizọs sịrị na mana ahụ na-anọchi anya ya, oleekwa otú anyị si erite uru site ‘n’achịcha a nke sitere n’eluigwe’? (Jọn 6:31-35, 40)

  2. Gụọ Joshua 5:10-12.

    Afọ ole ka ụmụ Izrel riri mana, oleekwa otú nke a si nwalee okwukwe ha, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site n’akụkọ a? (Ọpụ. 16:35; Ọnụ Ọgụ. 11:4-6; 1 Kọr. 10:10, 11)

Akụkọ nke 35

Jehova Enye Iwu Ya

  1. Ebee ka ụmụ Izrel mara ụlọikwuu ha ihe dị ka ọnwa abụọ ka ha hapụsịrị Ijipt?

  2. Gịnị ka Jehova kwuru na ya chọrọ ka ụmụ Izrel mee, gịnịkwa ka ha zara?

  3. N’ihi gịnị ka Jehova ji nye Mozis mbadamba nkume abụọ?

  4. E wezụga Iwu Iri ahụ, olee iwu ndị ọzọ Jehova nyere ụmụ Izrel?

  5. Olee iwu abụọ Jizọs Kraịst sịrị na ọ bụ ha kachasị iwu niile?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọpụpụ 19:1-25; 20:1-21; 24:12-18; na 31:18.

    Olee otú okwu ndị e dekọrọ n’Ọpụpụ 19:8 si enyere anyị aka ịghọta ihe Onye Kraịst ịrara onwe ya nye Chineke gụnyere? (Mat. 16:24; 1 Pita 4:1-3)

  2. Gụọ Deuterọnọmi 6:4-6; Levitikọs 19:18; na Matiu 22:36-40.

    Olee otú Ndị Kraịst si egosi na ha hụrụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya? (Mak 6:34; Ọrụ 4:20; Rom 15:2)

Akụkọ nke 36

Nwa Ehi Ọlaedo

  1. Gịnị ka ndị nọ na foto a na-eme, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

  2. N’ihi gịnị ka Jehova ji wee iwe, gịnịkwa ka Mozis mere mgbe ọ hụrụ ihe ụmụ Izrel na-eme?

  3. Gịnị ka Mozis gwara ụfọdụ ndị ikom ka ha mee?

  4. Gịnị ka akụkọ a kwesịrị ịkụziri anyị?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọpụpụ 32:1-35.

    1. Olee otú akụkọ a si egosi otú Jehova si ele ịgwakọta ofufe ụgha na ezi ofufe anya? (Ọpụ. 32:4-6, 10; 1 Kọr. 10:7, 11)

    2. Olee ihe Ndị Kraịst kwesịrị ịkpachara anya maka ya mgbe ha na-ahọrọ ihe ntụrụndụ, dị ka ịgụ uri na ịgba egwú? (Ọpụ. 32:18, 19; Efe. 5:15, 16; 1 Jọn 2:15-17)

    3. Olee otú ebo Livaị si gosipụta ezi ihe nlereanya n’ịkwado ezi omume? (Ọpụ. 32:25-28; Ọma 18:25)

Akụkọ nke 37

Ụlọ Ntu A Na-anọ Efe Ofufe

  1. Gịnị ka a na-akpọ ụlọ dị na foto a, gịnịkwa ka e ji ya eme?

  2. N’ihi gịnị ka Jehova ji gwa Mozis ka o mee ụlọ ntu ahụ otú ọ ga-adị mfe iwepụtagasị akụkụ ya dị iche iche?

  3. Igbe ahụ dị n’obere ụlọ nke dị n’isi isi nke ụlọ ntu ahụ ọ̀ bụ igbe gịnị, gịnịkwa dị n’ime igbe ahụ?

  4. Ònye ka Jehova họọrọ ịbụ nnukwu onyeisi nchụàjà, gịnịkwa bụ ọrụ onyeisi nchụàjà?

  5. Kpọọ aha ihe atọ dị n’ime ụlọ ka saa mbara nke ụlọ ntu ahụ.

  6. Olee ihe abụọ dị n’ogige nke ụlọikwuu ahụ, gịnịkwa ka e ji ha eme?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọpụpụ 25:8-40; 26:1-37; 27:1-8; na 28:1.

    Gịnị ka ndị cherub nọ n’elu “igbe ihe àmà ahụ” na-ese onyinyo ya? (Ọpụ. 25:20, 22; Ọnụ Ọgụ. 7:89; 2 Eze 19:15)

  2. Gụọ Ọpụpụ 30:1-10, 17-21; 34:1, 2; na Ndị Hibru 9:1-5.

    1. N’ihi gịnị ka Jehova ji kwusie okwu ike banyere mkpa ọ dị ndị nchụàjà na-eje ozi n’ụlọikwuu ahụ ịnọgide na-adị ọcha, oleekwa otú nke a kwesịrị isi metụta anyị taa? (Ọpụ. 30:18-21; 40:30, 31; Hib. 10:22)

    2. Olee otú Pọl onyeozi si gosi na ụlọikwuu ahụ na ọgbụgba ndụ Iwu ahụ adịghịzi irè mgbe o degaara Ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst akwụkwọ ozi? (Hib. 9:1, 9; 10:1)

Akụkọ nke 38

Ndị Nledo Iri na Abụọ

  1. Gịnị ka ị chọpụtara banyere ụyọkọ mkpụrụ fig dị na foto a, ebeekwa ka e si bute ha?

  2. N’ihi gịnị ka Mozis ji ziga ndị nledo iri na abụọ na Kenan?

  3. Gịnị ka ndị nledo iri kwuru mgbe ha na-akọrọ Mozis ihe ha jetara?

  4. Olee otú ndị nledo abụọ si gosi na ha tụkwasịrị Jehova obi, gịnịkwa bụ aha ha?

  5. N’ihi gịnị ka Jehova ji wee iwe, gịnịkwa ka ọ gwara Mozis?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 13:1-33.

    1. Ole ndị ka a họọrọ ịga ledoo ala ahụ, ohere ọma dịkwa aṅaa ka ha nwere? (Ọnụ Ọgụ. 13:2, 3, 18-20)

    2. N’ihi gịnị ka echiche Jọshụa na Keleb ji dị iche na nke ndị nledo ndị ọzọ, gịnịkwa ka nke a na-akụziri anyị? (Ọnụ Ọgụ. 13:28-30; Mat. 17:20; 2 Kọr. 5:7)

  2. Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 14:1-38.

    1. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa banyere ịtamu ntamu megide ndị na-anọchite anya Jehova n’elu ala ka anyị kwesịrị ịṅa ntị na ya? (Ọnụ Ọgụ. 14:2, 3, 27; Mat. 25:40, 45; 1 Kọr. 10:10)

    2. Olee otú Ọnụ Ọgụgụ 14:24 si egosi na Jehova nwere mmasị n’ebe ohu ya nke ọ bụla nọ? (1 Eze 19:18; Ilu 15:3)

Akụkọ nke 39

Okooko Osisi Epuo na Mkpanaka Erọn

  1. Ole ndị nupụrụ isi megide ịbụisi Mozis na Erọn, gịnịkwa ka ha gwara Mozis?

  2. Gịnị ka Mozis gwara Kora na narị mmadụ abụọ na iri ise na-akwado Kora ka ha mee?

  3. Gịnị ka Mozis gwara ụmụ Izrel, gịnịkwa mere ozugbo ọ gwasịrị ha okwu?

  4. Gịnị mere Kora na narị mmadụ abụọ na iri ise ndị na-akwado ya?

  5. Gịnị ka Elieza nwa Erọn mere ihe ịgụ ọkụ nke ndị ahụ nwụrụ anwụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

  6. N’ihi gịnị ka Jehova ji mee ka okooko osisi puo na mkpanaka Erọn? (Lee foto.)

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 16:1-49.

    1. Gịnị ka Kora na ndị na-akwado ya mere, oleekwa ihe mere o ji bụrụ nnupụisi megide Jehova? (Ọnụ Ọgụ. 16:9, 10, 18; Lev. 10:1, 2; Ilu 11:2)

    2. Echiche dị aṅaa na-ezighị ezi ka Kora na ‘ndị isi nzukọ’ dị narị abụọ na iri ise nwere? (Ọnụ Ọgụ. 16:1-3; Ilu 15:33; Aịsa. 49:7)

  2. Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 17:1-11 na 26:10.

    1. Gịnị ka okooko osisi puru na mkpanaka Erọn na-egosi, n’ihi gịnịkwa ka Jehova ji kwuo ka e debe mkpanaka ahụ n’ime igbe ahụ? (Ọnụ Ọgụ. 17:5, 8, 10)

    2. Olee ihe dị oké mkpa nke anyị na-amụta site n’okooko osisi nke puru na mkpanaka Erọn? (Ọnụ Ọgụ. 17:10; Ọrụ 20:28; Fil. 2:14; Hib. 13:17)

Akụkọ nke 40

Mozis Etie Nkume Ihe

  1. Olee otú Jehova si lekọta ụmụ Izrel mgbe ha nọ n’ọzara?

  2. Mkpesa dị aṅaa ka ụmụ Izrel mere mgbe ha mara ụlọikwuu ha na Kedesh?

  3. Olee otú Jehova si nye ndị ya na anụmanụ ha mmiri?

  4. Na foto a, ònye bụ nwoke ahụ nke na-atụ onwe ya aka, gịnịkwa mere o ji na-eme otú ahụ?

  5. N’ihi gịnị ka Jehova ji wesa Mozis na Erọn iwe, oleekwa ntaramahụhụ o nyere ha?

  6. Gịnị mere n’Ugwu Họọ, ònyekwa ghọrọ onyeisi nchụàjà nke Izrel?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 20:1-13, 22-29 na Deuterọnọmi 29:5.

    1. Gịnị ka anyị na-amụta site n’ụzọ Jehova si lekọta ụmụ Izrel n’ọzara? (Deut. 29:5; Mat. 6:31; Hib. 13:5; Jems 1:17)

    2. Olee otú Jehova si lee odido Mozis na Erọn na-edoghị ya nsọ n’ihu Izrel, anya? (Ọnụ Ọgụ. 20:12; 1 Kọr. 10:12; Mkpu. 4:11)

    3. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ụzọ Mozis si meghachi omume na ntaramahụhụ Jehova nyere ya? (Ọnụ Ọgụ. 12:3; 20:12, 27, 28; Deut. 32:4; Hib. 12:7-11)

Akụkọ nke 41

Agwọ Ọla Kọpa

  1. Na foto a, gịnị bụ ihe a a gbakụrụ n’osisi, n’ihi gịnịkwa ka Jehova ji gwa Mozis ka ọ gbakụọ ya n’ebe ahụ?

  2. Olee otú ụmụ Izrel si gosi na ha enweghị ekele maka ihe niile Chineke meere ha?

  3. Gịnị ka ụmụ Izrel gwara Mozis ka o mee mgbe Jehova zigasịrị agwọ ọjọọ iji taa ha ahụhụ?

  4. N’ihi gịnị ka Jehova ji gwa Mozis ka o mee agwọ ọla kọpa?

  5. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’akụkọ a?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 21:4-9.

    1. Olee otú mkpesa ụmụ Izrel mere banyere ihe ndị Jehova nyere ha si bụrụ ihe ịdọ aka ná ntị nye anyị? (Ọnụ Ọgụ. 21:5, 6; Rom 2:4)

    2. Olee ihe ụmụ Izrel ji agwọ ọla kọpa ahụ mee ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, gịnịkwa ka Eze Hezekaya mere? (Ọnụ Ọgụ. 21:9; 2 Eze 18:1-4)

  2. Gụọ Jọn 3:14, 15.

    Olee otú ịgbakụ agwọ ọla kọpa ahụ n’osisi e ji mere ihe nnọchianya si see onyinyo mkpọgide a kpọgidere Jizọs Kraịst n’osisi? (Gal. 3:13; 1 Pita 2:24)

Akụkọ nke 42

Ịnyịnya Ibu Ekwuo Okwu

  1. Ònye bụ Belak, n’ihi gịnịkwa ka o ji zie ozi ka Belam bịa?

  2. N’ihi gịnị ka ịnyịnya ibu Belam ji makpuru n’okporo ụzọ?

  3. Gịnị ka Belam nụrụ ịnyịnya ibu ya na-ekwu?

  4. Gịnị ka mmụọ ozi gwara Belam?

  5. Gịnị mere mgbe Belam nwara ịkọcha ụmụ Izrel?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 21:21-35.

    N’ihi gịnị ka Izrel ji merie Eze Saịhọn nke Amọraịt na Eze Ọg nke Beshan? (Ọnụ Ọgụ. 21:21, 23, 33, 34)

  2. Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 22:1-40.

    Gịnị ka Belam bu n’obi mere o ji gbalịa ịkọcha Izrel, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a? (Ọnụ Ọgụ. 22:16, 17; Ilu 6:16, 18; 2 Pita 2:15; Jud 11)

  3. Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 23:1-30.

    Ọ bụ ezie na Belam kwuru okwu ka à ga-asị na ọ bụ onye na-efe Jehova, olee otú omume ya si gosi na ọ bụghị? (Ọnụ Ọgụ. 23:3, 11-14; 1 Sam. 15:22)

  4. Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 24:1-25.

    Olee otú akụkọ Bible a si eme ka anyị nwekwuo obi ike na nzube Jehova ga-emezu? (Ọnụ Ọgụ. 24:10; Aịsa. 54:17)

Akụkọ nke 43

Jọshụa Aghọọ Onye Ndú

  1. Na foto a, ole ndị bụ ndị ikom ahụ ha na Mozis guzo?

  2. Gịnị ka Jehova gwara Jọshụa?

  3. N’ihi gịnị ka Mozis ji rịgoo n’Ugwu Nebo, gịnịkwa ka Jehova gwara ya?

  4. Afọ ole ka Mozis dị mgbe ọ nwụrụ?

  5. N’ihi gịnị ka ụmụ Izrel ji na-enwe mwute, oleekwanụ ihe mere ha ga-eji nwee obi ụtọ?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 27:12-23.

    Olee nnukwu ọrụ Jehova nyere Jọshụa, oleekwa otú Jehova si elekọta ndị Ya taa? (Ọnụ Ọgụ. 27:15-19; Ọrụ 20:28; Hib. 13:7)

  2. Gụọ Deuterọnọmi 3:23-29.

    Gịnị mere Jehova ekweghị ka Mozis na Erọn banye n’ala nkwa ahụ, gịnịkwa ka anyị na-amụta site na nke a? (Deut. 3:25-27; Ọnụ Ọgụ. 20:12, 13)

  3. Gụọ Deuterọnọmi 31:1-8, 14-23.

    Olee otú okwu ikpeazụ Mozis gwara ụmụ Izrel si gosi na o ji umeala n’obi nakwere ntaramahụhụ Jehova nyere ya? (Deut. 31:6-8, 23)

  4. Gụọ Deuterọnọmi 32:45-52.

    Olee otú Okwu Chineke kwesịrị isi metụta ndụ anyị? (Deut. 32:47; Lev. 18:5; Hib. 4:12)

  5. Gụọ Deuterọnọmi 34:1-12.

    Ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe Mozis ji anya nkịtị hụ Jehova, gịnị ka Deuterọnọmi 34:10 na-agwa anyị banyere mmekọrịta ya na Jehova? (Ọpụ. 33:11, 20; Ọnụ Ọgụ. 12:8)

Akụkọ nke 44

Rehab Ezobe Ndị Nledo

  1. Ebee ka Rehab bi?

  2. Ole ndị bụ ndị ikom abụọ a nọ na foto a, gịnịkwa ka ha gara ime na Jeriko?

  3. Gịnị ka eze Jeriko nyere Rehab iwu ka o mee, gịnịkwa ka Rehab zara ya?

  4. Olee otú Rehab si nyere ndị ikom abụọ ahụ aka, gịnịkwa ka ọ rịọrọ ha ka ha meere ya?

  5. Gịnị ka ndị nledo abụọ ahụ kwere Rehab ná nkwa?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Joshua 2:1-24.

    Olee otú nkwa Jehova nke e dekọrọ n’Ọpụpụ 23:28 si mezuo mgbe ndị Izrel bịara ibuso Jeriko agha? (Josh. 2:9-11)

  2. Gụọ Ndị Hibru 11:31

    Olee otú akụkọ banyere Rehab si egosi mkpa ọ dị inwe okwukwe? (Rom 1:17; Hib. 10:39; Jems 2:25)

Akụkọ nke 45

Ịgafe Osimiri Jọdan

  1. Ọrụ ebube dị aṅaa ka Jehova rụrụ ka ndị Izrel wee nwee ike ịgafe Osimiri Jọdan?

  2. Olee ihe ụmụ Izrel na-aghaghị iji okwukwe mee iji nwee ike ịgafe Osimiri Jọdan?

  3. N’ihi gịnị ka Jehova ji gwa Jọshụa ka o si n’akụkụ Osimiri Jọdan bukọta nnukwu nkume iri na abụọ?

  4. Gịnị mere ozugbo ndị nchụàjà si n’Osimiri Jọdan pụta?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Joshua 3:1-17.

    1. Dị ka akụkọ a si gosi, gịnị ka anyị kwesịrị ime iji nweta enyemaka na ngọzi Jehova? (Josh. 3:13, 15; Ilu 3:5; Jems 2:22, 26)

    2. Gịnị mere Osimiri Jọdan mgbe ụmụ Izrel gafere ya banye n’Ala Nkwa ahụ, oleekwa otú nke a si wetara aha Jehova otuto? (Josh. 3:15; 4:18; Ọma 66:5-7)

  2. Gụọ Joshua 4:1-18.

    Olee nzube e ji maka ya si na Jọdan buru nkume iri na abụọ ahụ ma tụkọta ha na Gilgal? (Josh. 4:4-7)

Akụkọ nke 46

Mgbidi Jeriko

  1. Gịnị ka Jehova gwara ndị agha na ndị nchụàjà ka ha mee ruo ụbọchị isii?

  2. Gịnị ka ha ga-eme n’ụbọchị nke asaa?

  3. Dị ka ị na-ahụ na foto a, gịnị na-eme mgbidi Jeriko?

  4. N’ihi gịnị ka e ji kwụnye eriri uhie na windo a?

  5. Gịnị ka Jọshụa gwara ndị agha ka ha mee ndị obodo ahụ na obodo ha, gịnịkwa ka ọ gwara ha mee ọlaọcha, ọlaedo, ọla kọpa, na ígwè?

  6. Gịnị ka a gwara ndị nledo abụọ ahụ ka ha gaa mee?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Joshua 6:1-25.

    1. Olee otú gburugburu ụmụ Izrel gbara Jeriko n’ụbọchị nke asaa si yie ọrụ nkwusa nke Ndịàmà Jehova na-arụ n’ụbọchị ikpeazụ ndị a? (Josh. 6:15, 16; Aịsa. 60:22; Mat. 24:14; 1 Kọr. 9:16)

    2. Olee otú amụma e dekọrọ na Joshua 6:26 si mezuo mgbe ihe dị ka narị afọ ise gasịrị, gịnịkwa ka nke a na-akụziri anyị banyere okwu Jehova? (1 Eze 16:34; Aịsa. 55:11)

Akụkọ nke 47

Otu Onye Ohi Nọ n’Izrel

  1. Na foto a, ònye bụ nwoke a nke na-eli akụ̀ ndị e wetara na Jeriko n’ala, ole ndị bụkwa ndị ahụ na-enyere ya aka?

  2. N’ihi gịnị ka ihe Ekan na ezinụlọ ya mere ji dị oké njọ?

  3. Gịnị ka Jehova kwuru mgbe Jọshụa jụrụ ihe mere e ji merie ndị Izrel n’agha na E-aị?

  4. Mgbe a kpọtara Ekan na ezinụlọ ya n’ihu Jọshụa, gịnị ka e mere ha?

  5. Olee ihe dị mkpa nke ikpe a mara Ekan na-akụziri anyị?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Joshua 7:1-26.

    1. Gịnị ka ekpere Jọshụa na-egosi banyere mmekọrịta ya na Onye kere ya? (Josh. 7:7-9; Ọma 119:145; 1 Jọn 5:14)

    2. Gịnị ka akụkọ banyere Ekan na-egosi, oleekwa otú nke a si bụrụ ihe ịdọ aka ná ntị nye anyị? (Josh. 7:11, 14, 15; Ilu 15:3; 1 Tim. 5:24; Hib. 4:13)

  2. Gụọ Joshua 8:1-29.

    Ibu ọrụ dị aṅaa ka anyị nwere n’ebe ọgbakọ Ndị Kraịst dị taa? (Josh. 7:13; Lev. 5:1; Ilu 28:13)

Akụkọ nke 48

Ndị Gibiọn Bụ́ Ndị Maara Ihe

  1. Olee otú ndị Gibiọn si dị iche ma e jiri ha tụnyere ndị Kenan bi n’obodo ndị dị ha nso?

  2. Dị ka e gosiri na foto a, gịnị ka ndị Gibiọn mere, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

  3. Nkwa dị aṅaa ka Jọshụa na ndị ndú ndị Izrel kwere ndị Gibiọn, ma gịnị ka ha chọpụtara mgbe ụbọchị atọ gasịrị?

  4. Olee ihe mere mgbe ndị eze nke obodo ndị ọzọ nụrụ na ndị Gibiọn esorowo ndị Izrel mee udo?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Joshua 9:1-27.

    1. Ebe ọ bụ na Jehova nyere mba Izrel ntụziaka ka ha ‘kpochapụ ndị niile bi n’ala ahụ,’ olee àgwà ya nke nchebe o chebere ndị Gibiọn na-eme ka ọ pụta ìhè? (Josh. 9:22, 24; Mat. 9:13; Ọrụ 10:34, 35; 2 Pita 3:9)

    2. Site n’idebe ọgbụgba ndụ ya na ndị Gibiọn, olee otú Jọshụa si setịpụrụ Ndị Kraịst ezi ihe nlereanya taa? (Josh. 9:18, 19; Mat. 5:37; Efe. 4:25)

  2. Gụọ Joshua 10:1-5.

    Olee otú oké ìgwè mmadụ ahụ si eṅomi ndị Gibiọn taa, oleekwa ihe nke a na-akpatara ha? (Josh. 10:4; Zek. 8:23; Mat. 25:35-40; Mkpu. 12:17)

Akụkọ nke 49

Anyanwụ Akwụrụ Otu Ebe

  1. Na foto a, gịnị ka Jọshụa na-ekwu, n’ihi gịnịkwa?

  2. Olee otú Jehova si nyere Jọshụa na ndị agha ya aka?

  3. Ndị eze ole bụ́ ndị iro Izrel ka Jọshụa meriri, ogologo oge hakwa aṅaa ka o were ya?

  4. N’ihi gịnị ka Jọshụa ji kewaa ala Kenan?

  5. Afọ ole ka Jọshụa gbara tupu ya anwụọ, gịnịkwa mere ndị Izrel mgbe ọ nwụsịrị?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Joshua 10:6-15.

    Obi ike dị aṅaa ka ịmara na Jehova mere ka anyanwụ na ọnwa kwụrụ otu ebe maka ndị Izrel na-eme ka anyị nwee taa? (Josh. 10:8, 10, 12, 13; Ọma 18:3; Ilu 18:10)

  2. Gụọ Joshua 12:7-24.

    Ònye n’ezie meriri ndị eze iri atọ na otu na-achị n’ala Kenan, oleekwa ihe mere nke a ji dị anyị mkpa taa? (Josh. 12:7; 24:11-13; Deut. 31:8; Luk 21:9, 25-28)

  3. Gụọ Joshua 14:1-5.

    Olee otú e si keere agbụrụ ndị dị n’Izrel ala ahụ, oleekwa ihe nke a na-egosi banyere ihe nketa na Paradaịs? (Josh. 14:2; Aịsa. 65:21; Ezik. 47:21-23; 1 Kọr. 14:33)

  4. Gụọ Ndị Ikpe 2:8-13.

    Dị ka Jọshua mere n’Izrel, ole ndị na-egbochi ndị mmadụ taa isi n’ezi ofufe dapụ? (Ikpe 2:8, 10, 11; Mat. 24:45-47; 2 Tesa. 2:3-6; Taị. 1:7-9; Mkpu. 1:1; 2:1, 2)

Akụkọ nke 50

Ndị Inyom Abụọ Ndị Nwere Obi Ike

  1. Ole ndị bụ ndị ikpe, gịnịkwa bụ aha ụfọdụ n’ime ha?

  2. Ihe ùgwù dị aṅaa pụrụ iche ka Debọra nwere, gịnịkwa ka nke a gụnyere?

  3. Mgbe Eze Jabin na ọchịagha ya, bụ́ Sisera, yiri Izrel egwu, ozi dị aṅaa sitere n’aka Jehova ka Debọra ziri Onyeikpe bụ́ Berak, ònyekwa ka o kwuru na otuto ga-agara?

  4. Olee otú Jel si gosi na ya bụ nwaanyị nwere obi ike?

  5. Gịnị mere mgbe Eze Jabin nwụsịrị?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ndị Ikpe 2:14-22.

    Olee otú ụmụ Izrel si mee ka Jehova wesa ha iwe, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a? (Ikpe 2:20; Ilu 3:1, 2; Ezik. 18:21-23)

  2. Gụọ Ndị Ikpe 4:1-24.

    Gịnị ka ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst taa pụrụ ịmụta banyere okwukwe na obi ike site n’ihe nlereanya Debọra na Jel? (Ikpe 4:4, 8, 9, 14, 21, 22; Ilu 31:30; 1 Kọr. 16:13)

  3. Gụọ Ndị Ikpe 5:1-31.

    Olee otú a pụrụ isi jiri abụ mmeri nke Berak na Debọra mere ekpere banyere agha Amagedọn na-abịanụ? (Ikpe 5:3, 31; 1 Ihe 16:8-10; Mkpu. 7:9, 10; 16:16; 19:19-21)

Akụkọ nke 51

Rut na Neomi

  1. Olee ihe mere Neomi ji gaa biri n’ala Moab?

  2. Rut na Ọpa hà bụ ole ndị?

  3. Olee otú Rut na Ọpa sicha meghachi omume mgbe Neomi gwara ha ka ha laghachikwuru ndị mụrụ ha?

  4. Ònye bụ Boaz, oleekwa otú o si nyere Rut na Neomi aka?

  5. Gịnị bụ aha nwa Rut na Boaz mụtara, oleekwa ihe mere anyị ji kwesị icheta ya?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Rut 1:1-17.

    1. Olee ihe Rut kwuru nke na-egosi na o nwere ịhụnanya na-adịghị ada ada n’ebe Neomi nọ? (Rut 1:16, 17)

    2. Olee otú àgwà Rut si yie nnọọ àgwà “atụrụ ọzọ” ahụ nwere n’ebe ndị e tere mmanụ nọ n’ụwa taa nọ? (Jọn 10:16; Zek. 8:23)

  2. Gụọ Rut 2:1-23.

    Olee otú Rut si bụrụ ezi ihe nlereanya nye ụmụ agbọghọ taa? (Rut 2:17, 18; Ilu 23:22; 31:15)

  3. Gụọ Rut 3:5-13.

    1. Olee otú Boaz si lee nkwere Rut kweere ịlụ ya kama ịlụ nwa okorobịa, anya?

    2. Gịnị ka àgwà Rut na-akụziri anyị banyere ịhụnanya na-adịghị ada ada? (Rut 3:10; 1 Kọr. 13:4, 5)

  4. Gụọ Rut 4:7-17.

    Olee otú ndị ikom bụ́ Ndị Kraịst taa pụrụ isi mee ka Boaz? (Rut 4:9, 10; 1 Tim. 3:1, 12, 13; 5:8)

Akụkọ nke 52

Gidiọn na Narị Ndị Ikom Atọ Ya

  1. Olee otú ụmụ Izrel si banye ná nnukwu nsogbu, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

  2. N’ihi gịnị ka Jehova ji gwa Gidiọn na ndị agha ya karịrị akarị?

  3. Mmadụ ole fọrọ mgbe Gidiọn gwara ndị nke egwu ji ka ha laa?

  4. Dị ka e gosiri na foto a, kọwaa otú Jehova si gbubilata ọnụ ọgụgụ ndị agha Gidiọn ruo na naanị narị mmadụ atọ.

  5. Olee otú Gidiọn si hazie narị ndị ikom atọ ya, oleekwa otú Izrel si merie n’agha ahụ?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ndị Ikpe 6:36-40.

    1. Olee otú Gidiọn si mara ihe bụ́ uche Jehova n’ezie?

    2. Olee otú anyị si achọpụta ihe bụ́ uche Jehova taa? (Ilu 2:3-6; Mat. 7:7-11; 2 Tim. 3:16, 17)

  2. Gụọ Ndị Ikpe 7:1-25.

    1. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’aka narị ndị ikom atọ ahụ dị nkọ ma e jiri ha tụnyere ndị ahụ na-adịghị nkọ? (Ikpe 7:3, 6; Rom 13:11, 12; Efe. 5:15-17)

    2. Dị nnọọ ka narị ndị ikom atọ ahụ mụtara ihe site n’ile Gidiọn anya, olee otú anyị si amụta ihe site n’ile Gidiọn ahụ ka Ukwuu, bụ́ Jizọs Kraịst, anya? (Ikpe 7:17; Mat. 11:29, 30; 28:19, 20; 1 Pita 2:21)

    3. Olee otú Ndị Ikpe 7:21 si enyere anyị aka inwe afọ ojuju ije ozi n’ebe e kenyere anyị ije ozi ná nzukọ Jehova? (1 Kọr. 4:2; 12:14-18; Jems 4:10)

  3. Gụọ Ndị Ikpe 8:1-3.

    Mgbe a bịara n’idozi esemokwu n’etiti anyị na nwanna anyị, gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ụzọ Gidiọn si dozie esemokwu dị n’etiti ya na ndị Ifrem? (Ilu 15:1; Mat. 5:23, 24; Luk 9:48)

Akụkọ nke 53

Nkwa Jefta Kwere

  1. Ònye bụ Jefta, oleekwa mgbe ọ dịrị ndụ?

  2. Olee nkwa Jefta kwere Jehova?

  3. N’ihi gịnị ka Jefta ji nwee mwute mgbe ọ lọtara ka o merisịrị ndị Amọn?

  4. Gịnị ka ada Jefta kwuru mgbe ọ matara nkwa nna ya kwere?

  5. N’ihi gịnị ka ndị Izrel ji hụ ada Jefta n’anya?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ndị Ikpe 10:6-18.

    Olee ịdọ aka ná ntị anyị kwesịrị ịṅa ntị na ya bụ́ nke anyị na-enweta n’ihe ndekọ banyere ekwesịghị ntụkwasị obi nke Izrel? (Ikpe 10:6, 15, 16; Rom 15:4; Mkpu. 2:10)

  2. Gụọ Ndị Ikpe 11:1-11, 29-40.

    1. Olee otú anyị si mara na onyinye Jefta nyere ada ya dị ka “àjà nsure ọkụ” apụtaghị na o surere ya n’ọkụ dị ka àjà e ji mmadụ chụọ? (Ikpe 11:31; Lev. 16:24; Deut. 18:10, 12)

    2. N’ụzọ dị aṅaa ka Jefta si chụọ ada ya n’àjà?

    3. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’àgwà Jefta n’ebe nkwa o kwere Jehova dị? (Ikpe 11:35, 39; Ekli. 5:4, 5; Mat. 16:24)

    4. Olee otú ada Jefta si bụrụ ezi ihe nlereanya nye Ndị Kraịst na-eto eto n’ihe banyere iji ozi oge niile mere ọrụ ha ná ndụ? (Ikpe 11:36; Mat. 6:33; Fil. 3:8)

Akụkọ nke 54

Nwoke nke Kachasị Ike

  1. Gịnị bụ aha nwoke kachasị ike nke dịtụworo ndụ, ònyekwa nyere ya ike ya?

  2. N’otu oge, gịnị ka Samsin mere otu nnukwu ọdụm dị ka ị pụrụ ịhụ na foto a?

  3. Olee ihe nzuzo nke Samsin na-agwa Delaịla na foto a, oleekwa otú nke a si mee ka ndị Filistia jide ya?

  4. Olee otú Samsin si kpata ọnwụ nke ihe dị ka puku atọ n’ime ndị iro ya bụ́ ndị Filistia n’ụbọchị ọ nwụrụ?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ndị Ikpe 13:1-14.

    Olee otú Manoa na nwunye ya si setịpụrụ ndị nne na nna ezi ihe nlereanya n’ịzụlite ụmụ ha? (Ikpe 13:8; Ọma 127:3; Efe. 6:4)

  2. Gụọ Ndị Ikpe 14:5-9 na 15:9-16.

    1. Gịnị ka akụkọ banyere ogbugbu Samsin gburu ọdụm, ndọbi ọ dọbiri eriri ọhụrụ ndị e kere ya, na ojiji o ji agba ịnyịnya ibu gbuo otu puku mmadụ, na-egosi banyere otú mmụọ nsọ Jehova si arụ ọrụ?

    2. Olee otú mmụọ nsọ si enyere anyị aka taa? (Ikpe 14:6; 15:14; Zek. 4:6; Ọrụ 4:31)

  3. Gụọ Ndị Ikpe 16:18-31.

    Olee ihe mkpakọrịta ọjọọ mere Samsin, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a? (Ikpe 16:18, 19; 1 Kọr. 15:33)

Akụkọ nke 55

Nwatakịrị nke Na-ejere Chineke Ozi

  1. Gịnị bụ aha obere nwa a nke nọ na foto a, ndị ahụ ha na ya nọ hà bụ ole ndị?

  2. Olee ekpere Hana kpere otu ụbọchị mgbe ọ gara n’ụlọikwuu Jehova, oleekwa otú Jehova si zaa ekpere ya?

  3. Samuel ọ̀ dị afọ ole mgbe a kpọgara ya n’ụlọ ntu Jehova, gịnịkwa ka mama ya na-emere ya kwa afọ?

  4. Gịnị bụ aha ụmụ Ilaị, ụdị mmadụ dịkwa aṅaa ka ha bụ?

  5. Olee otú Jehova si kpọọ Samuel òkù, oleekwa ozi O ziri ya?

  6. Gịnị ka Samuel ghọrọ mgbe o tolitere, gịnịkwa mere mgbe o mere agadi?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ 1 Samuel 1:1-28.

    1. Ezi ihe nlereanya dị aṅaa ka Elkena setịpụụrụ ndị isi ezinụlọ n’ibute ụzọ n’ezi ofufe? (1 Sam. 1:3, 21; Mat. 6:33; Fil. 1:10)

    2. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’otú Hana si mee ihe banyere otu nsogbu tara akpụ? (1 Sam. 1:10, 11; Ọma 55:22; Rom 12:12)

  2. Gụọ 1 Samuel 2:11-36.

    Olee otú Ilaị si sọpụrụ ụmụ ya karịa Jehova, oleekwa otú nke a si bụrụ ihe ịdọ aka ná ntị nye anyị? (1 Sam. 2:22-24, 27, 29; Deut. 21:18-21; Mat. 10:36, 37)

  3. Gụọ 1 Samuel 4:16-18.

    Ozi dị aṅaa nke dị akụkụ anọ ka e si n’ọgbọ agha weta, oleekwa otú nke a si metụta Ilaị?

  4. Gụọ 1 Samuel 8:4-9.

    Olee otú Izrel si mehie nke ukwuu megide Jehova, oleekwa otú anyị pụrụ isi nọgide na-akwado Alaeze Jehova taa? (1 Sam. 8:5, 7; Jọn 17:16; Jems 4:4)

Akụkọ nke 56

Sọl—Eze Mbụ nke Izrel

  1. Na foto a, gịnị ka Samuel na-eme, n’ihi gịnịkwa ka o ji na-eme nke a?

  2. N’ihi gịnị ka Jehova ji nwee mmasị n’ebe Sọl nọ, ụdị mmadụ dịkwa aṅaa ka ọ bụ?

  3. Gịnị bụ aha nwa Sọl, gịnịkwa ka nwa ya ahụ mere?

  4. N’ihi gịnị ka Sọl ji chụọ àjà kama ichere ka Samuel bịa mee ya?

  5. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’akụkọ banyere Sọl?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ 1 Samuel 9:15-21 na 10:17-27.

    Olee otú umeala n’obi Sọl dị si gbochie ya iji iwe mee ihe mgbe ndị ụfọdụ gwara ya okwu mkparị? (1 Sam. 9:21; 10:21, 22, 27; Ilu 17:27)

  2. Gụọ 1 Samuel 13:5-14.

    Olee mmehie Sọl mere na Gilgal? (1 Sam. 10:8; 13:8, 9, 13)

  3. Gụọ 1 Samuel 15:1-35.

    1. Olee mmehie dị oké njọ nke Sọl mere n’ihe banyere Egag, bụ́ eze Amalek? (1 Sam. 15:2, 3, 8, 9, 22)

    2. Olee otú Sọl si gbalịa igosi na ihe o mere ziri ezi, ma taa ndị ọzọ ụta? (1 Sam. 15:24)

    3. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịṅa ntị na ya taa mgbe e nyere anyị ndụmọdụ? (1 Sam. 15:19-21; Ọma 141:5; Ilu 9:8, 9; 11:2)

Akụkọ nke 57

Chineke Ahọrọ Devid

  1. Gịnị bụ aha nwa okorobịa nke nọ na foto a, oleekwa otú anyị si mara na o nwere obi ike?

  2. Ebee ka Devid bi, gịnịkwa bụ aha nna ya na nna nna ya?

  3. N’ihi gịnị ka Jehova ji gwa Samuel ka ọ gaa n’ụlọ Jesi na Betlehem?

  4. Gịnị mere mgbe Jesi kpọpụtaara Samuel ụmụ ya asaa?

  5. Mgbe a kpọpụtara Devid, gịnị ka Jehova gwara Samuel?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ 1 Samuel 17:34, 35.

    Olee otú ihe a merenụ si gosi na Devid nwere obi ike nakwa na ọ tụkwasịrị Jehova obi? (1 Sam. 17:37)

  2. Gụọ 1 Samuel 16:1-14.

    1. Olee otú okwu Jehova nke dị na 1 Samuel 16:7 si enyere anyị aka ịghara ile mmadụ anya n’ihu na imeso mmadụ ihe na-adabere n’otú ọ dị n’elu ahụ́? (Ọrụ 10:34, 35; 1 Tim. 2:4)

    2. Olee otú ihe atụ Sọl si egosi na mgbe Jehova napụrụ mmadụ mmụọ ya, mmụọ ọjọọ, ma ọ bụ ọchịchọ ime ihe ọjọọ, pụrụ ịnọchi ebe ahụ mmụọ Jehova si pụọ? (1 Sam. 16:14; Mat. 12:43-45; Gal. 5:16)

Akụkọ nke 58

Devid na Golayat

  1. Olee otú Golayat si maa ndị agha Izrel aka?

  2. Olee otú Golayat gbaruru na dimkpa, gịnịkwa ka Eze Sọl kwere nkwa inye onye ga-egbu Golayat?

  3. Gịnị ka Devid kwuru mgbe Sọl gwara ya na ọ gaghị alụsoli Golayat ọgụ n’ihi na Devid bụ obere nwa?

  4. Olee otú Devid si gosi na ya tụkwasịrị Jehova obi site n’ihe ọ zaghachiri Golayat?

  5. Dị ka ị pụrụ ịhụ na foto a, gịnị ka Devid ji gbuo Golayat, gịnịkwa mere ndị Filistia mgbe nke ahụ gasịrị?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ 1 Samuel 17:1-54.

    1. Gịnị mere Devid atụghị egwu, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie obi ike ya? (1 Sam. 17:37, 45; Efe. 6:10, 11)

    2. N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst ji kwesị izere mmụọ ịsọ mpi dị ka nke Golayat mgbe ha na-eme egwuregwu ma ọ bụ na-enwe ntụrụndụ? (1 Sam. 17:8; Gal. 5:26; 1 Tim. 4:8)

    3. Olee otú ihe Devid kwuru si gosi na o nwere okwukwe na Chineke ga-anọnyere ya? (1 Sam. 17:45-47; 2 Ihe 20:15)

    4. Kama ịkọwa na agha ahụ bụ n’etiti ụsụụ ndị agha abụọ na-emegiderịta onwe ha, olee otú akụkọ a si gosi na agha ahụ bụ n’ezie n’etiti chi ụgha dị iche iche na ezi Chineke ahụ bụ́ Jehova? (1 Sam. 17:43, 46, 47)

    5. Olee otú ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ si eṅomi ihe nlereanya Devid bụ́ ịtụkwasị Jehova obi? (1 Sam. 17:37; Jer. 1:17-19; Mkpu. 12:17)

Akụkọ nke 59

Ihe Mere Devid Ji Gbaa Ọsọ

  1. N’ihi gịnị ka Sọl ji emere Devid anyaụfụ, oleekwa otú nwa Sọl bụ́ Jonatan si dị iche?

  2. Gịnị mere n’otu ụbọchị mgbe Devid na-akpọrọ Sọl ụbọ akwara?

  3. . Gịnị ka Sọl sịrị na Devid ga-eme tupu ya akpọnye ya ada ya bụ́ Maịkal ka ọ lụwa, n’ihi gịnịkwa ka Sọl ji kwuo otú ahụ?

  4. Mgbe Devid na-akpọrọ Sọl ụbọ akwara, gịnị mere nke ugboro atọ ya, dị ka anyị na-ahụ na foto a?

  5. Olee otú Maịkal si nye aka chebe ndụ Devid, gịnịkwa ka Devid meweziri ruo afọ asaa?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ 1 Samuel 18:1-30.

    1. Olee otú ịhụnanya siri ike Jonatan nwere n’ebe Devid nọ si ese onyinyo ịhụnanya dị n’etiti “atụrụ ọzọ” ahụ na “ìgwè atụrụ nta” ahụ? (1 Sam. 18:1; Jọn 10:16; Luk 12:32; Zek. 8:23)

    2. N’iburu n’uche na ọ bụ Jonatan kwesịrị ịnọchi anya Sọl, olee otú 1 Samuel 18:4 si akọwa otú Jonatan si doo onwe ya n’okpuru onye a họpụtara ịbụ eze, bụ́ nke kwesịrị ịrịba ama?

    3. Olee otú ihe atụ Sọl si egosi na ekworo pụrụ iduga mmadụ n’ime mmehie dị oké njọ, gịnịkwa ka nke a na-adọ anyị aka ná ntị banyere ya? (1 Sam. 18:7-9, 25; Jems 3:14-16)

  2. Gụọ 1 Samuel 19:1-17.

    Olee otú Jonatan si tinye ndụ ya n’ihe ize ndụ mgbe ọ na-agwa Sọl okwu banyere Devid? (1 Sam. 19:1, 4-6; Ilu 16:14)

Akụkọ nke 60

Abigel na Devid

  1. Gịnị bụ aha nwaanyị a nke na-abịa izute Devid na foto a, ụdị mmadụ dịkwa aṅaa ka ọ bụ?

  2. Ònye bụ Nebal?

  3. N’ihi gịnị ka Devid ji ziga ụfọdụ n’ime ndị ikom ya ka ha gaa rịọ Nebal ka o nyetụ ha ihe oriri?

  4. Gịnị ka Nebal gwara ndị ikom Devid, oleekwa ihe Devid mere?

  5. Olee otú Abigel si gosi na ya bụ nwaanyị maara ihe?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ 1 Samuel 22:1-4.

    Olee otú ezinụlọ Devid si gosipụta ezi ihe nlereanya banyere otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-enyerịtara ibe ha aka? (Ilu 17:17; 1 Tesa. 5:14)

  2. Gụọ 1 Samuel 25:1-43.

    1. N’ihi gịnị ka e ji kọwaa Nebal n’ụzọ nlelị dị otú ahụ? (1 Sam. 25:2-5, 10, 14, 21, 25)

    2. Gịnị ka ndị nwunye bụ́ Ndị Kraịst taa pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya Abigel? (1 Sam. 25:32, 33; Ilu 31:26; Efe. 5:24)

    3. Olee ihe ọjọọ abụọ ndị Abigel gbochiri Devid ime? (1 Sam. 25:31, 33; Rom 12:19; Efe. 4:26)

    4. Olee otú ụzọ Devid si meghachi omume n’ihe Abigel kwuru si enyere ndị ikom aka ile ndị inyom anya dị ka Jehova si ele ha? (Ọrụ 21:8, 9; Rom 2:11; 1 Pita 3:7)

Akụkọ nke 61

E Chie Devid Eze

  1. Gịnị ka Devid na Abishaị mere mgbe Sọl na-ehi ụra n’ụlọ ntu ya?

  2. Olee ajụjụ Devid jụrụ Sọl?

  3. Ebee ka Devid gara mgbe ọ hapụsịrị Sọl?

  4. Gịnị mere Devid ji nwee mwute dị ukwuu bụ́ nke mere ka o dee ọmarịcha abụ?

  5. Devid ọ̀ dị afọ ole mgbe e chiri ya eze na Hibrọn, gịnịkwa bụ aha ụfọdụ n’ime ụmụ ya?

  6. Ebee ka Devid mesịrị chịa dị ka eze?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ 1 Samuel 26:1-25.

    1. Ihe Devid kwuru na 1 Samuel 26:11 ọ̀ na-egosi na Devid nwere ụdị àgwà dị aṅaa banyere ndokwa e mere ná nzukọ Chineke? (Ọma 37:7; Rom 13:2)

    2. Ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike igosi mmadụ obiọma na ịhụnanya, ma onye ahụ emeghị ka ọ̀ hụrụ ihe anyị mere, olee otú okwu Devid nke a na-achọta na 1 Samuel 26:23 pụrụ isi nyere anyị aka inwe echiche ziri ezi? (1 Eze 8:32; Ọma 18:20)

  2. Gụọ 2 Samuel 1:26.

    Olee otú Ndị Kraịst taa pụrụ isi zụlite ‘ịhụnanya siri ike maka ibe ha’ bụ́ ụdị ahụ dịrị n’etiti Devid na Jonatan? (1 Pita 4:8; Kọl. 3:14; 1 Jọn 4:12)

  3. Gụọ 2 Samuel 5:1-10.

    1. Afọ ole ka Devid chịrị dị ka eze, oleekwa ebe ndị ọ chịgasịrị n’ime afọ ndị a? (2 Sam. 5:4, 5)

    2. Gịnị mere ka Devid ghọọ onye ukwu, oleekwa ihe nke a na-echetara anyị taa? (2 Sam. 5:10; 1 Sam. 16:13; 1 Kọr. 1:31; Fil. 4:13)

Akụkọ nke 62

Nsogbu Adị n’Ụlọ Devid

  1. Site n’enyemaka Jehova, gịnị mesịrị mee ala Kenan?

  2. Gịnị mere n’otu uhuruchi mgbe Devid nọ n’elu ụlọ nke obí eze ya?

  3. N’ihi gịnị ka Jehova ji wesa Devid oké iwe?

  4. Na foto a, ònye ka Jehova gwara ka ọ gaa gwa Devid banyere mmehie ya, gịnịkwa ka nwoke ahụ kwuru na ọ bụ ihe ga-eme Devid?

  5. Nsogbu dị aṅaa ka Devid nwere?

  6. Mgbe Devid nwụsịrị, ònye ghọrọ eze Izrel?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ 2 Samuel 11:1-27.

    1. Olee otú imikpu onwe anyị n’ijere Jehova ozi si bụrụ ihe nchebe?

    2. Olee otú Devid si daba ná mmehie, oleekwa otú nke a si bụrụ ihe ịdọ aka ná ntị nye ndị ohu Jehova taa? (2 Sam. 11:2; Mat. 5:27-29; 1 Kọr. 10:12; Jems 1:14, 15)

  2. Gụọ 2 Samuel 12:1-18.

    1. Gịnị ka ndị okenye na ndị nne na nna pụrụ ịmụta site n’ụzọ Netan si gakwuru Devid iji nye ya ndụmọdụ? (2 Sam. 12:1-4; Ilu 12:18; Mat. 13:34)

    2. N’ihi gịnị ka Jehova ji meere Devid ebere? (2 Sam. 12:13; Ọma 32:5; 2 Kọr. 7:9, 10)

Akụkọ nke 63

Eze Solomọn nke Maara Ihe

  1. Gịnị ka Jehova jụrụ Solomọn, oleekwa otú o si zaghachi?

  2. Gịnị ka Jehova kwere nkwa inye Solomọn ebe ọ bụ na arịrịọ Solomọn masịrị ya?

  3. Nsogbu dị aṅaa tara akpụ ka ndị inyom abụọ wetaara Solomọn ka o dozie?

  4. Dị ka ị pụrụ ịhụ na foto a, olee otú Solomọn si dozie nsogbu ahụ?

  5. Olee otú ọchịchị Solomọn dị, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ 1 Ndị Eze 3:3-28.

    1. Olee ihe ndị ikom nwere ibu ọrụ ná nzukọ Chineke taa pụrụ ịmụta site n’okwu sitere n’obi nke Solomọn kwuru, bụ́ nke e dekọrọ ná 1 Ndị Eze 3:7? (Ọma 119:105; Ilu 3:5, 6)

    2. Olee otú arịrịọ Solomọn si bụrụ ezi ihe atụ nke ihe anyị kwesịrị ịdị na-arịọ n’ekpere? (1 Eze 3:9, 11; Ilu 30:8, 9; 1 Jọn 5:14)

    3. Obi ike dị aṅaa ka otú Solomọn si dozie esemokwu ahụ dị n’etiti ụmụ nwaanyị abụọ ahụ na-eme ka anyị nwee banyere ọchịchị nke Solomọn ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-achị n’ọdịnihu? (1 Eze 3:28; Aịsa. 9:6, 7; 11:2-4)

  2. Gụọ 1 Ndị Eze 4:29-34.

    1. a) Olee otú Jehova si zaa arịrịọ Solomọn rịọrọ maka obi na-erube isi? (1 Eze 4:29)

    2. N’iburu n’uche mgbalị ndị mmadụ mere iji bịa nụrụ amamihe Solomọn, gịnị kwesịrị ịbụ àgwà anyị n’ebe ịmụ okwu Chineke dị? (1 Eze 4:29, 34; Jọn 17:3; 2 Tim. 3:16)

Akụkọ nke 64

Solomọn Ewuo Ụlọ Nsọ

  1. Ogologo oge hà aṅaa ka o were Solomọn iwucha ụlọ nsọ Jehova, n’ihi gịnịkwa ka o ji fuo oké ego?

  2. Ọnụ ụlọ ole dị n’ụlọ nsọ ahụ, gịnịkwa ka e debere n’ụlọ nke dị n’ime ime?

  3. Gịnị ka Solomọn kpere n’ekpere mgbe e wuchara ụlọ nsọ ahụ?

  4. Olee otú Jehova si gosi na ya nabatara ekpere Solomọn?

  5. Gịnị ka ndị nwunye Solomọn mere ya ka o mee, gịnịkwa mere Solomọn?

  6. N’ihi gịnị ka Jehova ji wesa Solomọn iwe, gịnịkwa ka Jehova gwara ya?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ 1 Ihe E Mere 28:9, 10.

    N’iburu n’uche ihe Devid kwuru na 1 Ihe E Mere 28:9, 10, gịnị ka anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ime ná ndụ anyị kwa ụbọchị? (Ọma 19:14; Fil. 4:8, 9)

  2. Gụọ 2 Ihe E Mere 6:12-21, 32-42.

    1. Olee otú Solomọn si gosi na ọ dịghị ụlọ ọ bụla e ji aka wuo nke ga-aba Chineke Kasị Ihe Niile Elu? (2 Ihe 6:18; Ọrụ 17:24, 25)

    2. Gịnị ka okwu Solomọn nke dị na 2 Ihe E Mere 6:33 na-egosi banyere Jehova? (Ọrụ 10:34, 35; Gal. 2:6)

  3. Gụọ 2 Ihe E Mere 7:1-5.

    Dị nnọọ ka a kpaliri ụmụ Izrel ito Jehova mgbe ha hụrụ ebube ya, olee mmetụta anyị kwesịrị inwe taa mgbe anyị tụgharịrị uche ná ngọzi Jehova na-agọzi ndị ya? (2 Ihe 7:3; Ọma 22:22; 34:1; 96:2)

  4. Gụọ 1 Ndị Eze 11:9-13.

    Olee otú ụzọ ndụ Solomọn si gosi mkpa ọ dị mmadụ ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ruo n’ọgwụgwụ nke ndụ ya? (1 Eze 11:4, 9; Mat. 10:22; Mkpu. 2:10)

Akụkọ nke 65

E Kewaa Alaeze Ahụ

  1. Gịnị bụ aha ndị ikom abụọ nọ na foto a, ole ndị ka ha bụkwa?

  2. Gịnị ka Ahaịja mere uwe mwụda o yi, gịnị ka ihe ahụ o mere pụtara?

  3. Gịnị ka Solomọn nwara ime Jeroboam?

  4. N’ihi gịnị ka ndị Izrel ji mee Jeroboam eze nke ebo iri?

  5. N’ihi gịnị ka Jeroboam ji mee nwa ehi ọlaedo abụọ, gịnịkwa mere ná mba ahụ ngwa ngwa nke a gasịrị?

  6. Gịnị mere alaeze ebo abụọ ahụ na ụlọ nsọ Jehova dị na Jeruselem?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ 1 Ndị Eze 11:26-43.

    Olee ụdị mmadụ Jeroboam bụ, gịnịkwa ka Jehova kwere nkwa inye ya ma ọ bụrụ na o debe iwu Chineke? (1 Eze 11:28, 38)

  2. Gụọ 1 Ndị Eze 12:1-33.

    1. Gịnị ka ndị nne na nna na ndị okenye pụrụ ịmụta site n’ihe ọjọọ Rehoboam mere n’ihe banyere iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi? (1 Eze 12:13; Ekli. 7:7; 1 Pita 5:2, 3)

    2. Ole ndị ka ndị na-eto eto taa kwesịrị ịgakwuru maka nduzi a pụrụ ịtụkwasị obi mgbe ha chọrọ ime mkpebi ndị dị mkpa ná ndụ? (1 Eze 12:6, 7; Ilu 1:8, 9; 2 Tim. 3:16, 17; Hib. 13:7)

    3. Gịnị kpaliri Jeroboam iguzobe ebe abụọ a nọ efe nwa ehi, oleekwa otú nke a si gosi na o nwetụghị okwukwe n’ebe Jehova nọ? (1 Eze 11:37; 12:26-28)

    4. Ònye mere ka ndị alaeze ebo iri ahụ gbahapụ ezi ofufe? (1 Eze 12:32, 33)

Akụkọ nke 66

Jezibel—Ajọ Eze Nwaanyị

  1. Ònye bụ Jezibel?

  2. Gịnị mere obi adịghị Eze Ehab mma otu ụbọchị?

  3. Gịnị ka Jezibel mere iji nwetara di ya, bụ́ Ehab, ubi vaịn Nebọt?

  4. Ònye ka Jehova zigara ka ọ gaa taa Jezibel ahụhụ?

  5. Dị ka anyị na-ahụ na foto a, gịnị mere mgbe Jihu rutere n’obí eze nke Jezibel?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ 1 Ndị Eze 16:29-33 na 18:3, 4.

    Olee otú ọnọdụ jọruru ná njọ n’Izrel n’oge ọchịchị Eze Ehab? (1 Eze 14:9)

  2. Gụọ 1 Ndị Eze 21:1-16.

    1. Olee otú Nebọt si gosi na ya nwere obi ike nakwa na ya na-anọgidesi ike n’akụkụ Jehova? (1 Eze 21:1-3; Lev. 25:23-28)

    2. Site n’ihe atụ Ehab, gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere ịnagide ihe mgbe anyị na-enwetaghị ihe anyị tụrụ anya ya? (1 Eze 21:4; Rom 5:3-5)

  3. Gụọ 2 Ndị Eze 9:30-37.

    Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ịnụ ọkụ n’obi Jihu ji mee uche Jehova? (2 Eze 9:4-10; 2 Kọr. 9:1, 2; 2 Tim. 4:2)

Akụkọ nke 67

Jehoshafat Atụkwasị Jehova Obi

  1. Ònye bụ Jehoshafat, oleekwa oge ọ dịrị ndụ?

  2. N’ihi gịnị ka ụjọ ji jide ụmụ Izrel, gịnịkwa ka ọtụtụ n’ime ha mere?

  3. Olee otú Jehova si zaa ekpere Jehoshafat?

  4. Gịnị ka Jehova mere n’etiti ndị iro ụmụ Izrel tupu a lụọ ọgụ ahụ?

  5. Olee ihe ndị anyị pụrụ ịmụta n’aka Jehoshafat?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ 2 Ihe E Mere 20:1-30.

    1. Olee otú Jehoshafat si gosi ihe ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi kwesịrị ime mgbe ha chere ọnọdụ ndị na-emenye egwu ihu? (2 Ihe 20:12; Ọma 25:15; 62:1)

    2. Ebe ọ bụ na Jehova anọwo na-enwe òtù o ji eme ihe n’ịgwa ndị ya okwu, olee òtù o ji eme ihe taa? (2 Ihe 20:14, 15; Mat. 24:45-47; Jọn 15:15)

    3. Mgbe Chineke ga-amalite ‘agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,’ olee otú ọnọdụ anyị ga-esi yie nke Jehoshafat? (2 Ihe 20:15, 17; 32:8; Mkpu. 16:14, 16)

    4. N’iṅomi ndị Livaị, òkè dị aṅaa ka ndị ọsụ ụzọ na ndị ozi ala ọzọ na-ekere n’ọrụ nkwusa ahụ a na-arụ n’ụwa niile taa? (2 Ihe 20:19; Rom 10:13-15; 2 Tim. 4:2)

Akụkọ nke 68

Ụmụntakịrị Nwoke Abụọ Ndị Dịghachiri Ndụ

  1. Mmadụ atọ a nọ na foto a hà bụ ole ndị, gịnịkwa mere nwatakịrị nwoke ahụ?

  2. Gịnị ka Ilaịja kpere n’ekpere banyere nwatakịrị nwoke a, gịnịzi mere?

  3. Gịnị bụ aha onye na-enyere Ilaịja aka?

  4. N’ihi gịnị ka e ji kpọọ Ilaịsha ka ọ bịa n’ụlọ otu nwaanyị Shunem?

  5. Gịnị ka Ilaịsha mere, gịnị meziri nwata ahụ nwụrụ anwụ?

  6. Ike hà aṅaa ka Jehova nwere, dị ka e gosipụtara ya site n’aka Ilaịja na Ilaịsha?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ 1 Ndị Eze 17:8-24.

    1. Olee otú e si nwalee Ilaịja iji mara ma ọ̀ na-erube isi nakwa ma ò nwere okwukwe? (1 Eze 17:9; 19:1-4, 10)

    2. Olee ihe mere okwukwe nwaanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ ji bụrụ nke dị ịrịba ama? (1 Eze 17:12-16; Luk 4:25, 26)

    3. Olee otú ahụmahụ nwaanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ si egosi na okwu Jizọs nke e dekọrọ na Matiu 10:41, 42 bụ eziokwu? (1 Eze 17:10-12, 17, 23, 24)

  2. Gụọ 2 Ndị Eze 4:8-37.

    1. Gịnị ka nwaanyị Shunem ahụ na-akụziri anyị banyere ile ọbịa? (2 Eze 4:8; Luk 6:38; Rom 12:13; 1 Jọn 3:17)

    2. lee ụzọ ndị anyị pụrụ isi gosi ndị ohu Chineke obiọma taa? (Ọrụ 20:35; 28:1, 2; Gal. 6:9, 10; Hib. 6:10)

Akụkọ nke 69

Otu Nwa Agbọghọ Nta Enyere Otu Dike Aka

  1. Gịnị ka nwa agbọghọ nta a na-agwa nwaanyị a na foto a?

  2. Ònye bụ nwaanyị a nọ na foto a, gịnịkwa ka nwa agbọghọ nta a nọ n’ụlọ nwaanyị a na-eme?

  3. Gịnị ka Ilaịsha gwara ohu ya ka ọ gaa gwa Neeman, gịnịkwa mere iwe ji wee Neeman?

  4. Gịnị mere mgbe Neeman gere ndị ohu ya ntị?

  5. N’ihi gịnị ka Ilaịsha ji jụ ịnara onyinye Neeman, ma gịnị ka Gehezaị mere?

  6. Gịnị mere Gehezaị, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta na nke a?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ 2 Ndị Eze 5:1-27.

    1. Olee otú ihe nlereanya nke nwa agbọghọ nta ahụ bụ́ onye Izrel pụrụ isi gbaa ndị na-eto eto ume taa? (2 Eze 5:3; Ọma 8:2; 148:12, 13)

    2. N’ihi gịnị ka o ji dị mma iburu ihe atụ Neeman n’uche mgbe a na-enye anyị ndụmọdụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ? (2 Eze 5:15; Hib. 12:5, 6; Jems 4:6)

    3. Olee ihe ndị anyị pụrụ ịmụta site n’ịchọpụta ọdịiche dị n’ihe Ilaịsha mere na ihe Gehezaị mere? (2 Eze 5:9, 10, 14-16, 20; Mat. 10:8; Ọrụ 5:1-5; 2 Kọr. 2:17)

Akụkọ nke 70

Jona na Azụ̀ Ukwu Ahụ

  1. Ònye bụ Jona, gịnịkwa ka Jehova gwara ya ka o mee?

  2. Ebe ọ bụ na Jona achọghị ịga ebe Jehova gwara ya ka ọ gaa, gịnị ka o mere?

  3. Gịnị ka Jona gwara ndị ahụ na-anya ụgbọ mmiri ka ha mee ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka oké ifufe ahụ kwụsị?

  4. Dị ka ị na-ahụ na foto a, gịnị mere mgbe Jona na-emikpu n’ime mmiri?

  5. Ogologo oge hà aṅaa ka Jona nọrọ n’afọ azụ̀ ukwu ahụ, gịnịkwa ka o mere n’ebe ahụ?

  6. Olee ebe Jona gara mgbe azụ̀ ukwu ahụ gbọpụtasịrị ya, gịnịkwa ka nke a na-akụziri anyị?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jona 1:1-17.

    Dị ka ihe àmà gosiri, olee otú Jona si lee ọrụ e nyere ya ịga kwusaara ndị Ninive ozi ọma anya? (Jona 1:2, 3; Ilu 3:7; Ekli. 8:12)

  2. Gụọ Jona 2:1, 2, 10.

    Olee otú ihe mere Jona si eme ka anyị nwee obi ike na Jehova ga-aza ekpere anyị? (Ọma 22:24; 34:6; 1 Jọn 5:14)

  3. Gụọ Jona 3:1-10.

    1. Agbamume dị aṅaa ka anyị na-enweta site n’eziokwu ahụ bụ́ na Jehova gara n’ihu jiri Jona rụọ ọrụ n’agbanyeghị na Jona ekwebughị arụ ọrụ e nyere ya? (Ọma 103:14; 1 Pita 5:10)

    2. Gịnị ka ihe ndị Ninive mere n’ihi ihe Jona gwara ha na-akụziri anyị banyere ibu ụzọ kwubie otú ndị nọ n’ókèala anyị ga-esi meghachi omume ọbụna tupu anyị agakwuru ha? (Jona 3:6-9; Ekli. 11:6; Ọrụ 13:48)

Akụkọ nke 71

Chineke Ekwe Nkwa Iweta Paradaịs

  1. Ònye bụ Aịzaya, olee mgbe ọ dịrị ndụ, gịnịkwa ka Jehova gosiri ya?

  2. Gịnị ka okwu bụ́ “paradaịs” pụtara, gịnịkwa ka ọ na-echetara gị?

  3. Gịnị ka Jehova gwara Aịzaya ka o dee banyere Paradaịs ọhụrụ ahụ?

  4. N’ihi gịnị ka e ji chụpụ Adam na Iv n’ebe obibi ha mara mma?

  5. Gịnị ka Jehova kwere ndị hụrụ ya n’anya ná nkwa?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Aịsaịa 11:6-9.

    1. Olee otú Okwu Chineke si kọwaa udo nke ga-adị n’etiti ụmụ anụmanụ na ụmụ mmadụ n’ụwa ọhụrụ ahụ? (Ọma 148:10, 13; Aịsa. 65:25; Ezik. 34:25)

    2. Olee otú okwu Aịzaịa si na-emezu n’ụzọ ime mmụọ n’etiti ndị Jehova taa? (Rom 12:2; Efe. 4:23, 24)

    3. Ònye ka e kwesịrị inye otuto maka mgbanwe ụmụ mmadụ na-agbanwe àgwà ha ugbu a nakwa mgbanwe ha ga-agbanwe àgwà ha n’ụwa ọhụrụ ahụ? (Aịsa. 48:17, 18; Gal. 5:22, 23; Fil. 4:7)

  2. Gụọ Mkpughe 21:3, 4.

    1. Olee otú Akwụkwọ Nsọ si egosi na ihe mbinyere Chineke ga-ebinyere ụmụ mmadụ pụtara bụ na ọ ga-anọnyere ha n’ụzọ ihe atụ n’ụwa, ọ bụghị n’ụzọ anụ ahụ́? (Lev. 26:11, 12; 2 Ihe 6:18; Aịsa. 66:1; Mkpu. 21:2, 3, 22-24)

    2. Olee ụdị anya mmiri na ihe mgbu nke na-agaghịzi adị? (Luk 8:49-52; Rom 8:21, 22; Mkpu. 21:4)

Akụkọ nke 72

Chineke Enyere Eze Hezekaya Aka

  1. Ònye bụ nwoke a nọ na foto a, n’ihi gịnịkwa ka o ji nọrọ ná nnukwu nsogbu?

  2. Gịnị dị n’akwụkwọ ozi ndị a Hezekaya wụsara n’ihu Chineke, gịnịkwa ka Hezekaya na-ekpe n’ekpere?

  3. Ụdị eze dị aṅaa ka Hezekaya bụ, oleekwa ozi Jehova zigaara ya site n’ọnụ Aịzaya onye amụma?

  4. Gịnị ka mmụọ ozi Jehova mere ndị Asiria dị ka e gosiri na foto a?

  5. Ọ bụ ezie na alaeze ebo abụọ ahụ nwere udo ruo oge ụfọdụ, gịnị mere mgbe Hezekaya nwụrụ?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ 2 Ndị Eze 18:1-36.

    1. Olee otú ọnụ na-ekwuchitere ndị Asiria bụ́ Rabshake si nwaa ime ka okwukwe ụmụ Izrel daa? (2 Eze 18:19, 21; Ọpụ. 5:2; Ọma 64:3)

    2. Mgbe a na-emegide Ndịàmà Jehova, olee otú ha si agbaso ihe nlereanya Hezekaya? (2 Eze 18:36; Ọma 39:1; Ilu 26:4; 2 Tim. 2:24)

  2. Gụọ 2 Ndị Eze 19:1-37.

    1. Olee otú ndị Jehova taa si agbaso ihe nlereanya Hezekaya n’oge nsogbu? (2 Eze 19:1, 2; Ilu 3:5, 6; Hib. 10:24, 25; Jems 5:14, 15)

    2. Olee mmeri atọ e meriri Eze Senakerib, ònyekwa ka Senakerib na-ese onyinyo ya? (2 Eze 19:32, 35, 37; Mkpu. 20:2, 3)

  3. Gụọ 2 Ndị Eze 21:1-6, 16.

    N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Manase bụ eze kasị obi ọjọọ n’ime ndị eze niile chịrị na Jeruselem? (2 Ihe 33:4-6, 9)

Akụkọ nke 73

Eze Ọma Ikpeazụ Chịrị Izrel

  1. Afọ ole ka Josaya dị mgbe ọ ghọrọ eze, gịnịkwa ka ọ malitere ime mgbe ọ bụworo eze ruo afọ asaa?

  2. Gịnị ka ị hụrụ Josaya na-eme na foto nke mbụ a?

  3. Gịnị ka onyeisi nchụàjà chọtara mgbe ndị ikom ahụ na-ewuzi ụlọ nsọ ahụ?

  4. Gịnị mere Josaya ji dọwaa uwe ya?

  5. Olee ozi sitere n’aka Jehova nke onye amụma nwaanyị bụ́ Hulda ziri Josaya?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ 2 Ihe E Mere 34:1-28.

    1. Ihe nlereanya dị aṅaa ka Josaya na-esetịpụrụ ndị ihe siiri ike n’oge ha bụ ụmụaka? (2 Ihe 33:21-25; 34:1, 2; Ọma 27:10)

    2. Olee ihe ndị dị ịrịba ama Josaya mere iji mee ka ezi ofufe gaa n’ihu n’afọ nke asatọ, nke iri na abụọ, na nke iri na asatọ nke ọchịchị ya? (2 Ihe 34:3, 8)

    3. Olee ihe ndị anyị pụrụ ịmụta n’aka Eze Josaya na Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Hilkaya banyere ilekọta ebe ndị anyị na-anọ efe ofufe? (2 Ihe 34:9-13; Ilu 11:14; 1 Kọr. 10:31)

Akụkọ nke 74

Nwoke nke Na-atụghị Egwu

  1. Ònye bụ nwa okorobịa a nọ na foto a?

  2. Gịnị ka Jeremaya chere banyere ọchịchọ a chọrọ ka ọ bụrụ onye amụma, ma gịnị ka Jehova gwara ya?

  3. Olee ozi Jeremaya nọgidere na-ezi ụmụ Izrel?

  4. Olee otú ndị isi nchụàjà si nwaa igbochi Jeremaya izi ozi ya, ma olee otú o si gosi na ụjọ anaghị atụ ya?

  5. Gịnị mere mgbe ụmụ Izrel na-agbanweghị omume ọjọọ ha?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jeremaịa 1:1-8.

    1. Dị ka ihe atụ banyere Jeremaya na-egosi, gịnị na-eme ka mmadụ ruo eru ijere Jehova ozi? (2 Kọr. 3:5, 6)

    2. Olee agbamume nke ihe atụ banyere Jeremaya na-enye ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst taa? (Ekli. 12:1; 1 Tim. 4:12)

  2. Gụọ Jeremaịa 10:1-5.

    Olee ihe atụ bụ́ ịgba nke Jeremaya ji gosi na ọ dịghị uru ọ bara ịtụkwasị arụsị obi? (Jer. 10:5; Aịsa. 46:7; Hab. 2:19)

  3. Gụọ Jeremaịa 26:1-16.

    1. Mgbe ha na-ezi ozi ịdọ aka ná ntị ahụ taa, olee otú ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ siworo buru n’uche iwu Jehova nyere Jeremaya bụ́ ka ọ ‘ghara iwepụ ihe n’okwu ndị ahụ’? (Jer. 26:2; Deut. 4:2; Ọrụ 20:27)

    2. Olee ihe nlereanya magburu onwe ya Jeremaya setịpụụrụ Ndịàmà Jehova taa n’ịkpọsara ndị nke mba niile ozi ịdọ aka ná ntị Jehova? (Jer. 26:8, 12, 14, 15; 2 Tim. 4:1-5)

  4. Gụọ 2 Ndị Eze 24:1-17.

    Olee ihe ọjọọ ndị Juda nwetara n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi nye Jehova? (2 Eze 24:2-4, 14)

Akụkọ nke 75

Ụmụ Okorobịa Anọ Ndị Nọ na Babilọn

  1. Ụmụ okorobịa anọ ndị a nọ na foto a hà bụ ole ndị, gịnịkwa mere ha ji nọrọ na Babilọn?

  2. Gịnị bụ nzube Nebukadneza banyere ụmụ okorobịa anọ ndị a, oleekwa iwu o nyere ndị ohu ya?

  3. Olee arịrịọ Daniel rịọrọ banyere ihe oriri na ihe ọṅụṅụ maka ya na ndị enyi ya atọ?

  4. Mgbe Daniel na ndị enyi ya atọ risịrị akwụkwọ nri ruo ụbọchị iri, olee otú ha dị n’anya ma e jiri ha tụnyere ụmụ okorobịa ndị ọzọ?

  5. Olee otú Daniel na ndị enyi ya atọ si bịa nọrọ n’obí eze, oleekwa otú ha si kara ndị anwansi na ndị maara ihe mma?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Daniel 1:1-21.

    1. Olee ụdị mgbalị ọ dị mkpa ka anyị na-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iguzogide ọnwụnwa ma merie adịghị ike? (Dan. 1:8; Jen. 39:7, 10; Gal. 6:9)

    2. Olee ụzọ ndị a pụrụ isi nwaa ndị ntorobịa ma ọ bụ rụgide ha itinye aka n’ihe mmadụ ụfọdụ na-ele anya dị ka “ihe oriri ọma”? (Dan. 1:8; Ilu 20:1; 2 Kọr. 6:17–7:1)

    3. Gịnị ka ihe ndekọ Bible banyere ndị ntorobịa Hibru anọ ahụ na-enyere anyị aka ịghọta banyere inweta ihe ọmụma ụwa? (Dan. 1:20; Aịsa. 54:13; 1 Kọr. 3:18-20)

Akụkọ nke 76

E Bibie Jeruselem

  1. Gịnị na-eme Jeruselem na ụmụ Izrel ndị e gosiri na foto a?

  2. Ònye bụ Izikiel, olee ihe ndị na-awụ akpata oyi Jehova gosiri ya?

  3. Ebe ọ bụ na ụmụ Izrel adịghị akwanyere Jehova ùgwù, gịnị ka o kwere ha ná nkwa?

  4. Gịnị ka Eze Nebukadneza mere mgbe ụmụ Izrel nupụụrụ ya isi?

  5. N’ihi gịnị ka Jehova ji kwe ka ajọ mbibi nke a bịakwasị ụmụ Izrel?

  6. Olee otú e si mee ka ala Izrel tọgbọrọ chakoo n’enweghị ndị bi ya, afọ ole kwa ka ọ tọgbọrọ chakoo?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ 2 Ndị Eze 25:1-26.

    1. Ònye bụ Zedekaya, gịnị mere ya, oleekwa otú nke a si mezuo amụma Bible? (2 Eze 25:5-7; Ezik. 12:13-15)

    2. Ole ndị ka Jehova tara ụta maka omume ekwesịghị ntụkwasị obi niile nke ụmụ Izrel? (2 Eze 25:9, 11, 12, 18, 19; 2 Ihe 36:14, 17)

  2. Gụọ Ezikiel 8:1-18.

    Olee otú Krisendọm siworo ṅomie ụmụ Izrel ahụ na-efe anyanwụ ofufe, bụ́ ndị si n’ezi ofufe dapụ? (Ezik. 8:16; Aịsa. 5:20, 21; Jọn 3:19-21; 2 Tim. 4:3)

Akụkọ nke 77

Ha Ekweghị Akpọ Isi Ala

  1. Iwu dị aṅaa ka Nebukadneza, bụ́ eze Babilọn, nyere ndị ọ na-achị?

  2. N’ihi gịnị ka ndị enyi atọ Daniel na-ejighị kpọọ isi ala nye ihe oyiyi ahụ e ji ọlaedo mee?

  3. Mgbe Nebukadneza nyere ndị Hibru atọ ahụ ohere ọzọ iji kpọọ isi ala, olee otú ha si gosi na ha tụkwasịrị Jehova obi?

  4. Gịnị ka Nebukadneza mere ka ndị ikom ya mee Shedrak, Mishak, na Abednego?

  5. Gịnị ka Nebukadneza hụrụ mgbe o lebara anya n’ọkụ ahụ na-ere ajọ orire?

  6. N’ihi gịnị ka eze ahụ ji too Chineke nke Shedrak, Mishak, na Abednego, oleekwa ihe nlereanya ha na-esetịpụrụ anyị?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Daniel 3:1-30.

    1. Àgwà dị aṅaa nke ndị Hibru atọ ahụ na-eto eto gosipụtara ka ndị ohu Chineke niile kwesịrị iṅomi mgbe ha zutere ọnwụnwa nke metụtara ịnọgide na-eme ezi ihe? (Dan. 3:17, 18; Mat. 10:28; Rom 14:7, 8)

    2. Olee ihe dị mkpa Jehova Chineke kụziiri Nebukadneza? (Dan. 3:28, 29; 4:34, 35)

Akụkọ nke 78

Ihe Aka Dere ná Mgbidi

  1. Gịnị mere mgbe eze Babilọn kpọrọ oké oriri ma jiri iko na arịa ndị e weere n’ụlọ nsọ Jehova dị na Jeruselem mee ihe?

  2. Gịnị ka Belshaza gwara ndị amamihe ya, ma gịnị ka ha na-enweghị ike ime?

  3. Gịnị ka nne eze ahụ gwara ya ka o mee?

  4. Dị ka Daniel gwara eze ahụ, gịnị mere Chineke ji zite aka ahụ ka o dee ihe ná mgbidi?

  5. Olee otú Daniel si kọwaa ihe ahụ aka dere na mgbidi?

  6. Gịnị mere mgbe Daniel ka kpụ okwu n’ọnụ?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Daniel 5:1-31.

    1. Olee ọdịiche dị n’etiti ịtụ egwu Chineke na egwu Belshaza tụrụ mgbe ọ hụrụ ihe ahụ aka dere ná mgbidi. (Dan. 5:6, 7; Ọma 19:9; Rom 8:35-39)

    2. Olee otú Daniel si gosipụta obi ike dị ukwuu mgbe ọ na-agwa Belshaza na ndị ukwu ya okwu? (Dan. 5:17, 18, 22, 26-28; Ọrụ 4:29)

    3. Olee otú Daniel isi 5 si eme ka ọbụbụ Jehova bụ eze eluigwe na ala pụta ìhè? (Dan. 4:17, 25; 5:21)

Akụkọ nke 79

Daniel Nọ n’Olulu Ọdụm

  1. Ònye bụ Darayọs, oleekwa otú o si were Daniel?

  2. Gịnị ka ụfọdụ ndị ikom nwere anyaụfụ kpaliri Darayọs ime?

  3. Gịnị ka Daniel mere mgbe ọ nụrụ banyere iwu ọhụrụ ahụ?

  4. Gịnị mere obi erughị Darayọs ala nke na ọ pụghị ihi ụra, gịnịkwa ka o mere n’ụtụtụ echi ya?

  5. Olee otú Daniel si zaghachi Darayọs okwu?

  6. Gịnị ka e mere ajọ ndị ikom ahụ nwara igbu Daniel, gịnịkwa ka Darayọs kwuru n’akwụkwọ ozi o degaara ndị niile nọ n’alaeze ya?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Daniel 6:1-28.

    1. Olee otú izu a gbara megide Daniel si echetara anyị ihe ndị mmegide meworo iji nwaa igbochi ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ n’oge a? (Dan. 6:7; Ọma 94:20; Aịsa. 10:1; Rom 8:31)

    2. Olee otú ndị ohu Chineke taa pụrụ isi ṅomie Daniel n’ịnọgide na-erubere “ikike ndị ka elu” isi? (Dan. 6:5, 10; Rom 13:1; Ọrụ 5:29)

    3. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Daniel n’ife Jehova “mgbe niile”? (Dan. 6:16, 20; Fil. 3:16; Mkpu. 7:15)

Akụkọ nke 80

Ndị Chineke Ahapụ Babilọn

  1. Dị ka e gosiri na foto a, gịnị ka ụmụ Izrel na-eme?

  2. Olee otú Saịrọs si mezuo amụma Jehova buru site n’ọnụ Aịzaya?

  3. Gịnị ka Saịrọs gwara ndị Izrel na-enweghị ike ịlaghachi Jeruselem?

  4. Gịnị ka Saịrọs nyere ndị Izrel ka ha buru laa Jeruselem?

  5. Oge hà aṅaa ka o were ụmụ Izrel ịlaru Jeruselem?

  6. Afọ ole gafeworo kemgbe a hapụrụ ala ahụ n’enweghị onye bi ya?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Aịsaịa 44:28 na 45:1-4.

    1. Olee otú Jehova si mesie ya ike na amụma ahụ e buru banyere Saịrọs ga-emezurịrị? (Aịsa. 55:10, 11; Rom 4:17)

    2. Gịnị ka amụma Aịzaya buru banyere Saịrọs na-egosi banyere ikike Jehova Chineke nwere ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu? (Aịsa. 42:9; 45:21; 46:10, 11; 2 Pita 1:20)

  2. Gụọ Ezra 1:1-11.

    Site n’ịgbaso ihe nlereanya nke ndị ahụ na-enweghị ike ịlaghachi Jeruselem, olee otú anyị pụrụ isi mee ka “aka” nke ndị banyere n’ozi oge niile “sikwuo ike”? (Ezra 1:4, 6; Rom 12:13; Kọl. 4:12)

Akụkọ nke 81

Ha Tụkwasịrị Chineke Obi na Ọ Ga-enyere Ha Aka

  1. Mmadụ ole mere ogologo njem ahụ si na Babilọn laa Jeruselem, ma gịnị ka ha hụrụ mgbe ha laruru?

  2. Gịnị ka ndị Izrel malitere iwu mgbe ha lọrutere, ma gịnị ka ndị iro ha mere?

  3. Hagaị na Zekaraya hà bụ ole ndị, gịnịkwa ka ha gwara ụmụ Izrel?

  4. N’ihi gịnị ka Tatenaị ji ziga akwụkwọ ozi na Babilọn, gịnịkwa ka a zara ya?

  5. Gịnị ka Ezra mere mgbe ọ nụrụ banyere mkpa e nwere iwughachi ụlọ nsọ Chineke?

  6. Gịnị ka Ezra na-ekpe ekpere banyere ya na foto a, olee otú e si zaa ekpere ya, gịnịkwa ka nke a na-akụziri anyị?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ezra 3:1-13.

    Ọ bụrụ na anyị enweta onwe anyị n’ebe a na-enweghị ọgbakọ ndị Chineke, gịnị ka anyị kwesịrị ịnọgide na-eme? (Ezra 3:3, 6; Ọrụ 17:16, 17; Hib. 13:15)

  2. Gụọ Ezra 4:1-7.

    Olee ihe nlereanya Zerubabel setịpụụrụ ndị Jehova ma a bịa n’ihe banyere ngwakọta okpukpe? (Ọpụ. 34:12; 1 Kọr. 15:33; 2 Kọr. 6:14-17)

  3. Gụọ Ezra 5:1-5, 17 na 6:1-22.

    1. Gịnị mere ndị mmegide ahụ enwelighị ike igbochi ọrụ ụlọ nsọ ahụ? (Ezra 5:5; Aịsa. 54:17)

    2. Olee otú ihe ndị okenye nke ndị Juu mere si agba Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye ume ịchọ nduzi Jehova mgbe ha na-eche ndị mmegide ihu? (Ezra 6:14; Ọma 32:8; Rom 8:31; Jems 1:5)

  4. Gụọ Ezra 8:21-23, 28-36.

    Tupu anyị emewe ihe anyị chọrọ ime, ihe nlereanya dị aṅaa nke Ezra setịpụrụ ka ọ ga-adị mma ka anyị ṅomie? (Ezra 8:23; Ọma 127:1; Ilu 10:22; Jems 4:13-15)

Akụkọ nke 82

Mọdekaị na Esta

  1. Mọdekaị na Esta hà bụ ole ndị?

  2. N’ihi gịnị ka Eze Ahaziurọs ji chọọ nwunye ọhụrụ, ònyekwa ka ọ họọrọ?

  3. Ònye bụ Heman, gịnịkwa na-ewe ya iwe?

  4. Iwu dị aṅaa ka e mere, gịnịkwa ka Esta mere mgbe o nwetasịrị ozi sitere n’aka Mọdekaị?

  5. Gịnị mere Heman, gịnịkwa mere Mọdekaị?

  6. Olee otú e si zọpụta ụmụ Izrel n’aka ndị iro ha?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Esta 2:12-18.

    Olee otú Esta si gosipụta uru ịzụlite ‘mmụọ dị jụụ na nke dị nwayọọ’ bara? (Esta 2:15; 1 Pita 3:1-5)

  2. Gụọ Esta 4:1-17.

    Dị nnọọ ka e nyere Esta ohere ime ihe maka ọdịmma nke ezi ofufe, olee ohere a na-enye anyị taa iji gosipụta na anyị na-anọgidesi ike n’akụkụ Jehova? (Esta 4:13, 14; Mat. 5:14-16; 24:14)

  3. Gụọ Esta 7:1-6.

    Olee otú ọtụtụ n’ime ndị Chineke taa siworo mee ihe maka ndị ọzọ n’agbanyeghị na ọ pụrụ ịkpatara ha mkpagbu, dị nnọọ ka Esta mere? (Esta 7:4; Mat. 10:16-22; 1 Pita 2:12)

Akụkọ nke 83

Mgbidi Jeruselem

  1. Olee otú ọ dị ụmụ Izrel mgbe a na-enweghị mgbidi gbara obodo ha bụ́ Jeruselem gburugburu?

  2. Ònye bụ Nehemaya?

  3. Gịnị bụ ọrụ Nehemaya, n’ihi gịnịkwa ka o ji bụrụ ọrụ dị mkpa?

  4. Olee ozi mere Nehemaya obi ọjọọ, gịnịkwa ka o mere?

  5. Olee otú Eze Atakzasis si gosi Nehemaya obiọma?

  6. Olee otú Nehemaya si hazie ọrụ iwu ihe ahụ iji mee ka ndị iro ụmụ Izrel ghara ịkwụsị ya?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Nehemaịa 1:4-6 na 2:1-20.

    Olee otú Nehemaya si chọọ nduzi Jehova? (Nehe. 2:4, 5; Rom 12:12; 1 Pita 4:7)

  2. Gụọ Nehemaịa 3:3-5.

    Gịnị ka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi pụrụ ịmụta site n’ọdịiche dị n’etiti ndị Tekoa na “ndị ukwu ha”? (Nehe. 3:5, 27; 2 Tesa. 3:7-10; 1 Pita 5:5)

  3. Gụọ Nehemaịa 4:1-23.

    1. Gịnị kpaliri ụmụ Izrel ịnọgide na-ewu ihe owuwu n’agbanyeghị na a na-emegide ha n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ? (Nehe. 4:6, 8, 9; Ọma 50:15; Aịsa. 65:13, 14)

    2. Olee ụzọ ihe nlereanya ụmụ Izrel setịpụrụ si agba anyị ume taa?

  4. Gụọ Nehemaịa 6:15.

    Gịnị ka mwusị e wusịrị mgbidi Jeruselem n’ime ọnwa abụọ na-egosi banyere ikike nke okwukwe? (Ọma 56:3, 4; Mat. 17:20; 19:26)

Akụkọ nke 84

Otu Mmụọ Ozi Eleta Meri

  1. Ònye bụ nwaanyị a nọ na foto a?

  2. Gịnị ka Gebriel gwara Meri?

  3. Olee otú Gebriel si kọwaara Meri na ọ ga-amụ nwa n’agbanyeghị na ọ lụbeghị di?

  4. Gịnị mere mgbe Meri gara ileta onye ikwu ya bụ́ Elizabet?

  5. Gịnị ka Josef chere n’echiche mgbe ọ matara na Meri dị ime, ma gịnị mere o ji gbanwee obi ya?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Luk 1:26-56.

    1. Gịnị ka Luk 1:35 na-egosi banyere ezughị okè ọ bụla dị n’àkwá dị n’akpa nwa Meri mgbe e si n’ógbè ndị bụ́ mmụọ bufee ndụ nke Ọkpara Chineke n’akpa nwa Meri? (Hag. 2:11-13; Jọn 6:69; Hib. 7:26; 10:5)

    2. Olee otú Jizọs si bụrụ onye a sọpụụrụ ọbụna tupu a mụọ ya? (Luk 1:41-43)

    3. Ihe nlereanya ọma dị aṅaa ka Meri setịpụụrụ Ndị Kraịst nwetara ihe ùgwù ije ozi pụrụ iche taa? (Luk 1:38, 46-49; 17:10; Ilu 11:2)

  2. Gụọ Matiu 1:18-25.

    N’agbanyeghị na e nyeghị Jizọs aha ahụ bụ́ Ịmanuel, olee otú ihe o mere mgbe ọ bụ mmadụ si mezuo ihe aha ahụ pụtara? (Mat. 1:22, 23; Jọn 14:8-10; Hib. 1:1-3)

Akụkọ nke 85

A Mụọ Jizọs n’Ụlọ Anụ

  1. Ònye bụ nwa ọhụrụ a nọ na foto a, ebeekwa ka Meri na-achọ inyiwe ya?

  2. Gịnị mere e ji mụọ Jizọs n’ụlọ anụ?

  3. Na foto a, ole ndị bụ ndị ikom a na-abanye n’ụlọ anụ a, gịnịkwa ka mmụọ ozi gwara ha?

  4. N’ihi gịnị ka Jizọs ji bụrụ onye pụrụ iche?

  5. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kpọọ Jizọs Ọkpara Chineke?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Luk 2:1-20..

    1. Òkè dị aṅaa ka Siza Ọgọstọs keere n’imezu amụma banyere ọmụmụ Jizọs? (Luk 2:1-4; Maị. 5:2)

    2. Olee ihe ga-eme ka a gụnye mmadụ n’etiti ndị ahụ a kpọrọ “ndị a nwapụtaworo”? (Luk 2:14; Mat. 16:24; Jọn 17:3; Ọrụ 3:19; Hib. 11:6)

    3. Ọ bụrụ na ndị Judia ahụ nwere obi umeala, bụ́ ndị na-azụ atụrụ, nwere ihe mere ha ga-eji ṅụrịa ọṅụ n’ihi ọmụmụ nke Onye Nzọpụta, olee ihe ka ukwuu mere ndị ohu Chineke taa ga-eji ṅụrịa ọṅụ? (Luk 2:10, 11; Efe. 3:8, 9; Mkpu. 11:15; 14:6)

Akụkọ nke 86

Ndị Ikom Otu Kpakpando Duziri

  1. Ole ndị bụ ndị ikom a nọ na foto a, n’ihi gịnịkwa ka otu n’ime ha ji na-atụ otu kpakpando na-egbuke egbuke aka?

  2. N’ihi gịnị ka obi ji gharazie iru Eze Herọd ala, gịnịkwa ka o mere?

  3. Ebee ka kpakpando ahụ na-egbuke egbuke dugara ndị ikom a, gịnị meziri ha ji si n’ụzọ ọzọ laghachi ná mba ha?

  4. Olee iwu Herọd nyere, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

  5. Gịnị ka Jehova gwara Josef ka o mee?

  6. Ònye mere ka kpakpando ọhụrụ ahụ nwuo, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

Ajụjụ ọzọ:

  1. Gụọ Matiu 2:1-23.

    Afọ ole ka Jizọs dị mgbe ndị ahụ na-akọ banyere kpakpando bịara ileta ya, oleekwa ebe o bi mgbe ahụ? (Mat. 2:1, 11, 16)

Akụkọ nke 87

Mgbe Nwata Bụ́ Jizọs Nọ n’Ụlọ Nsọ

  1. Afọ ole ka Jizọs dị na foto a, ebeekwa ka ọ nọ ihe a?

  2. Gịnị ka Josef na ezinụlọ ya na-eme kwa afọ?

  3. Ka ha mesịrị njem ruo otu ụbọchị n’oge ha na-ala, n’ihi gịnị ka Josef na Meri ji laghachi Jeruselem?

  4. Ebee ka Josef na Meri chọtara Jizọs, n’ihi gịnịkwa ka ndị nọ n’ebe ahụ ji na-enwe ihe ijuanya?

  5. Gịnị ka Jizọs gwara nne ya, bụ́ Meri?

  6. Olee otú anyị pụrụ isi dị ka Jizọs n’ịmụ banyere Chineke?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Luk 2:41-52.

    1. N’agbanyeghị na iwu kwuru na ọ bụ naanị ndị ikom kwesịrị ịga ememe ndị a na-eme kwa afọ, ezi ihe nlereanya dị aṅaa ka Josef na Meri setịpụụrụ ndị nne na nna taa? (Luk 2:41; Deut. 16:16; 31:12; Ilu 22:6)

    2. Olee otú Jizọs si setịpụrụ ndị na-eto eto taa ezi ihe nlereanya n’ido onwe ha n’okpuru ndị mụrụ ha? (Luk 2:51; Deut. 5:16; Ilu 23:22; Kọl. 3:20)

  2. Gụọ Matiu 13:53-56.

    Olee ndị ikom otu nne ji ha na Jizọs bụ́ ndị a kpọrọ aha ha n’ime Bible? Oleekwa otú e si jiri mmadụ abụọ n’ime ha mee ihe n’ọgbakọ Ndị Kraịst ka oge na-aga? (Mat. 13:55; Ọrụ 12:17; 15:6, 13; 21:18; Gal. 1:19; Jems 1:1; Jud 1)

Akụkọ nke 88

Jọn Emee Jizọs Baptizim

  1. Ole ndị bụ ndị ikom abụọ a nọ na foto a?

  2. Olee otú e si eme mmadụ baptizim?

  3. Olee ụdị ndị Jọn na-eme baptizim?

  4. Olee ihe pụrụ iche mere Jizọs ji gwa Jọn ka o mee ya baptizim?

  5. Olee otú Chineke si gosi na Ya nwere obi ụtọ maka baptizim Jizọs mere?

  6. Gịnị mere mgbe Jizọs pụrụ gaa n’ebe ndị mmadụ na-anọghị ruo ụbọchị iri anọ?

  7. Olee ụfọdụ n’ime ndị mbụ ghọrọ ụmụazụ, ma ọ bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, gịnịkwa bụ ọrụ ebube mbụ Jizọs rụrụ?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Matiu 3:13-17.

    Ihe nlereanya dị aṅaa ka Jizọs setịpụrụ n’ihe banyere ime ndị na-eso ụzọ ya baptizim? (Ọma 40:7, 8; Mat. 28:19, 20; Luk 3:21, 22)

  2. Gụọ Matiu 4:1-11.

    Olee otú ojiji Jizọs jiri Akwụkwọ Nsọ mee ihe nke ọma si agba anyị ume ịmụ Bible mgbe niile? (Mat. 4:5-7; 2 Pita 3:17, 18; 1 Jọn 4:1)

  3. Gụọ Jọn 1:29-51.

    Ònye ka Jọn Onye Na-eme Baptizim gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gakwuru, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie Jọn taa? (Jọn 1:29, 35, 36; 3:30; Mat. 23:10)

  4. Gụọ Jọn 2:1-12.

    Olee otú ọrụ ebube mbụ Jizọs rụrụ si gosi na Jehova adịghị egbochi ezi ihe ịbịara ndị ohu Ya? (Jọn 2:9, 10; Ọma 84:11; Jems 1:17)

Akụkọ nke 89

Jizọs Emee Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha

  1. N’ihi gịnị ka e ji na-ere ụmụ anụmanụ n’ụlọ nsọ?

  2. Gịnị were Jizọs iwe?

  3. Dị ka ị na-ahụ na foto a, gịnị ka Jizọs mere, oleekwa iwu o nyere ndị ahụ na-ere nduru?

  4. Mgbe ụmụazụ Jizọs hụrụ ihe ọ na-eme, gịnị ka nke ahụ chetaara ha?

  5. Olee ógbè Jizọs si na ya gafee mgbe ọ na-alaghachi Galili?

Ajụjụ ọzọ:

  1. Gụọ Jọn 2:13-25.

    N’iburu n’uche iwe Jizọs wesara ndị na-agbanwe ego n’ụlọ nsọ, olee ụzọ e kwesịrị isi lee ire na ịzụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anya? (Jọn 2:15, 16; 1 Ndị Kọr. 10:24, 31-33)

Akụkọ nke 90

Mgbe Jizọs na Otu Nwaanyị Nọ n’Akụkụ Olulu Mmiri

  1. N’ihi gịnị ka Jizọs ji kwụsị mgbe o ruru n’otu olulu mmiri dị na Sameria, gịnịkwa ka ọ na-agwa otu nwaanyị nọ n’ebe ahụ?

  2. N’ihi gịnị ka nwaanyị ahụ ji nwee ihe ijuanya, gịnị ka Jizọs gwara ya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

  3. Olee ụdị mmiri nwaanyị ahụ chere na Jizọs na-ekwu banyere ya, ma olee mmiri nke Jizọs bu n’uche n’ezie?

  4. N’ihi gịnị ka nwaanyị ahụ ji nwee ihe ijuanya n’ihi ihe ndị Jizọs maara banyere ya, oleekwa otú Jizọs si nweta ihe ọmụma ahụ?

  5. Olee ihe ndị anyị pụrụ ịmụta site n’akụkọ banyere nwaanyị ahụ Jizọs zutere n’olulu mmiri?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jọn 4:5-43.

    1. N’ịgbaso ihe nlereanya Jizọs, olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị si n’agbụrụ ma ọ bụ mba ọzọ? (Jọn 4:9; 1 Kọr. 9:22; 1 Tim. 2:3, 4; Taị. 2:11)

    2. Uru ndị dị aṅaa ka onye ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs ga-erite n’ụzọ ime mmụọ? (Jọn 4:14; Aịsa. 58:11; 2 Kọr. 4:16)

    3. Olee otú anyị pụrụ isi gosi ekele dị ka nwaanyị Sameria ahụ, bụ́ onye ọ gụsiri agụụ ike ịkọrọ ndị ọzọ ihe ọ mụtara? (Jọn 4:7, 28; Mat. 6:33; Luk 10:40-42)

Akụkọ nke 91

Mgbe Jizọs Na-ezi Ihe n’Elu Ugwu

  1. Na foto a, ole ebe bụ ebe ahụ Jizọs nọ na-ezi ihe, ole ndị bụ ndị ahụ kasị nọrọ ya nso?

  2. Gịnị bụ aha ndịozi iri na abụọ Jizọs?

  3. Gịnị bụ Alaeze ahụ Jizọs na-ekwusa banyere ya?

  4. Gịnị ka Jizọs kụziiri ndị mmadụ ikpe ekpere maka ya?

  5. Gịnị ka Jizọs kwuru banyere otú ndị mmadụ kwesịrị isi na-emeso ibe ha?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Matiu 5:1-12.

    N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi gosi na anyị maara mkpa ime mmụọ anyị? (Mat. 5:3; Rom 10:13-15; 1 Tim. 4:13, 15, 16)

  2. Gụọ Matiu 5:21-26.

    Olee otú Matiu 5:23, 24 si mee ka ọ pụta ìhè na ụdị mmekọrịta anyị na ụmụnna anyị na-enwe ga-egosi ụdị mmekọrịta anyị na Jehova ga-enwe? (Mat. 6:14, 15; Ọma 133:1; Kọl. 3:13; 1 Jọn 4:20)

  3. Gụọ Matiu 6:1-8.

    Olee omume na-egosi mmadụ ịbụ onye ezi omume n’anya onwe ya bụ́ nke Ndị Kraịst kwesịrị izere? (Luk 18:11, 12; 1 Kọr. 4:6, 7; 2 Kọr. 9:7)

  4. Gụọ Matiu 6:25-34.

    Gịnị ka Jizọs kụziri banyere mkpa ọ dị inwe obi ike na Jehova ga-enye anyị ihe ndị na-akpa anyị n’ụzọ anụ ahụ́? (Ọpụ. 16:4; Ọma 37:25; Fil. 4:6)

  5. Gụọ Matiu 7:1-11.

    Gịnị ka ihe atụ ahụ doro anya nke dị na Matiu 7:5 na-akụziri anyị? (Ilu 26:12; Rom 2:1; 14:10; Jems 4:11, 12)

Akụkọ nke 92

Jizọs Akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ

  1. Ònye bụ nna nwatakịrị nwaanyị a nọ na foto a, n’ihi gịnịkwa ka ya na nwunye ya ji na-echegbu nnọọ onwe ha?

  2. Gịnị ka Jaịrọs mere mgbe ọ hụrụ Jizọs?

  3. Gịnị mere mgbe Jizọs na-aga n’ụlọ Jaịrọs, ozi dịkwa aṅaa ka Jaịrọs nwetara n’ụzọ?

  4. N’ihi gịnị ka ndị ahụ nọ n’ụlọ Jaịrọs ji chịa Jizọs ọchị?

  5. Mgbe ọ kpọọrọ ndịozi ya atọ nakwa nne na nna nwatakịrị nwaanyị ahụ banye n’ime ụlọ nwatakịrị ahụ, gịnị ka Jizọs mere?

  6. Olee onye ọzọ Jizọs kpọlitere n’ọnwụ, gịnịkwa ka nke a na-egosi?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Luk 8:40-56.

    Olee otú Jizọs si gosi ọmịiko n’ahụ́ nwaanyị ahụ na-arịa ọrịa oruru ọbara ma jiri ezi uche mesoo ya ihe, gịnịkwa ka ndị okenye ọgbakọ pụrụ ịmụta na nke a? (Luk 8:43, 44, 47, 48; Lev. 15:25-27; Mat. 9:12, 13; kọl. 3:12-14)

  2. Gụọ Luk 7:11-17.

    N’ihi gịnị ka ihe Jizọs gwara nwaanyị Nen ahụ di ya nwụrụ ga-eji bụrụ ihe nkasi obi dị ukwuu nye ndị ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ? (Luk 7:13; 2 Kọr. 1:3, 4; Hib. 4:15)

  3. Gụọ Jọn 11:17-44.

    Olee otú Jizọs si gosipụta na ọ dịghị njọ iru újú mgbe onye a hụrụ n’anya nwụrụ? (Jọn 11:33-36, 38; 2 Sam. 18:33; 19:1-4)

Akụkọ nke 93

Jizọs Enye Ọtụtụ Mmadụ Nri

  1. Olee ihe jọgburu onwe ya nke mere Jọn Onye Na-eme Baptizim, oleekwa otú o si metụ Jizọs n’ahụ́?

  2. Olee otú Jizọs si nye ìgwè mmadụ ahụ so ya nri, nri hàkwa aṅaa fọdụrụ?

  3. N’ihi gịnị ka ụjọ ji jide ndị na-eso ụzọ Jizọs n’abalị, gịnịkwa mere Pita?

  4. Olee otú Jizọs si nye ọtụtụ puku mmadụ nri na nke ugboro abụọ ya?

  5. N’ihi gịnị ka ọnọdụ ga-eji magbuo onwe ya mgbe Jizọs ga-achị ụwa dị ka Eze nke Chineke họpụtara?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Matiu 14:1-32.

    1. Olee ihe akụkọ dị na Matiu 14:23-32 na-eme ka anyị ghọta banyere àgwà Pita?

    2. Olee otú ihe ndị e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ si egosi na Pita bịara tozuo okè ma kwụsị ịdị na-eme ihe n’ebughị ụzọ chebara ya echiche? (Mat. 14:27-30; Jọn 18:10; 21:7; Ọrụ 2:14, 37-40; 1 Pita 5:6, 10)

  2. Gụọ Matiu 15:29-38.

    Olee otú Jizọs si gosi nkwanye ùgwù maka ihe oriri nke Nna ya nyere? (Mat. 15:37; Jọn 6:12; Kọl. 3:15)

  3. Gụọ Jọn 6:1-21.

    Olee otú Ndị Kraịst taa pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya Jizọs n’ihe banyere ọchịchị? (Jọn 6:15; Mat. 22:21; Rom 12:2; 13:1-4)

Akụkọ nke 94

Jizọs Hụrụ Ụmụntakịrị n’Anya

  1. Gịnị ka ndịozi ahụ na-arụ ụka banyere ya mgbe ha si otu ebe dị anya na-alọta?

  2. N’ihi gịnị ka Jizọs ji kpọta obere nwa ma mee ka o guzoro n’etiti ndịozi ya?

  3. Olee otú ndịozi ahụ kwesịrị isi mụta ịdị ka ụmụntakịrị?

  4. Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, olee otú Jizọs si gosi na ya hụrụ ụmụntakịrị n’anya?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Matiu 18:1-4.

    N’ihi gịnị ka Jizọs ji eji ihe atụ ezi ihe? (Mat. 13:34, 36; Mak 4:33, 34)

  2. Gụọ Matiu 19:13-15.

    Olee àgwà ụmụaka ndị anyị na-aghaghị iṅomi ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ngọzi nke Alaeze ahụ? (Ọma 25:9; 138:6; 1 Kọr. 14:20)

  3. Gụọ Mak 9:33-37.

    Gịnị ka Jizọs kụziiri ndịozi ya banyere ịchọ ọkwá? (Mak 9:35; Mat. 20:25, 26; Gal. 6:3; Fil. 2:5-8)

  4. Gụọ Mak 10:13-16.

    Ruo ókè hà aṅaa ka ọ dị mfe ijekwuru Jizọs, gịnịkwa ka ndị okenye ọgbakọ pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya ya? (Mak 6:30-34; Fil. 2:1-4; 1 Tim. 4:12)

Akụkọ nke 95

Ụzọ Jizọs Si Akụzi Ihe

  1. Olee ajụjụ otu nwoke jụrụ Jizọs, n’ihi gịnịkwa?

  2. Olee ihe Jizọs na-eji eme ihe mgbe ụfọdụ ma ọ na-akụzi ihe, gịnịkwa ka anyị mụtaworo banyere ndị Juu na ndị Sameria?

  3. N’akụkọ ahụ Jizọs kọrọ, gịnị mere otu onye Juu nke na-aga Jeriko?

  4. Gịnị mere mgbe onye nchụàjà bụ́ onye Juu na otu onye Livaị si n’ụzọ ahụ na-agafe?

  5. Na foto a, ònye na-enyere onye Juu ahụ e merụrụ ahụ́ aka?

  6. Mgbe Jizọs kọsịrị akụkọ ahụ, ajụjụ dị aṅaa ka ọ jụrụ, oleekwa ihe nwoke ahụ zara?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Luk 10:25-37.

    1. Kama ịgwa ya azịza ya ozugbo, olee otú Jizọs si nyere otu nwoke nke maara Iwu aka ịtụgharị uche n’otu okwu? (Luk 10:26; Mat. 16:13-16)

    2. Olee otú Jizọs si jiri ihe atụ mee ihe iji katọọ asị na-enweghị isi nke ndị na-ege ya ntị kpọrọ ndị ọzọ? (Luk 10:36, 37; 18:9-14; Taị. 1:9)

Akụkọ nke 96

Jizọs Agwọọ Ndị Ọrịa

  1. Gịnị ka Jizọs na-eme ka ọ na-ejegharị n’ala ahụ niile?

  2. Gịnị ka Jizọs gwara ndịozi ya ihe dị ka afọ atọ ka e mesịrị ya baptizim?

  3. Ole ndị bụ ndị a nọ na foto a, gịnịkwa ka Jizọs meere nwaanyị ahụ?

  4. N’ihi gịnị ka otú Jizọs si zaghachi n’ihe ndị ndú okpukpe ahụ kwuru ji menye ha ihere?

  5. Mgbe Jizọs na ndịozi ya nọ nso na Jeriko, gịnị ka Jizọs meere ndị ìsì abụọ na-arịọ arịrịọ?

  6. N’ihi gịnị ka Jizọs ji rụọ ọrụ ebube dị iche iche?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Matiu 15:30, 31.

    Olee ụzọ dị ebube Jehova si gosipụta ike ya site n’aka Jizọs, oleekwa otú ọ pụrụ isi metụta otú anyị si ghọta ihe Jehova kwere ná nkwa maka ụwa ọhụrụ ahụ? (Ọma 37:29; Aịsa. 33:24)

  2. Gụọ Luk 13:10-17.

    Olee otú eziokwu ahụ bụ́ na Jizọs rụrụ ụfọdụ n’ime ọrụ ebube ya ndị kasị dịrị ịrịba ama n’ụbọchị Sabat si egosi ụdị ahụ́ iru ala ọ ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri ya? (Luk 13:10-13; Ọma 46:9; Mat. 12:8; Kọl. 2:16, 17; Mkpu. 21:1-4)

  3. Gụọ Matiu 20:29-34.

    Olee otú akụkọ a si egosi na ọ dịghị mgbe Jizọs ji nnọọ ọrụ n’aka nke na o nweghị ohere inyere ndị mmadụ aka, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a? (Deut. 15:7; Jems 2:15, 16; 1 Jọn 3:17)

Akụkọ nke 97

Jizọs Abịa Dị Ka Eze

  1. Mgbe Jizọs bịara n’otu obodo nta dị nso na Jeruselem, gịnị ka ọ gwara ndịozi ya ka ha gaa mee?

  2. Na foto a, gịnị na-eme ka Jizọs rutewere obodo Jeruselem?

  3. Gịnị ka ụmụntakịrị mere mgbe ha hụrụ Jizọs ka ọ na-agwọ ndị ìsì na ndị ngwụrọ?

  4. Gịnị ka Jizọs gwara ndị nchụàjà ahụ iwe ji?

  5. Olee otú anyị pụrụ isi dị ka ụmụntakịrị ahụ toro Jizọs?

  6. Gịnị ka ndịozi ahụ chọrọ ịmata?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Matiu 21:1-17.

    1. Olee otú ụzọ Jizọs si banye na Jeruselem dị ka Eze si dị iche n’otú ndị ọchịagha nwere mmeri n’oge ndị Rom si abanye n’obodo? (Mat. 21:4, 5; Zek. 9:9; Fil. 2:5-8; Kọl. 2:15)

    2. Gịnị ka ndị na-eto eto pụrụ ịmụta site n’aka ụmụ okoro Izrel ndị ahụ, bụ́ ndị hotara ihe e kwuru n’Abụ Ọma 118 mgbe Jizọs na-abanye n’ụlọ nsọ ahụ? (Mat. 21:9, 15; Ọma 118:25, 26; 2 Tim. 3:15; 2 Pita 3:18)

  2. Gụọ Jọn 12:12-16.

    Gịnị ka ojiji ndị ahụ na-eto Jizọs ji igu nkwụ n’aka na-ese onyinyo ya? (Jọn 12:13; Fil. 2:10; Mkpu. 7:9, 10)

Akụkọ nke 98

N’elu Ugwu Oliv

  1. Na foto a, olee onye nke bụ́ Jizọs, ole ndị kwa bụ ndị ahụ ha na ya nọ?

  2. Gịnị ka ndị nchụàjà nwara ime Jizọs n’ụlọ nsọ, gịnịkwa ka ọ gwara ha?

  3. Gịnị ka ndịozi Jizọs jụrụ ya?

  4. N’ihi gịnị ka Jizọs ji gwa ndịozi ya ụfọdụ n’ime ihe ndị ga na-eme n’ụwa mgbe ọ malitere ịchị achị dị ka Eze n’eluigwe?

  5. Gịnị ka Jizọs kwuru na ọ ga-ewere ọnọdụ tupu ya akwụsị ihe ọjọọ niile n’ụwa?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Matiu 23:1-39.

    1. Ọ bụ ezie na Akwụkwọ Nsọ gosiri na a pụrụ iji utu aha eme ihe, gịnị ka ihe Jizọs kwuru na Matiu 23:8-11 na-egosi banyere iji utu aha ndị e ji eto mmadụ eme ihe n’ọgbakọ Ndị Kraịst? (Ọrụ 26:25; Rom 13:7; 1 Pita 2:13, 14)

    2. Gịnị ka ndị Farisii ji mee ihe iji gbalịa igbochi ndị mmadụ ịghọ Ndị Kraịst, oleekwa otú ndị ndú okpukpe siworo jiri ụzọ ndị dị otú ahụ na-eme ihe n’oge a? (Mat. 23:13; Luk 11:52; Jọn 9:22; 12:42; 1 Tesa. 2:16)

  2. Gụọ Matiu 24:1-14.

    1. Na Matiu 24:13, olee otú e si mesie mkpa ọ dị inwe ndidi ike?

    2. Gịnị ka okwu bụ́ “ọgwụgwụ” nke dị na Matiu 24:13 pụtara? (Mat. 16:27; Rom 14:10-12; 2 Kọr. 5:10)

  3. Gụọ Mak 13:3-10.

    Olee okwu dị na Mak 13:10 nke na-egosi na ọ dị mkpa ka e kwusaa ozi ọma ngwa ngwa, oleekwa otú okwu Jizọs kwesịrị isi metụta anyị? (Rom 13:11, 12; 1 Kọr. 7:29-31; 2 Tim. 4:2)

Akụkọ nke 99

N’ime Ụlọ Dị n’Ụlọ Elu

  1. Dị ka e gosiri na foto a, n’ihi gịnị ka Jizọs na ndịozi iri na abụọ ya ji nọrọ ná nnukwu ime ụlọ dị n’ụlọ elu?

  2. Ònye bụ nwoke ahụ na-apụ apụ, gịnịkwa ka ọ na-aga ime?

  3. Olee nri pụrụ iche nke Jizọs malitere mgbe ha risịrị nri Ememe Ngabiga?

  4. Ihe omume dị aṅaa ka Ememe Ngabiga ahụ chetaara ndị Izrel, gịnịkwa ka nri a pụrụ iche na-echetara ụmụazụ Jizọs?

  5. Mgbe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị gasịrị, gịnị ka Jizọs gwara ụmụazụ ya, gịnịkwa ka ha mere?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Matiu 26:14-30.

    1. Olee otú Matiu 26:15 si egosi na Judas kpachaara anya rara Jizọs nyefee n’aka ndị iro?

    2. Olee nzube abụọ ọbara Jizọs wụsịrị mezuru? (Mat. 26:27, 28; Jer. 31:31-33; Efe. 1:7; Hib. 9:19, 20)

  2. Gụọ Luk 22:1-39.

    Gịnị ka ọ pụtara bụ́ na Setan banyere n’ime Judas? (Luk 22:3; Jọn 13:2; Ọrụ 1:24, 25)

  3. Gụọ Jọn 13:1-20.

    1. N’iburu n’uche ihe e dekọrọ na Jọn 13:2, à pụrụ ịta Judas ụta maka ihe o mere, oleekwa ihe ndị ohu Chineke pụrụ ịmụta site na nke a? (Jen. 4:7; 2 Kọr. 2:11; Gal. 6:1; Jems 1:13, 14)

    2. Olee ihe mmụta gbara ọkpụrụkpụ nke Jizọs kụziri? (Jọn 13:15; Mat. 23:11; 1 Pita 2:21)

  4. Gụọ Jọn 17:1-26.

    Gịnị ka ekpere Jizọs kpere ka ụmụazụ ya “bụrụ otu” pụtara? (Jọn 17:11, 21-23; Rom 13:8; 14:19; Kọl. 3:14)

Akụkọ nke 100

Mgbe Jizọs Nọ n’Ime Ubi A Gbara Ogige

  1. Olee ebe Jizọs na ndịozi ya gara mgbe ha si n’ime ụlọ nke ụlọ elu ahụ pụta, gịnịkwa ka ọ gwara ha ka ha mee?

  2. Gịnị ka Jizọs chọpụtara mgbe ọ laghachiri n’ebe ndịozi ya nọ, ugboro olekwa ka nke a mere?

  3. Ole ndị batara n’ime ubi ahụ a gbara ogige, gịnịkwa ka Judas Iskarịọt mere, dị ka anyị na-ahụ na foto a?

  4. N’ihi gịnị ka Judas ji sutụ Jizọs ọnụ, gịnịkwa ka Pita mere?

  5. Gịnị ka Jizọs gwara Pita, gịnịkwa mere na Jizọs agwaghị Chineke ka o zite ndị mmụọ ozi?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Matiu 26:36-56.

    1. Olee otú ụzọ Jizọs si dọọ ndịozi ya aka ná ntị si bụrụ ezi ihe nlereanya nye ndị okenye ọgbakọ taa? (Mat. 20:25-28; 26:40, 41; Gal. 5:17; Efe. 4:29, 31, 32)

    2. Olee otú Jizọs si lee mmadụ iji ngwá ọgụ lụsoo mmadụ ibe ya ọgụ anya? (Mat. 26:52; Luk 6:27, 28; Jọn 18:36)

  2. Gụọ Luk 22:39-53.

    Mgbe otu mmụọ ozi pụtara n’ihu Jizọs n’ogige Getsemeni iji wusie ya ike, nke ahụ ọ̀ na-egosi na okwukwe Jizọs esighịzi ike? Kọwaa. (Luk 22:41-43; Aịsa. 49:8; Mat. 4:10, 11; Hib. 5:7)

  3. Gụọ Jọn 18:1-12.

    Olee otú Jizọs si chebe ndịozi ya pụọ n’aka ndị na-emegide ya, oleekwa ihe anyị pụrụ ịmụta site na nke a? (Jọn 10:11, 12; 18:1, 6-9; Hib. 13:6; Jems 2:25)

Akụkọ nke 101

E Gbuo Jizọs

  1. Olee onye bụ́ isi nke kpatara ọnwụ Jizọs?

  2. Gịnị ka ndịozi Jizọs mere mgbe ndị ndú okpukpe kpụụrụ Jizọs?

  3. Gịnị mere n’ụlọ Keifas, bụ́ nnukwu onye nchụàjà?

  4. Gịnị mere Pita ji pụọ gaa kwaa ákwá?

  5. Mgbe a kpọghachitere Jizọs n’ihu Paịlet, gịnị ka ndị isi nchụàjà tiri ná mkpu?

  6. Gịnị mere Jizọs n’ehihie Friday, nkwa dịkwa aṅaa ka o kwere onye mmebi iwu a kpọgidere n’osisi dị n’akụkụ ya?

  7. Olee ebe Paradaịs ahụ Jizọs kwuru okwu ya ga-adị?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Matiu 26:57-75.

    N’ụzọ dị aṅaa ka ndị òtù ụlọikpe ukwu nke ndị Juu si gosi na ha nwere obi ọjọọ? (Mat. 26:59, 67, 68)

  2. Gụọ Matiu 27:1-50.

    N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ụta ahụ Judas kwara esighị ya n’obi? (Mat. 27:3, 4; Mak 3:29; 14:21; 2 Kọr. 7:10, 11)

  3. Gụọ Luk 22:54-71.

    Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta ná ngọnahụ Pita gọnahụrụ Jizọs n’abalị ahụ a raara Jizọs nye ma jide ya? (Luk 22:60-62; Mat. 26:31-35; 1 Kọr. 10:12)

  4. Gụọ Luk 23:1-49.

    Olee otú Jizọs si meghachi omume n’ikpe na-ezighị ezi e kpere ya, oleekwa ihe anyị pụrụ ịmụta site na nke a? (Luk 23:33, 34; Rom 12:17-19; 1 Pita 2:23)

  5. Gụọ Jọn 18:12-40.

    Gịnị ka eziokwu ahụ bụ́ na Pita tụrụ egwu mmadụ ruo nwa oge, ma mesịakwa kwụsị ịtụ egwu ma ghọọ onyeozi dị ịrịba ama na-egosi? (Jọn 18:25-27; 1 Kọr. 4:2; 1 Pita 3:14, 15; 5:8, 9)

  6. Gụọ Jọn 19:1-30.

    1. Olee ụzọ ziri ezi Jizọs si lee ihe onwunwe anya? (Jọn 2:1, 2, 9, 10; 19:23, 24; Mat. 6:31, 32; 8:20)

    2. Olee otú ihe ndị Jizọs kwuru tupu ya anwụọ si egosi na ọ kwadoro ọbụbụeze Jehova? (Jọn 16:33; 19:30; 2 Pita 3:14; 1 Jọn 5:4)

Akụkọ nke 102

Jizọs Dị Ndụ

  1. Ònye bụ nwaanyị a nọ na foto a, ole ndị bụ ndị ikom abụọ ahụ, oleekwa ebe ha nọ ihe a?

  2. N’ihi gịnị ka Paịlet ji gwa ndị nchụàjà ka ha ziga ndị agha ka ha chewe ili Jizọs nche?

  3. Gịnị ka otu mmụọ ozi mere n’isi ụtụtụ ụbọchị nke atọ ka Jizọs nwụsịrị, ma gịnị ka ndị nchụàjà ahụ mere?

  4. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị inyom ji nwee ihe ijuanya mgbe ha gara n’ili Jizọs?

  5. N’ihi gịnị ka Pita na Jọn ji gbaga n’ili Jizọs, gịnịkwa ka ha hụrụ?

  6. Gịnị mere ahụ́ Jizọs, ma gịnị ka o mere iji gosi ndịozi ya na ya dị ndụ?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Matiu 27:62-66 na 28:1-15.

    Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, olee otú ndị isi nchụàjà, ndị Farisii, na ndị okenye si mehie megide mmụọ nsọ? (Mat. 12:24, 31, 32; 28:11-15)

  2. Gụọ Luk 24:1-12.

    Olee otú akụkọ banyere mbilite n’ọnwụ Jizọs si gosi na Jehova na-ele ndị inyom anya dị ka ndị pụrụ ịgba akaebe ziri ezi? (Luk 24:4, 9, 10; Mat. 28:1-7)

  3. Gụọ Jọn 20:1-12.

    Olee otú Jọn 20:8, 9 si enyere anyị aka ịhụ mkpa ọ dị inwe ndidi mgbe anyị na-aghọtachaghị otú otu amụma Bible si mezuo? (Ilu 4:18; Mat. 17:22, 23; Luk 24:5-8; Jọn 16:12)

Akụkọ nke 103

N’Ime Ụlọ A Kpọchiri Akpọchi

  1. Gịnị ka Meri gwara otu nwoke nke o chere na ọ bụ ya na-elekọta ogige ahụ, ma gịnị mere ka ọ ghọta na nwoke ahụ bụ Jizọs?

  2. Olee ahụmahụ ndịozi abụọ ji ụkwụ na-aga obodo nta bụ́ Emeọs nwere?

  3. Olee ihe ijuanya mere mgbe ndị na-eso ụzọ abụọ gwara ndịozi na ha hụrụ Jizọs?

  4. Ugboro ole ka Jizọs pụtaworo n’ihu ụmụazụ ya?

  5. Gịnị ka Tọmọs kwuru mgbe ọ nụrụ na ndị na-eso ụzọ ahụwo Onyenwe ha, ma gịnị mere mgbe ụbọchị asatọ gasịrị?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jọn 20:11-29.

    Ihe Jizọs kwuru na Jọn 20:23 ọ̀ pụtara na mmadụ nwere ikike ịgbaghara mmehie? Kọwaa. (Ọma 49:2, 7; Aịsa. 55:7; 1 Tim. 2:5, 6; 1 Jọn 2:1, 2)

  2. Gụọ Luk 24:13-43.

    Olee otú anyị pụrụ isi kwadebe obi anyị ka o nwee ike ịnabata eziokwu Bible? (Luk 24:32, 33; Ezra 7:10; Mat. 5:3; Ọrụ 16:14; Hib. 5:11-14)

Akụkọ nke 104

Jizọs Alaghachi n’Eluigwe

  1. HN’otu oge, ọ̀ bụ ndị na-eso ụzọ ole hụrụ Jizọs, gịnịkwa ka ọ gwara ha okwu ya?

  2. Gịnị bụ Alaeze Chineke, oleekwa otú ndụ ga-adị n’ụwa mgbe Jizọs ga-amalite ịchị dị ka Eze ruo otu puku afọ?

  3. Ò ruola ụbọchị ole Jizọs nọworo na-apụta n’ihu ndị na-eso ụzọ ya, ma oge o ruola ka o mee gịnị?

  4. Nwa obere oge tupu ya ahapụ ndị na-eso ụzọ ya, gịnị ka Jizọs gwara ha ka ha mee?

  5. Gịnị na-eme na foto a, oleekwa otú e si kpuchie Jizọs ka anya ghara ịhụ ya?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ 1 Ndị Kọrint 15:3-8.

    N’ihi gịnị ka Pọl onyeozi ji nwee nnọọ obi ike ikwu okwu banyere mbilite n’ọnwụ Jizọs, oleekwa ụfọdụ ihe Ndị Kraịst pụrụ iji obi ike kwuo banyere ha? (1 Kọr. 15:4, 7, 8; Aịsa. 2:2, 3; Mat. 24:14; 2 Tim. 3:1-5)

  2. Gụọ Ọrụ Ndịozi 1:1-11.

    Olee ebe e kwusaruru ozi ọma ahụ, dị ka e buru n’amụma n’Ọrụ Ndịozi 1:8? (Ọrụ 6:7; 9:31; 11:19-21; Kọl. 1:23)

Akụkọ nke 105

Ha Nọ na Jeruselem Na-echere

  1. Dị ka anyị na-ahụ na foto a, gịnị mere ụmụazụ Jizọs, bụ́ ndị nọ na Jeruselem na-echere?

  2. Olee ihe juru ndị bịara na Jeruselem anya?

  3. Gịnị ka Pita kọwaara ndị ahụ bịara na Jeruselem?

  4. Olee mmetụta ndị ahụ nwere mgbe ha gesịrị Pita ntị, gịnịkwa ka ọ gwara ha ka ha mee?

  5. Ọ̀ bụ mmadụ ole ka e mere baptizim n’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọrụ Ndịozi 2:1-47.

    1. Olee otú ihe Pita kwuru n’Ọrụ Ndịozi 2:23, 36 si egosi na mba ndị Juu dum so kpata ọnwụ Jizọs? (1 Tesa. 2:14, 15)

    2. Olee otú Pita si setịpụ ezi ihe nlereanya n’ịtụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ? (Ọrụ 2:16, 17, 29, 31, 36, 39; Kọl. 4:6)

    3. Olee otú Pita si jiri nke mbụ n’ime “mkpịsị ugodi nke alaeze eluigwe,” nke Jizọs kwere nkwa inye ya, mee ihe? (Ọrụ 2:14, 22-24, 37, 38; Mat. 16:19)

Akụkọ nke 106

A Tọhapụ Ha n’Ụlọ Mkpọrọ

  1. Gịnị mere Pita na Jọn n’otu ehihie ka ha na-aga n’ụlọ nsọ?

  2. Gịnị ka Pita gwara otu nwoke onye ngwụrọ, gịnịkwa ka Pita nyere ya bụ́ nke dị oké ọnụ ahịa karịa ego?

  3. N’ihi gịnị ka ndị ndú okpukpe ji wee iwe, gịnịkwa ka ha mere Pita na Jọn?

  4. Gịnị ka Pita gwara ndị ndú okpukpe ahụ, gịnịkwa ka a dọrọ ndịozi ahụ aka ná ntị banyere ya?

  5. N’ihi gịnị ka ndị ndú okpukpe ahụ ji nwee anyaụfụ, ma gịnị mere mgbe e tinyere ndịozi ahụ n’ụlọ mkpọrọ nke ugboro abụọ ya?

  6. Gịnị ka ndịozi ahụ zara mgbe a kpọbatara ha n’ụlọ nzukọ Sanhedrin?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọrụ Ndịozi 3:1-10.

    Ọ bụ ezie na e nyeghị anyị ikike ịrụ ọrụ ebube taa, olee otú okwu Pita nke e dekọrọ n’Ọrụ Ndịozi 3:6 si enyere anyị aka ịghọta uru ozi Alaeze ahụ bara? (Jọn 17:3; 2 Kọr. 5:18-20; Fil. 3:8)

  2. Gụọ Ọrụ Ndịozi 4:1-31.

    Mgbe anyị zutere mmegide n’ozi, olee ụzọ anyị kwesịrị isi ṅomie ụmụnna anyị Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ? (Ọrụ 4:29, 31; Efe. 6:18-20; 1 Tesa. 2:2)

  3. Gụọ Ọrụ Ndịozi 5:17-42.

    Olee otú ụfọdụ ndị na-abụghị Ndịàmà, ma n’oge gara aga ma n’oge a, siworo gosi na ha nwere ezi uche n’ihe banyere ọrụ nkwusa anyị na-eme? (Ọrụ 5:34-39)

Akụkọ nke 107

A Tụọ Stivin Nkume

  1. Ònye bụ Stivin, gịnịkwa ka Chineke nọworo na-enyere ya aka ime?

  2. Gịnị ka Stivin kwuru bụ́ nke were ndị ndú okpukpe iwe nke ukwuu?

  3. Mgbe ndị ikom ahụ kpụpụrụ Stivin n’azụ obodo, gịnị ka ha mere ya?

  4. Na foto a, ònye bụ nwa okorobịa ahụ guzo n’akụkụ uwe ndị ahụ?

  5. Tupu ya anwụọ, gịnị ka Stivin gwara Jehova n’ekpere?

  6. Iji ṅomie Stivin, gịnị ka anyị kwesịrị ime mgbe mmadụ mere anyị ihe ọjọọ?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọrụ Ndịozi 6:8-15.

    Olee ụzọ aghụghọ ndị ndị ndú okpukpe jiworo mee ihe iji gbalịa ịkwụsị ọrụ nkwusa nke Ndịàmà Jehova na-arụ? (Ọrụ 6:9, 11, 13)

  2. Gụọ Ọrụ Ndịozi 7:1-60.

    1. Gịnị nyeere Stivin aka ịgbachitere ozi ọma ahụ n’ụzọ dị irè n’ihu ndị Sanhedrin, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya ya? (Ọrụ 7:51-53; Rom 15:4; 2 Tim. 3:14-17; 1 Pita 3:15)

    2. Olee àgwà anyị kwesịrị igosipụta n’ebe ndị na-emegide ọrụ anyị nọ? (Ọrụ 7:58-60; Mat. 5:44; Luk 23:33, 34)

Akụkọ nke 108

N’ụzọ Damaskọs

  1. Gịnị ka Sọl mere mgbe e gbusịrị Stivin?

  2. Mgbe Sọl na-aga Damaskọs, olee ihe dị ịtụnanya merenụ?

  3. Gịnị ka Jizọs gwara Sọl ka o mee?

  4. Olee ntụziaka Jizọs nyere Ananayas, oleekwa otú Sọl si malite ịhụ ụzọ ọzọ?

  5. Olee aha e jizi mara Sọl, oleekwa otú e si jiri Sọl rụọ ọrụ?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọrụ Ndịozi 8:1-4.

    Olee otú mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ e megidere ọgbakọ Ndị Kraịst e guzobere ọhụrụ si mee ka nkwenkwe Ndị Kraịst gbasaa, oleekwa ihe yiri ya nke meworo n’oge a? (Ọrụ 8:4; Aịsa. 54:17)

  2. Gụọ Ọrụ Ndịozi 9:1-20.

    Olee ọrụ nwere akụkụ atọ nke Jizọs kwuru na ya chọrọ ka Sọl rụọ? (Ọrụ 9:15; 13:5; 26:1; 27:24; Rom 11:13)

  3. Gụọ Ọrụ Ndịozi 22:6-16.

    Olee otú anyị pụrụ isi dị ka Ananayas, oleekwa ihe mere o ji dị mkpa ka anyị mee otú ahụ? (Ọrụ 22:12; 1 Tim. 3:7; 1 Pita 1:14-16; 2:12)

  4. Gụọ Ọrụ Ndịozi 26:8-20.

    Olee otú ntọghata a tọghatara Sọl bata n’Iso Ụzọ Kraịst si bụrụ ihe agbamume nye ndị di ma ọ bụ nwunye ha na-ekweghị ekwe? (Ọrụ 26:11; 1 Tim 1:14-16; 2 Tim. 4:2; 1 Pita 3:1-3)

Akụkọ nke 109

Pita Agaa Ịhụ Kọniliọs

  1. Ònye bụ nwoke ahụ na-akpọ isi ala na foto a?

  2. Gịnị ka otu mmụọ ozi gwara Kọniliọs?

  3. Gịnị ka Chineke mere ka Pita hụ mgbe ọ nọ n’elu ụlọ Saịmọn na Jọpa?

  4. N’ihi gịnị ka Pita ji gwa Kọniliọs na o kwesịghị ịkpọrọ ya isi ala ma ọ bụ fee ya ofufe?

  5. N’ihi gịnị ka ndị Juu bụ́ ndị na-eso ụzọ, bụ́ ndị ha na Pita so, ji nwee ihe ijuanya?

  6. Olee ihe dị mkpa anyị kwesịrị ịmụta site n’ojije Pita jere ịhụ Kọniliọs?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọrụ Ndịozi 10:1-48.

    Gịnị ka ihe Pita kwuru n’Ọrụ Ndịozi 10:42 na-egosi banyere ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ? (Mat. 28:19; Mak 13:10; Ọrụ 1:8)

  2. Gụọ Ọrụ Ndịozi 11:1-18.

    Gịnị ka Pita meziri mgbe ntụziaka Jehova nyere banyere Ndị Jentaịl bịara doo anya, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya ya? (Ọrụ 11:17, 18; 2 Kọr. 10:5; Efe. 5:17)

Akụkọ nke 110

Timoti—Onye Inyeaka Ọhụrụ nke Pọl

  1. Ònye bụ nwa okorobịa a nọ na foto a, olee ebe o bi, gịnị bụ aha nne ya, gịnịkwa bụ aha nne nne ya?

  2. Gịnị ka Timoti kwuru mgbe Pọl jụrụ ya ma ọ̀ ga-achọ isonyere ya na Saịlas jee kwusaara ndị bi n’ebe ndị dị anya ozi ọma?

  3. Olee ebe e bu ụzọ kpọọ ụmụazụ Jizọs Ndị Kraịst?

  4. Olee ụfọdụ n’ime obodo ndị Pọl, Saịlas, na Timoti gara ozugbo ha hapụrụ Listra?

  5. Olee otú Timoti si nyere Pọl aka, oleekwa ajụjụ ndị na-eto eto taa kwesịrị ịjụ onwe ha?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọrụ Ndịozi 9:19-30.

    Olee otú Pọl onyeozi si jiri akọ mee ihe mgbe a na-emegide ozi ọma ahụ? (Ọrụ 9:22-25, 29, 30; Mat. 10:16)

  2. Gụọ Ọrụ Ndịozi 11:19-26.

    Olee otú ihe e dekọrọ n’Ọrụ Ndịozi 11:19-21, 26 si egosi na mmụọ Jehova na-eduzi ọrụ nkwusa ahụ?

  3. Gụọ Ọrụ Ndịozi 13:13-16, 42-52.

    Olee otú Ọrụ Ndịozi 13:51, 52 si egosi na ndị na-eso ụzọ Jizọs ekweghị ka mmegide kụda ha mmụọ? (Mat. 10:14; Ọrụ 18:6; 1 Pita 4:14)

  4. Gụọ Ọrụ Ndịozi 14:1-6, 19-28.

    Olee otú okwu bụ́ “ha nyefekwara ha n’aka Jehova” si eme ka anyị gharazie inwe nchegbu na-enweghị isi ka anyị na-enyere ndị ọhụrụ aka? (Ọrụ 14:21-23; 20:32; Jọn 6:44)

  5. Gụọ Ọrụ Ndịozi 16:1-5.

    Olee otú nkweta Timoti ji obi ya niile kweta ka e bie ya úgwù si emesi ike mkpa ọ dị ime “ihe niile n’ihi ozi ọma” ahụ? (Ọrụ 16:3; 1 Kọr. 9:23; 1 Tesa. 2:8)

  6. Gụọ Ọrụ Ndịozi 18:1-11, 18-22.

    Gịnị ka Ọrụ Ndịozi 18:9, 10 na-egosi banyere ojiji Jizọs ji aka ya na-eduzi ọrụ nkwusa ahụ, nke ahụ na-emekwa ka anyị nwee obi ike na gịnị ga-eme taa? (Mat. 28:20)

Akụkọ nke 111

Nwata Nwoke Ụra Buuru

  1. Na foto a, ònye bụ nwata nwoke ahụ dina n’ala, gịnịkwa mere ya?

  2. Gịnị ka Pọl mere mgbe ọ hụrụ na nwata nwoke ahụ anwụọla?

  3. Olee ebe Pọl, Timoti, na ndị ha na ha so na-eme njem na-aga, gịnịkwa mere mgbe ha kwụsịrị na Militọs?

  4. Gịnị ka Agabọs onye amụma dọrọ Pọl aka ná ntị banyere ya, oleekwa otú ihe ahụ onye amụma ahụ kwuru si mezuo?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọrụ Ndịozi 20:7-38.

    1. Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-adị “ọcha n’ebe ọbara mmadụ niile dị,” dị ka Pọl si kwuo n’Ọrụ Ndịozi 20:26, 27? (Ezik. 33:8; Ọrụ 18:6, 7)

    2. N’ihi gịnị ka ndị okenye ji kwesị ịdị “na-ejidesi okwu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi aka ike” mgbe ha na-ezi ihe? (Ọrụ 20:17, 29, 30; Taị. 1:7-9; 2 Tim. 1:13)

  2. Gụọ Ọrụ Ndịozi 26:24-32.

    Olee otú Pọl si jiri ọbụbụ ọ bụ onye Rom mee ihe n’ịrụzu ọrụ nkwusa Jizọs nyere ya? (Ọrụ 9:15; 16:37, 38; 25:11, 12; 26:32; Luk 21:12, 13)

Akụkọ nke 112

Ụgbọ Ha Ekpuo n’Otu Agwaetiti

  1. Gịnị mere ụgbọ Pọl nọ n’ime ya ka ụgbọ ahụ na-agafe na nso agwaetiti Krit?

  2. Gịnị ka Pọl gwara ndị nọ n’ụgbọ ahụ?

  3. Olee otú ụgbọ ahụ si tiwasịa?

  4. Ntụziaka ndị dị aṅaa ka onyeisi ndị agha nke na-elekọta ha nyere, ọ̀ bụkwa mmadụ ole ruru n’elu ala n’udo?

  5. Gịnị bụ aha agwaetiti ahụ ha kwụsịrị na ya, gịnịkwa mere Pọl mgbe ihu igwe bịara ka mma?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọrụ Ndịozi 27:1-44.

    Olee otú ịgụ banyere ojiji Pọl ji ụgbọ mmiri gaa Rom ga-esi mee ka anyị nwekwuo obi ike na ihe ndị e dekọrọ n’ime Bible ziri ezi? (Ọrụ 27:16-19, 27-32; Luk 1:3; 2 Tim. 3:16, 17)

  2. Gụọ Ọrụ Ndịozi 28:1-14.

    Ọ bụrụ na a kpaliri ndị ọgọ mmụọ bi na Mọlta igosi Pọl onyeozi na ndị ha na ya so “obiọma pụrụ iche,” gịnị ka e kwesịrị ịkpali Ndị Kraịst ime, oleekwa ụzọ kasị mma anyị ga-esi mee nke a? (Ọrụ 28:1, 2; Hib. 13:1, 2; 1 Pita 4:9)

Akụkọ nke 113

Mgbe Pọl Nọ na Rom

  1. Ònye ka Pọl kwusaara ozi ọma mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ na Rom?

  2. Na foto a, ònye bụ onye ọbịa nke a nọ na tebụl, gịnịkwa ka ọ na-emere Pọl?

  3. Ònye bụ Epafrọdaịtọs, oleekwa ihe o wegara na Filipaị n’oge ọ na-alaghachi n’ebe ahụ?

  4. N’ihi gịnị ka Pọl ji degara ezigbo enyi ya bụ́ Faịlimọn akwụkwọ ozi?

  5. Gịnị ka Pọl mere mgbe a tọhapụrụ ya, gịnịkwa mesịrị mee ya?

  6. Ònye ka Jehova ji mee ihe n’ide akwụkwọ ndị ikpeazụ nke Bible, oleekwa ihe akwụkwọ Mkpughe na-akọ banyere ya?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Ọrụ Ndịozi 28:16-31 na Ndị Filipaị 1:13.

    Olee otú Pọl si jiri oge ya mee ihe mgbe a tụrụ ya mkpọrọ na Rom, oleekwa otú okwukwe siri ike o nwere si metụta ọgbakọ Ndị Kraịst? (Ọrụ 28:23, 30; Fil. 1:14)

  2. Gụọ Ndị Filipaị 2:19-30.

    Olee ihe Pọl kwuru nke na-egosi obi ekele o nwere banyere Timoti na Epafrọdaịtọs, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Pọl? (Fil. 2:20, 22, 25, 29, 30; 1 Kọr. 16:18; 1 Tesa. 5:12, 13)

  3. Gụọ Faịlimọn 1-25.

    1. Gịnị kwaliri Pọl ịgba Faịlimọn ume ime ihe ziri ezi, oleekwa otú nke a si bụrụ ihe nduzi nye ndị okenye taa? (Faị. 9; 2 Kọr. 8:8; Gal. 5:13)

    2. Olee otú okwu Pọl nke dị na Faịlimọn 13, 14 si egosi na ọ kwanyeere akọ na uche ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ùgwù? (1 Kọr. 8:7, 13; 10:31-33)

  4. Gụọ 2 Timoti 4:7-9.

    Dị ka Pọl onyeozi, olee otú anyị pụrụ isi nwee obi ike na Jehova ga-akwụghachi anyị ụgwọ ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ruo n’ọgwụgwụ? (Mat. 24:13; Hib. 6:10)

Akụkọ nke 114

Ngwụsị nke Ihe Ọjọọ Niile

  1. N’ihi gịnị ka Bible ji ekwu okwu banyere ịnyịnya ndị dị n’eluigwe?

  2. Gịnị bụ aha agha Chineke ga-alụso ndị ajọ mmadụ n’ụwa, gịnịkwa mere a ga-eji lụọ agha a?

  3. Dị ka foto a na-egosi, ònye ga-ebute ụzọ n’agha ahụ, n’ihi gịnị ka o ji kpuru okpueze, gịnịkwa ka mma agha ya na-anọchi anya ya?

  4. N’ileghachi anya azụ n’Akụkọ nke 10, nke 15, na nke 33, n’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị inwe ihe ijuanya na Chineke ga-ebibi ndị ajọ mmadụ?

  5. Olee otú Akụkọ nke 36 na nke 76 si egosi anyị na Chineke ga-ebibi ndị ajọ mmadụ n’agbanyeghị na ha na-azọrọ na ha na-efe ya?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Mkpughe 19:11-16.

    1. Olee otú Akwụkwọ Nsọ si mee ka o doo anya na Jizọs Kraịst bụ onye ahụ nọ n’elu ịnyịnya ọcha ahụ? (Mkpu. 1:5; 3:14; 19:11; Aịsa. 11:4)

    2. Olee otú ọbara e fesara n’uwe elu Jizọs si egosi na ọ ga-enwe mmeri zuru ezu? (Mkpu. 14:18-20; 19:13; Aịsa. 63:1-6)

    3. Ole ndị ka o yiri ka à gụnyere n’ụsụụ ndị agha so Jizọs ka ọ nọkwasịrị n’elu ịnyịnya ọcha ya? (Mkpu. 12:7; 19:14; Mat. 25:31, 32)

Akụkọ nke 115

Paradaịs Ọhụrụ n’Elu Ụwa

  1. Olee ọnọdụ ndị Bible na-egosi na anyị ga-anọ na ha n’ime Paradaịs elu ala?

  2. Gịnị ka Bible na-ekwe ndị ga-ebi na Paradaịs nkwa ya?

  3. Olee mgbe Jizọs ga-eweta mgbanwe a dị ebube?

  4. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, gịnị ka o mere iji gosi ihe ọ ga-eme dị ka Eze nke Alaeze Chineke?

  5. Gịnị ka Jizọs na ndị ha na ya ga-eso chịa n’eluigwe ga-ahụ na e nwere mgbe ha ga-anọ n’eluigwe na-achị ụwa?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Mkpughe 5:9, 10.

    N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nwee obi ike na ndị ga-achị ụwa n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri ahụ ga-abụ ndị eze na ndị nchụàjà nwere ọmịiko na obi ebere? (Efe. 4:20-24; 1 Pita 1:7; 3:8; 5:6-10)

  2. Gụọ Mkpughe 14:1-3.

    Gịnị ka odide e dere aha Nna ahụ na aha Nwa Atụrụ ahụ n’egedege ihu otu narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ na-egosi? (1 Kọr. 3:23; 2 Tim. 2:19; Mkpu. 3:12)

Akụkọ nke 116

Ụzọ Anyị Pụrụ Isi Dị Ndụ Ebighị Ebi

  1. Gịnị ka ọ dị mkpa ka anyị mara iji wee dị ndụ ebighị ebi?

  2. Olee otú anyị pụrụ isi mụta banyere Jehova Chineke na Jizọs, dị ka e gosiri n’ihe banyere nwatakịrị nwaanyị ahụ na ndị enyi ya bụ́ ndị ha na ya nọ na foto a?

  3. Olee akwụkwọ ọzọ ị na-ahụ na foto a, n’ihi gịnịkwa ka anyị ji kwesị ịdị na-agụ ya mgbe mgbe?

  4. E wezụga ịmụta banyere Jehova na Jizọs, olee ihe ọzọ a chọrọ iji nweta ndụ ebighị ebi?

  5. Olee ihe anyị na-amụta n’Akụkọ nke 69?

  6. Gịnị ka ezi ihe nlereanya nke obere nwa bụ́ Samuel nke dị n’Akụkọ nke 55 na-egosi?

  7. Olee otú anyị pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya Jizọs Kraịst, ọ bụrụkwa na anyị emee otú ahụ, olee ihe anyị ga-enwe ike ime n’ọdịnihu?

Ajụjụ ndị ọzọ:

  1. Gụọ Jọn 17:3.

    Olee otú Akwụkwọ Nsọ si egosi na inweta ihe ọmụma banyere Jehova Chineke na Jizọs Kraịst gụnyere ihe karịrị ibu ihe ndị bụ́ eziokwu n’isi? (Mat. 7:21; Jems 2:18-20; 1 Jọn 2:17)

  2. Gụọ Abụ Ọma 145:1-21.

    1. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ọtụtụ ihe ndị mere anyị ga-eji na-eto Jehova? (Ọma 145:8-11; Mkpu. 4:11)

    2. Olee otú Jehova si “dị mma n’ebe ihe niile e kere eke dị,” oleekwa otú nke a kwesịrị isi mee ka anyị bịarukwuo ya nso? (Ọma 145:9; Mat. 5:43-45)

    3. Ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova n’anya, olee ihe a ga-akpali anyị ime? (Ọma 119:171, 172, 175; 145:11, 12, 21)