Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Peji nke Abụọ

Peji nke Abụọ

Peji nke Abụọ

“ETOLITERE m n’otu obodo nta nke dị n’ógbè ebe ugwu,” ka Dauda na-akọ, bụ́ onye si Sierra Leone. “N’otu mgbe, mgbe m bụ nwa okoro nta, ezinụlọ m na otu ezinụlọ ọzọ na-azọ otu ibe ala. Ezinụlọ nke ọ bụla kwuru na ọ bụ ha nwe ala ahụ. Iji dozie okwu ahụ, a kpọrọ otu onye dibia. O nyere otu nwoke ọzọ enyo, wee jiri ákwà ọcha kpuchie nwoke ahụ. N’oge na-adịghị anya nwoke ahụ e kpuchiri ákwà malitere ịma jijiji, ọsụsọ na-agbakwa ya. Ka o lebara anya n’enyo ahụ, o tiri mkpu, sị: ‘Ana m ahụ otu agadi nwoke ka ọ na-abịa nso! O yi uwe mwụda dị ọcha. O toro ogologo, meekwa agadi, ọ gbara isi awọ́, ọ na-ehulatatụkwa ala mgbe ọ na-aga ije.’

“Ọ bụ Nna m ochie ka ọ na-akọwa! Mgbe ahụ ọ malitere ịma jijiji nke ukwuu wee tie mkpu, sị: ‘Ọ bụrụ na unu ekwenyeghị ihe m na-ekwu, bịanụ hụrụ n’onwe unu!’ N’eziokwu, o nweghị onye ọ bụla n’ime anyị obi siri ike ime otú ahụ! Onye dibia ahụ mere ka ahụ dajụlata ya site n’ifesa ya ngwakọta ọgwụ e ji ahịhịa na mmiri mee, bụ́ nke o bu n’ime otu ebele.

“N’ikwu okwu site n’ọnụ nwoke ahụ ji enyo, ‘Nna m ochie’ kwuru na ala ahụ bụ nke ezinụlọ anyị. Ọ gwara nne m ochie ka o jee rụọ ọrụ n’ala ahụ n’atụghị ụjọ ọ bụla. Ezinụlọ nke ọzọ ahụ nakweere mkpebi ahụ. E doziri esemokwu ahụ.”

Ahụmahụ ndị yiri nke ahụ jupụtara ebe nile n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa. N’ebe a, dị ka ọ dị n’akụkụ ụwa ndị ọzọ, ọtụtụ nde mmadụ kwenyere na ndị nwụrụ anwụ na-agabiga banye n’ụwa nke ndị bụ mmụọ, ebe ha nwere ike ịnọ hụ, nweekwa mmetụta ná ndụ ndị nọ n’elu ala. Nkwenkwe nke a ọ̀ bụ eziokwu? Ndị nwụrụ anwụ hà dị ndụ n’ezie? Ma ọ bụghị otú ahụ, òle ndị bụ ndị ahụ na-ekwu na ha bụ mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ? Ịmata azịza ziri ezi nye ajụjụ ndị a dị oké mkpa. Ọ bụ okwu metụtara ọnwụ na ndụ.